Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Otú M Ga-esi Agwa Ndị Mụrụ M Okwu Gbasara Iwu Ndị Ha Nyere M?

Olee Otú M Ga-esi Agwa Ndị Mụrụ M Okwu Gbasara Iwu Ndị Ha Nyere M?

 “Mgbe m dị afọ iri na ise, m na-erubere iwu ndị mụrụ m nyere m isi, ma ugbu a m dị afọ iri na itoolu, m chere na m kwesịrị inwekwuru onwe m.”—Sylvia.

 Ọ̀ dị gị otú ahụ ọ dị Sylvia? Ọ bụrụ otú ahụ, isiokwu a ga-enyere gị aka ka gị na ndị mụrụ gị kwuo gbasara ya.

 Ihe i kwesịrị ịma

 Tupu gị agwa ndị mụrụ gị gbasara iwu ndị ha nyere gị, tụlee ihe ndị na-esonụ:

  •  Ezigbo nsogbu ga-adị n’ụwa a ma a hapụ onye ọ bụla ka o mere otú masịrị ya. Chegodị otú ihe ga-adị n’okporo ụzọ awara awara nke na-enweghị iwu ọ bụla na-eduzi ndị ọkwọ ụgbọala, onye ọ bụla ana-agba otú masịrị ya. Otú ahụ iwu okporo ụzọ si eduzi ndị ọkwọ ụgbọala ka iwu ndị nne na nna mere si eme ka ihe na-aga nke ọma n’ụlọ ha.

  •  Iwu ndị mụrụ gị nyere gị na-egosi na ha hụrụ gị n’anya. Ọ bụrụ na ha enyeghị gị iwu ọ bụla, o nwere ike ịbụ na ha achọghị ịma ihe ga-eme gị. O gosiri na ha abụghị ezigbo nne na nna.

 Ị̀ MAARA? Ndị nne na nna nwekwara iwu ha na-erube isi na ya. Ọ bụrụ na ị maghị, gụọ Jenesis 2:24; Diuterọnọmi 6:6, 7; Ndị Efesọs 6:4; na 1 Timoti 5:8.

 Ma, olee ihe i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ị ka chere na iwu ndị mụrụ gị nyere gị adịghị gị mma?

 Ihe i nwere ike ime

 Tupu gị na ndị mụrụ gị ekwurịta gbasara iwu ndị ha nyere gị, chebara ihe ndị na-esonụ echiche. Ị̀ na-erubekarị isi n’iwu ndị mụrụ gị nyere gị? Ọ bụrụ na ị naghị erubekarị isi n’iwu ndị ha nyere gị, o nwere ike ịbụ na ugbu a abụghị oge i kwesịrị iji gwa ha ka ha mee ka i nwerekwuo onwe gị. N’ihi ya, gụọ isiokwu bụ́, “Olee Ihe M Ga-eme Ka Ndị Mụrụ M Na-atụkwasị M Obi?

 Ọ bụrụ na ị na-erubekarị isi n’iwu ndị mụrụ gị nyere gị, kwadebe ihe ị ga-achọ ịgwa ha. Tupu gị na ha ekwurịta ya, chebara ihe ị ga-achọ ịgwa ha echiche. I nwekwara ike ide ya ede. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ịmata ma ihe ị chọrọ ka ha meere gị ò kwesịrị ekwesị. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịgwa ndị mụrụ gị ka ha kwuo oge na ebe unu ga-anọ kwurịta okwu ahụ́ eruo unu ala. Buru ihe ndị na-esonụ n’obi mgbe gị na ha na-ekwurịta okwu:

 Kwanyere ha ùgwù. Baịbụl kwuru, sị: “Okwu ọjọọ na-akpasu iwe.” (Ilu 15:1) N’ihi ya, buru ihe a n’uche: Ọ bụrụ na gị arụwa ndị mụrụ gị ụka ma ọ bụ kwuwe na iwu ndị ha nyere gị adịghị mma, mkparịta ụka unu agaghị aga nke ọma.

 “Ka m na-akwanyekwuru ndị mụrụ m ùgwù, ka ha na-akwanyekwuru m ùgwù. Ọ bụrụ na anyị ana-akwanyere ibe anyị ùgwù, ọ ga-adịkwuru anyị mfe inwe otu olu.”—Bianca, ọ dị afọ iri na itoolu.

 Gee ha ntị nke ọma. Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘bụrụ ndị na-anụ ihe ngwa ngwa, ndị na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.’ (Jems 1:19) Cheta na ọ bụ ndị mụrụ gị ka gị na ha na-ekwurịta okwu. Ọ pụtara na i kwesịkwara ige ha ntị, ọ bụghị naanị ịgwa ha okwu.

 “Ka anyị na-eto, anyị nwere ike ịna-eche na anyị ma ihe karịa ndị mụrụ anyị, ma ọ bụghị eziokwu. Anyị kwesịrị ịna-eme ihe ndị ha gwara anyị.”—Devan, ọ dị afọ iri abụọ.

 Chebakwara ndị mụrụ gị echiche. Gbalịa ghọta ihe ndị mụrụ gị kwuru mere ha ji nye gị iwu ndị ahụ. Mee ihe a Baịbụl kwuru. O kwuru, sị: “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.” N’ihi ya, lekwasị anya n’ọdịmma ndị mụrụ gị.—Ndị Filipaị 2:4.

Olee nke n’ime ụzọ abụọ a i chere ga-eme ka ndị mụrụ gị nyekwuo gị ohere ime ihe ụfọdụ?

 “M na-echebu na ndị mụrụ m kpọrọ m asị, nakwa na ha anaghị akwado m. Ma, emechaala m ghọta na ha na-agbalị ka ha bụrụ ezigbo nne na nna, otú mụnwa na-agba mbọ ịghọ dimkpa. Iwu ọ bụla ha nyere m bụ maka na ha hụrụ m n’anya.”—Joshua, ọ dị afọ iri abụọ na otu.

 Kwuo ihe ọzọ i nwere ike ime. Ka e were ya na e nwere otu oriri na nkwari ị chọrọ ịga. Ma ọ ga-ewe gị otu awa iji rute ebe a ga-anọ enwe ya. Gị agwa ya ndị mụrụ gị, ha ajụ. Chọpụta ihe mere ha ji jụ. Ihe mere ha ji jụ, ọ̀ bụ n’ihi na ebe a ga-anọ enwe ya dị anya, ka ọ̀ bụ oriri na nkwari ahụ?

  •   Ọ bụrụ na ihe mere ha ji jụ bụ n’ihi na ha achọghị ka ị nyaa ụgbọala, hà ga-ekwe ka ị gaa ma ị gwa ha ka gị na onye bụ́ aka ochie n’ịnya ụgbọala soro?

  •   Ọ bụrụ na ihe mere ha ji jụ bụ n’ihi oriri na nkwari ahụ, hà ga-ekwe gị gaa ma ị gwa ha ndị ga-abịa ya na onye ga-ahazi ya?

 Cheta na i kwesịrị ịkwanyere ndị mụrụ gị ùgwù mgbe ị na-agwa ha okwu ma jiri ndidi gee ntị n’ihe ha na-agwa gị. Gosi na ị ‘na-asọpụrụ nna gị na nne gị’ ma n’ihe ị na-ekwu ma n’àgwà gị. (Ndị Efesọs 6:2, 3) Hà ga-agbanwenụ obi ha? Ha nwere ike ịgbanwe obi ha ma ọ bụ ghara ịgbanwe ya. Nke ọ bụla ọ bụ, megodị ihe ndị na-esonụ . . .

 Jiri obi gị niile kweta ime ihe ndị mụrụ gị kwuru. Ụfọdụ ndị na-eto eto amaghị na iji obi ha niile kweta ime ihe ndị mụrụ ha kwuru ga-eme ka ha nyekwuo ha ohere ime ihe ha chọrọ. Ọ bụrụ na gị na ha arụwa ụka n’ihi na ha ekweghị eme ihe ị gwara ha, mgbe ọzọ gị na ha ga-ekwurịta okwu, ọ ga-esikwuru ha ike ikwe ka i nwerekwuo onwe gị. Ma ọ bụrụ na i jiri obi gị niile kweta ime ihe ndị mụrụ gị kwuru, ha nwere ike ikwe ka i nwerekwuo onwe gị.