NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
Gịnị Mere M Ji Ekwukarị Ihe M Na-emecha Kwaara Mmakwaara?
“Mgbe ụfọdụ, m na-achịkwa ire m, ma n’oge ndị ọzọ, ọ na-adị m ka m̀ na-ekwu okwu n’echeghị echiche.”—James.
“Mgbe ọ bụla ahụ́ na-erughị m ala, m na-ekwu okwu n’echeghị echiche, ma mgbe ahụ́ ruru m ala, m na-ekwu oké okwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na m na-emenye onwe m ihere mgbe niile.”—Marie.
Baịbụl kwuru, sị: “Ire bụ ọkụ.” O kwukwara na ọ na-ewe ‘ntakịrị ọkụ iji suo oké ọhịa ọkụ.’ (Jems 3:5, 6) Ihe i na-ekwu, ọ̀ na-etinyekarị gị ná nsogbu? Ọ bụrụ otú ahụ, isiokwu a nwere ike inyere gị aka.
Gịnị mere m ji ekwukarị ihe m na-emecha kwaara mmakwaara?
Ezughị okè. Baịbụl kwuru, sị: “Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro. Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, ọ bụ onye zuru okè.” (Jems 3:2) Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị na-asụ ngọngọ mgbe anyị na-eje ije, na-ekwukwa ihe anyị na-emecha kwaara mmakwaara.
“Ebe ọ bụ na ụbụrụ m na ire m ezughị okè, ikwu na m na-achịkwa ha mgbe niile bụ ịghọ onwe m aghụghọ.”—Anna.
Ikwu ọtụtụ okwu. Baịbụl sịrị: “N’ọtụtụ okwu, mmehie anaghị ahapụ ịdị.” (Ilu 10:19) Ndị na-ekwukarị ọtụtụ okwu ma ọ bụ oké okwu ma ghara ige ndị ọzọ ntị nke ọma, na-akpasukarị ndị ọzọ iwe. Ọ na-eme ka ha kwuo ihe ha na-emecha kwaara mmakwaara.
“Ndị kacha mara ihe anaghị ekwu ọtụtụ okwu. Jizọs kacha mmadụ ọ bụla dịrịla ndụ n’ụwa a mara ihe, ma e nwere oge ndị ọ gbachiri nkịtị.”—Julia.
Okwu mkparị. Baịbụl kwuru, sị: “E nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ.” (Ilu 12:18) Ikwu okwu mkparị bụ otu ụzọ ndị mmadụ si ekwu okwu n’echeghị echiche. Ha na-ekwu ya iji mee ka obi gbawaa mmadụ na iji menye onye ahụ ihere. Ndị na-ekwu okwu mkparị nwere ike ikwu, sị, “Ọọ egwuregwu ka m na-egwu!” Ma imenye ndị ọzọ ihere abụghị ihe e kwesịrị iji egwu egwu. Ma Baịbụl gwara anyị ka anyị wepụ ‘okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti anyị.’—Ndị Efesọs 4:31.
“M na-ekwukarị ihe na-atọ ọchị. Ọ na-eme ka m na-akparị ndị ọzọ. Nke a na-etinyekarị m ná nsogbu.”—Oksana.
Na-achịkwa ire gị
Ịmụta otú ị ga-esi na-achịkwa ire gị anaghị adị mfe, ma ihe Baịbụl kwuru nwere ike inyere gị aka. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ndị na-esonụ.
“Kwuonụ ihe unu chọrọ ikwu n’ime obi unu, . . . ma gba nkịtị.”—Abụ Ọma 4:4.
Mgbe ụfọdụ, ihe kacha mma ị ga-eme bụ ịgba nkịtị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Laura kwuru sị, “Otú obi na-adị m mgbe iwe na-ewe m nwere ike ịdị iche n’otú obi ga-adị m ma iwe ahụ dajụọ. Mgbe iwe ahụ dajụrụ, obi na-atọkarị m ụtọ na ekwughị m ihe m chọburu ikwu.” Ịgbachidị nkịtị naanị tịnkọm tịnkọm ole na ole nwere ike ime ka ị ghara ikwu ihe ị ga-emecha kwaara mmakwaara.
“Ntị ọ́ dịghị anwale okwu dị ka okpo ọnụ si anụ ụtọ ihe oriri?”—Job 12:11.
I nwere ike ịgbara nsogbu ọsọ ma i jiri ajụjụ ndị na-esonu chebara ihe ị chọrọ ikwu echiche:
Ihe a m chọrọ ikwu ò mere eme? Ọ̀ bụ okwu ọma? Ọ̀ dị mkpa ikwu ya?—Ndị Rom 14:19.
Olee otú obi ga-adị m ma mmadụ gwaa m ụdị ihe ahụ?—Matiu 7:12.
Ọ̀ ga-egosi na m na-akwanyere otú onye ọzọ si ele ihe anya ùgwù?—Ndị Rom 12:10.
Ọ̀ bụ ugbu a ka m kwesịrị ikwu ya?—Ekliziastis 3:7.
“N’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.”—Ndị Filipaị 2:3.
Ihe a Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ịna-echebara ndị ọzọ echiche. Ime otú ahụ ga-eme ka ị na-achịkwa ire gị ma na-eche echiche tupu i kwuo okwu. Ọ bụrụgodị na i gwala mmadụ okwu gbawara ya obi, ịdị umeala n’obi ga-eme ka ị rịọ onye ahụ mgbaghara ozugbo. (Matiu 5:23, 24) Kpebisikwuo ike na ị ga na-achịkwa ire gị.