Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka?​—Nke 2: Mee Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọ Gị Ụtọ

Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka?​—Nke 2: Mee Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọ Gị Ụtọ

 Otu nwa okorobịa aha ya bụ Will kwuru, sị: “Ịgụ Baịbụl nwere ike ịna-agwụ gị ike ma ọ bụrụ na ị maghị otú dị mma ị ga-esi na-agụ ya.”

 Ị̀ ga-achọ ịmata otú ị ga-esi na-agụ Baịbụl, ya ana-atọ gị ụtọ? Isiokwu a ga-enyere gị aka ịmata ya.

 Na-agụ Baịbụl otú ọ ga na-atọ gị ụtọ

 Ị gụwa Baịbụl, mee ka ọ dị gị ka ị̀ nọ mgbe ihe ị na-agụ na-eme. I nwere ike ịna-eme ihe ndị a na-esonụ:

  1.   Họrọ akụkọ Baịbụl ị ga-achọ ịmụ banyere ya. I nwere ike ikpebi ịgụ otu akụkọ a kọrọ na Baịbụl, ma ọ bụ gị ahọrọ ịgụ otu ebe kọrọ banyere ozi Jizọs, ma ọ bụkwanụ gị ahọrọ ịgụ ebe e si nweta akụkọ Baịbụl a na-egere egere ndị dị na jw.org.

  2.   Gụọ ebe ahụ ị họọrọ. I nwere ike ịna-agụrụ ya onwe gị, ma ọ bụ gị ana-agụpụta ya agụpụta ma gị na ndị enyi gị, ma ọ bụkwanụ ndị ezinụlọ unu nọrọ. Unu nwere ike na-eme, otu onye na-agụpụta akụkọ ahụ, o ruo ebe onye ọzọ kwuru okwu n’akụkọ ahụ, onye ọzọ agụpụta ya.

  3.   Mee otu ma ọ bụ karịa n’ihe ndị a na-esonụ:

    •   Lee ma ị̀ ga-eseli ihe ndị ị mụtara ese. Ma ọ bụkwanụ gị esee ihe na-egosi oge ihe ndị ị gụrụ banyere ha mere. I sechaa ha, gị edee ihe na-eme na nke ọ bụla.

    •   Ị gụọ banyere onye ji obi ya niile fee Chineke, depụta àgwà ọma ndị onye ahụ kpara, ihe ndị o mere, na ụzọ ndị e si gọzie ya.

    •   Kọọ ihe ị gụrụ banyere ya ka akụkọ. Si n’ụzọ dị iche iche kọọ ya, gbaakwa mmadụ ajụjụ ọnụ. N’ajụjụ ọnụ ahụ, mee ka e nwee ndị ga-eme ka ndị a kọrọ akukọ ha nakwa ndị hụrụ ihe merenụ n’akụkọ ahụ ị gụrụ.

    •   Ọ bụrụ na o nwere onye mere ihe na-adịghị mma ị gụrụ gbasara ya, chee banyere ihe dị mma onye ahụ gaara eme. Dị ka ihe atụ, gụọ banyere otú Pita si gọnahụ Jizọs. (Mak 14:​66-72) Gịnị ka Pita gaara eme banyere ọnwụnwa ahụ bịaara ya?

    •   Ọ bụrụ na ị ma otú e si ede ihe nkiri, gbaa mbọ dee ihe nkiri nke i si n’otu akụkọ dị na Baịbụl nweta. Deekwa ihe ndị e nwere ike ịmụta n’akụkọ ahụ.​—Ndị Rom 15:4.

      Ị ga-agụli Baịbụl otú ọ ga na-atọ gị ụtọ

 Chọpụtakwuo ihe ụfọdụ

 Ọ bụrụ na ị jụkwuo onwe gị ajụjụ banyere ihe ị gụrụ, ị ga-amụtakwu ihe n’akụkọ ahụ. Mgbe ụfọdụ, otu mkpụrụ okwu ma ọ bụ abụọ dị n’ebe ị gụrụ nwere ike inyere gị aka ịmụtakwu ihe na ya.

 Dị ka ihe atụ, i nwere ike gụọ ihe dị na Matiu 28:7 ma jiri ya tụnyere ihe dị na Mak 16:7.

  •    Gịnị mere Mak ji dee na ndị na-eso ụzọ Jizọs “nakwa Pita” ga-ahụ Jizọs?

  •  Ihe ga-enyere gị aka: Mak ahụghị mgbe ihe ahụ mere. O yiri ka ọ̀ bụ Pita kọọrọ ya banyere ya.

  •  Ihe ndị e nwere ike ịmụtakwu n’amaokwu ahụ: Gịnị mere obi ga-eji sie Pita ike mgbe ọ nụrụ na Jizọs chọrọ ịhụ ya? (Mak 14:​66-​72) Olee otú Jizọs si gosi na ọ bụ ezigbo enyi Pita? Olee otú i nwere ike isi bụrụ ezigbo enyi, ka Jizọs?

 Ọ bụrụ na i were ya ka ị̀ nọ ya mgbe ihe ị na-agụ na Baịbụl mere, gbalịakwa na-achọpụtakwu ihe ndị mere n’akụkọ ị gụrụ, ọ ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọkwu gị ụtọ.