Anyị Na-akpọ Gị Ka Ị Bịa
Mgbakọ Ukwu Ndịàmà Jehova nke Afọ 2026
Obi Ụtọ Ebighị Ebi
Ị gaghị akwụ ụgwọ iji bata • A gaghịkwa ana gị ego
Ihe Ụfọdụ A Ga-eme
Fraịdee: Ị ga-amụta ihe Baịbụl kwuru gosiri na Chineke na Ọkpara ya bụ́ Jizọs chọrọ ka ị na-enwe obi ụtọ.
Satọdee: Anyị ga-eleba anya n’ihe Jizọs nọ n’elu ugwu kụzie. Ị ga-esi na ha mụta otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.
Sọnde: A ga-ekwu okwu isiokwu ya bụ “Ị̀ Chọtala Akụ̀ Ahụ Dị Oké Ọnụ?” N’okwu a, ị ga-amụta otú eziokwu ndị dị na Baịbụl si mee ka ọtụtụ nde mmadụ na-enwekwu obi ụtọ.
Ihe Nkiri
Ozi Ọma Jizọs Kwusara: Nke 4 ruo Nke 6
Anyị ga-ahụ otú Jizọs si kụziere ìgwè mmadụ ihe, gwọọ ndị ọrịa, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. N’ụbọchị nke ọ bụla, anyị ga-ele otu n’ime ọmarịcha vidio ndị a so na vidio Ozi Ọma Jizọs Kwusara. Ha ga-atọ anyị ụtọ ma gbaa anyị ume.
Gaa na jw.org/ig ka ị hụ akwụkwọ e dere ihe niile a ga-eme ná mgbakọ ukwu a ma lee vidio ndị a:
Gịnị Ka Anyị Na-eme ná Mgbakọ Ukwu Anyị?
Chọpụta ihe ị ga-ahụ ná mgbakọ ukwu Ndịàmà Jehova.
Lee ihe ụfọdụ anyị ga-amụta ná mgbakọ ukwu nke afọ a.
Olee otú Jizọs si jiri onyinye o nwere nyere ndị ọzọ aka?
Lee vidio ndị e lere ná mgbakọ ukwu ndị gara aga.

