Gaa n'Isiokwu

Nnukwu Mmiri Ozuzo nke Wetara Ozi Ọma

Nnukwu Mmiri Ozuzo nke Wetara Ozi Ọma

 N’afọ 2017, Ndịàmà Jehova iri na abụọ ji ụgbọ mmiri si n’ebe a na-akpọ Mọskito ma ọ bụ Miskito, nke bụ́ obodo dị n’ụsọ osimiri ná mba Nikaragụa, kwọpụ ije. Aha ụgbọ mmiri ha bụ Sturi Yamni. Otu nwanna nwoke aha ya bụ Stephen so gaa, sịrị: “Ihe mere anyị ji gawa bụ ka anyị gbaa ụmụnna anyị dị ole na ole bi n’otu ime obodo dịpụrụ adịpụ ume. Ihe ọzọkwa bụ ka anyị nyere ha aka kwusaa ozi ọma n’ókèala ha nke buru nnọọ ibu.”

 Ndịàmà Jehova iri na abụọ ahụ si n’ebe a na-akpọ Pel Lagun palie njem ụgbọ mmiri ga-adị narị kilomita abụọ n’osimiri Río Grande de Matagalpa. Ha amaghịdị na aha ụgbọ mmiri ha, nke pụtara “Ozi Ọma” n’asụsụ Miskito, ga-emecha nwee ihe pụrụ iche ọ ga na-echetara ndị bi n’ụsọ osimiri ahụ. Mgbe ha ji ụgbọ mmiri ha gaa ihe ruru awa iri na abụọ, ma ọ bụrụ na a gụnyeghị ebe ha kwụsịrị hie ụra abalị, ha ruru ebe ha na-aga. Ebe ahụ bụ obodo La Cruz de Río Grande. Ndịàmà Jehova isii bi ebe ahụ ji nnọọ obi ụtọ nabata ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwaanyị ahụ bịara ileta ha.

 N’abalị ụbọchị ahụ njinji jiri. Nnukwu mmiri ozuzo mere ka isi mmiri Río Grande de Matagalpa tojuo. N’ime awa ole na ole, osimiri ahụ tojuru gafee ikpere mmiri ya ma na-etojukwa ruo ụbọchị abụọ. Mmiri tojuru Ụlọ Nzukọ Alaeze na ọtụtụ ụlọ ndị ọzọ dị n’obodo La Cruz. Ụmụnna ndị ahụ bịara abịa nyeere ndị obodo aka ka ha gbapụta n’ụlọ ha dị iche iche. Ọtụtụ n’ime ha rahụrụ abalị abụọ n’ụlọ elu nwere okpukpu abụọ otu nwanna nwoke nwe.

Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na La Cruz mmiri tojuru

 N’ụbọchị nke atọ, onyeisi obodo La Cruz gakwuuru ụmụnna ndị ahụ bịara abịa ma rịọ enyemaka ha. Ebe ọ bụ naanị ụgbọ mmiri ahụ ụmụnna ahụ ji bịa, bụ́ Sturi Yamni, bụ ụgbọ mmiri siri ike nke e nwere ike iji gaa ebe ọ bụla, onyeisi obodo ahụ rịọrọ ụmụnna ahụ ka ha jiri ụgbọ mmiri ha buga ndị ọrụ bịara ịgbata ọsọ enyemaka n’obodo ndị ọzọ dị n’ụsọ osimiri ahụ ọdachi ahụ metụtakwara. Ụmụnna ahụ ji obi ụtọ kweta ịga.

 N’ụtụtụ echi ya, ụmụnna atọ nakwa ndị ahụ bịara ịgbata ọsọ enyemaka so gawa ebe ndị ahụ. Nwanna Stephen kọziri ihe merenụ. Ọ sịrị: “Ugbu a osimiri ahụ na-achịzi ọkụ. Nnukwu osisi ndị ikuku kwaturu na-esegharị n’elu mmiri, mmiri ahụ na-asọsikwa nnọọ ike.” N’agbanyeghị ihe isi ike a niile, ụgbọ mmiri ahụ ruru obere obodo atọ ndị dị n’ụsọ osimiri ahụ.

 Ụmụnna atọ ahụ ji ohere ahụ kasie ndị obodo ahụ obi, nke bụ́kwanụ ihe ha chọrọ. Ha nyekwara ha Teta! ahụ e bipụtara n’afọ 2017 nke isiokwu ya bụ “Ọdachi Mee, Olee Ihe Ndị Nwere Ike Ịzọ Anyị Ndụ?

 Ndị bi n’obodo ndị ahụ dị n’ikpere mmiri kelere nnọọ ụmụnna ndị ahụ maka otú ha si nyere ha aka ma jirikwa Baịbụl kasie ha obi. Ụfọdụ ndị obodo ahụ sịrị: “Ha dị nnọọ njikere inye aka mgbe ihe siri ike.” Ụfọdụ ndị ọzọ sịrị: “Ha hụrụ nnọọ ndị agbata obi ha n’anya n’eziokwu.” Mgbe ndị obodo ndị ahụ hụrụ otú ụmụnna anyị ndị a si nyere Ndịàmà Jehova ibe ha aka ma nyerekwa ndị ọzọ aka, ọtụtụ n’ime ha bidoziri ige ụmụnna anyị ntị ma ha ziwe ha ozi nkasi obi si na Baịbụl.

Mgbe Nwanna Marco, onye so n’ụgbọ mmiri ahụ si n’ụgbọ mmiri ahụ bụ́ Sturi Yamni pụta ka ọ gaa kwusaara ndị obodo ozi ọma

Ebe a dọbara Sturi Yamni n’ebe a na-adọba ụgbọ mmiri n’otu obodo mmiri tojuru