Gaa n'Isiokwu

E Si n’Otu Onye A Na-amụrụ Baịbụl Mụwaziere Ọtụtụ Ndị Baịbụl

E Si n’Otu Onye A Na-amụrụ Baịbụl Mụwaziere Ọtụtụ Ndị Baịbụl

 Otu Onyeàmà Jehova bi na Gụatemala, aha ya bụ Marta, na-amụ asụsụ Kekchi ka o nwee ike iji ya na-ezi ndị na-asụ asụsụ ahụ ozi ọma si na Baịbụl. Otu ụbọchị, ọ hụrụ ka otu nwoke si n’ụlọ ọgwụ na-apụta. Mgbe Marta hụrụ ejiji ya, o kwuru n’obi ya na ọ ga-abụrịrị na nwoke a si n’otu obere obodo ndị Kekchi, nke dị n’ebe ugwu. Ndịàmà Jehova anaghị agakarịkwa ozi ọma n’ebe ahụ. Ọ gakwuuru nwoke ahụ ma sụọrọ ya obere Kekchi ọ mụtara.

 Marta gwara nwoke ahụ na ya chọrọ ịna-amụrụ ya Baịbụl. Nwoke ahụ ji obi ụtọ kweta ma gwazie ya na ya enweghị ego ya ga-akwụ ya. Marta kọwaara nwoke ahụ na Ndịàmà Jehova anaghị ana ndị mmadụ ego ma ha mụwara ha Baịbụl. Ọ gwara ya na ha ga-eji ekwentị na-amụ Baịbụl, gwakwa ya na ndị ezinụlọ ya nwere ike isonye n’ọmụmụ ihe ahụ. Nwoke ahụ kwetara. Ebe ọ bụ na nwoke ahụ maara asụ asụsụ Spanish na edekwa ya ede, Marta nyere ya Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke e dere n’asụsụ Spanish. O nyekwara ya akwụkwọ e ji amụ Baịbụl bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? n’asụsụ Kekchi. N’izu na-esonụ, Marta bidoro iji ekwentị na-amụrụ nwoke ahụ, nwunye ya na ụmụ ya abụọ Baịbụl. Ha na-amụ ihe ugboro abụọ n’izu. Marta sịrị: “Ebe ọ bụ na amachaghị m asụ asụsụ Kekchi, anyị na-eji asụsụ Spanish amụ ihe, nwoke ahụ ana-akọwara nwunye ya ihe anyị kwuru n’asụsụ Kekchi. Ụmụ ya na-aghọta asụsụ Spanish.”

 Nwoke a bụ pastọ na chọọchị ya. O bidoziri ịkụziri ndị chọọchị ya ihe ọ na-amụta na Baịbụl. Ihe ndị ahụ ọ na-akụziri ndị chọọchị ya tọrọ ha ụtọ, ha ajụọ ya ebe o si na-amụta ihe ọhụrụ ndị a. Mgbe ọ gwara ha na ya na-amụ Baịbụl, ha bidoro bịawa otu otu na-esonyere ya n’ọmụmụ ihe ahụ. Tupu ị mara ihe na-emenụ, ihe dị ka mmadụ iri na ise na-agbakọtazi n’izu ọ bụla na-esonyere ha ka Marta ji ekwentị na-amụrụ ha ihe. Ha mechadịrị were maịkrofon dowe n’akụkụ ekwentị ahụ ka onye ọ bụla nwee ike ịna-anụ ihe a na-ekwu.

 Mgbe Marta gwara ndị okenye ọgbakọ ha banyere ọmụmụ Baịbụl ahụ, otu onye n’ime ha gara obodo ebe ndị ahụ a na-amụrụ ihe bi. Ọ gwara ha ka ha bịa gere okwu si na Baịbụl onye nlekọta sekit a ga-ekwu n’otu obodo a ga-eji ụgbọala gbaa otu awa, ma jirizie ụkwụ gaa awa abụọ tupu e ruo ya. Ndị ahụ a na-amụrụ ihe kwetara na ha ga-abịa, mmadụ iri na asaa n’ime ha bịakwara.

 Ka izu ole na ole gachara, onye nlekọta sekit ahụ na ụfọdụ ụmụnna gara obodo ahụ nọọ ụbọchị anọ. N’ụtụtụ ọ bụla, ha na-egosi ndị ahụ vidio anyị dị iche iche dị na jw.org n’asụsụ Kekchi, mụọkwa broshọ bụ́ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? N’ehihie, ha na-ekiri ihe ụfọdụ dị n’Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova. Onye nlekọta sekit ahụ hazikwara ka onye nke ọ bụla n’ime ndị ahụ na-amụ Baịbụl nwee onye ya na ya na-amụ Baịbụl.

 N’ime ụbọchị anọ ahụ ha nọrọ ebe ahụ, ụmụnna ahụ zikwara ozi ọma n’obodo ndị ọzọ nọ gburugburu, ebe a na-asụkwa asụsụ Kekchi. Ha kpọkwara ndị mmadụ òkù ka ha bịa otu nnọkọ pụrụ iche a ga-enwe. Ná nnọkọ ahụ, ụmụnna ndị ahụ gwara mmadụ iri anọ na asaa bịaranụ na ọ ga-adị mma ma ha nwee ndị na-amụrụ ha Baịbụl. Ezinụlọ iri na otu kwetara ka a bịa mụwara ha Baịbụl.

 Ka ọnwa ole na ole gara, ndị okenye haziri ka a na-enwe ọmụmụ ihe ná ngwụcha izu ọ bụla n’obodo nke mbụ ahụ e bidoro mụwara ndị mmadụ ihe na ya. Taa, ihe dị ka mmadụ iri anọ na-abịachi ọmụmụ ihe anya. Mgbe e mekwara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ebe ahụ, mmadụ iri itoolu na otu bịara ya.

 Mgbe Marta chetara otu ihe a niile si bido ma rụpụta ihe dị mma, ọ sịrị: “Ana m ekele Jehova. Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m ka o nweghị ezigbo ihe m na-eme. Ma Chineke nwere ike iji anyị nyere ndị ọzọ aka. Ọ maara obi ndị bi n’obodo ndị ahụ, ya adọtazie ha n’ebe ndị nke ya nọ. Jehova hụrụ ha n’anya.”

a Onye nlekọta sekit bụ onye ozi Chineke n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Ọ na-aga eleta ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị iche iche. A na-enwe ihe dị ka ọgbakọ iri abụọ n’otu sekit.