Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“M Malitere Ichesi Echiche Ike Ma Ò nwere Uru Ndụ M Na-ebi Baara M”

“M Malitere Ichesi Echiche Ike Ma Ò nwere Uru Ndụ M Na-ebi Baara M”
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1941

  • ABỤ M ONYE: ỌSTRELIA

  • NDỤ M BIRI: ANA M ESE SỊGA, NA-AṄỤ OKÉ MMANYA

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

M toro n’obere obodo a na-akpọ Warialda nke dị na Niu Saụt Wels. A na-arụ ọrụ ugbo n’obodo a, na-azụkwa anụmanụ na ya. E nwere ndị na-azụ atụrụ na ehi, nweekwa ndị na-akụ mkpụrụ dị iche iche. Obodo Warialda na-adị ọcha, ndị ọjọọ nọ na ya dị ole na ole.

Abụ m nwa mbụ n’ime ụmụ iri nne na nna m mụrụ. Mgbe m dị afọ iri na atọ, m malitere ịrụ ọrụ ka m nwee ike inyere ezinụlọ anyị aka. Ebe ọ bụ na agachaghị m akwụkwọ, m nwetara ọrụ n’ebe a na-azụ anụ n’ugbo. Mgbe m dị afọ iri na ise, m malitere ịzụ ịnyịnya.

Ọrụ m na-arụ n’ebe ahụ baara m uru, ma ọ kpatakwaara m nsogbu. Ọrụ ahụ na-atọ m ụtọ. Ihe ọzọkwa bụ na otú ebe m na-azụ ịnyịnya si maa mma na-eme m obi ụtọ. M na-akwanye ọkụ n’abalị, nọrọ n’akụkụ ya na-ekiri ọnwa na kpakpando ndị dị na mbara ígwè, ifufe ana-efesa m, na-emekwa ka ebe niile na-esi ísì ọma. M chetara ihe na-agbata m n’obi mgbe ahụ, ya bụ, na e nwere Onye kere ihe niile ahụ mara mma m na-ekiri. Ma, ọrụ ahụ m na-arụ mere ka m mụta àgwà ọjọọ. M na-anụkarị ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha iyi. Ebe ahụ m na-arụ ọrụ mere ka m na-enweta sịga mgbe ọ bụla m chọrọ ya. Obere oge, ịṅụ sịga na ịkpọ ndị ọzọ iyi riri m ahụ́.

Mgbe m dị afọ iri na asatọ, m kwagara obodo Sidni. M gbara mbọ ka e were m n’ọrụ agha, ma e kweghị ewe m n’ihi na agachaghị m akwụkwọ. M nwetara ọrụ na Sidni ma nọọ ebe ahụ otu afọ. Ọ bụ n’oge ahụ ka mụ na Ndịàmà Jehova hụrụ. Ha gwara m ka m bịa ọmụmụ ihe ha, mụ ekwere. Mgbe m gara, achọpụtara m ozugbo na ihe ha na-akụzi bụ eziokwu.

Ma obere oge ihe a mechara, m bidoghachiri ịzụ ịnyịnya. M mechara kwaga n’obodo a na-akpọ Gundiwindi, nke dị na Kwinsland. M nwetara ọrụ ma nọrọ ebe ahụ lụọ nwaanyị. Ma, m maliteziri ịṅụ oké mmanya.

 Mụ na nwunye m mụrụ ụmụ nwoke abụọ. Mgbe anyị mụchara ha, m malitere ichesi echiche ike ma ò nwere uru ndụ m na-ebi baara m. Echetara m ihe m nụrụ mgbe ahụ m gara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na Sidni. M kpebiziri na m ga-eme ihe m mụtara n’ọmụmụ ihe ahụ.

M hụrụ otu Ụlọ Nche ochie nke e dere adres ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Ọstrelia. M degaara ha akwụkwọ ozi ma gwa ha na m chọrọ ka ha nyere m aka. Ha dunyere otu nwoke bụ́ Onyeàmà Jehova ka ọ bịa n’ụlọ m. Nwoke a dị obiọma. Obere oge, mụ na ya malitere ịmụ Baịbụl.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

Ka mụ na nwoke ahụ na-amụ Baịbụl, m bịara ghọta na m kwesịrị ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị m na-akpa. E nwere otu ebe kacha ruo m n’obi na Baịbụl. Ebe ahụ bụ 2 Ndị Kọrịnt 7:1. O kwuru ka anyị “sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́.”

M kpebiri na m ga-akwụsị ịṅụ sịga, kwụsịkwa ịṅụ oké mmanya. Ọ dịrịghị m mfe ịkwụsị ha n’ihi na ha amarala m ahụ́. Ma, ekpebisiri m ike na mee elu mee ala, m ga-eme ihe dị Chineke mma. Ihe kacha nyere m aka ịkwụsị ha bụ na amalitere m ime ihe e dere ná Ndị Rom 12:2. Ebe ahụ sịrị: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị, kama gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ.” Achọpụtara m na ọ bụrụ na m ga-akwụsị ihe ọjọọ ndị ahụ m na-eme, m kwesịrị ịgbanwe otú m si eche echiche ma were ihe ndị ahụ m na-eme otú Chineke si were ha, ya bụ, na ha na-emerụ mmadụ ahụ́. Nke a nyeere m aka ịkwụsị ịṅụ sịga na ịṅụ oke mmanya.

“Achọpụtara m na ọ bụrụ na m ga-akwụsị àgwà ọjọọ ndị m na-akpa, m kwesịrị ịgbanwe otú m si eche echiche”

Ma, ihe kacha siere m ike ịkwụsị bụ ịkpọ ndị mmadụ iyi. Ama m ndụmọdụ Ndị Efesọs 4:29 nyere anyị. Ebe ahụ sịrị: “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta.” Ma nke ahụ emeghị ka m kwụsị ịkpọ ndị mmadụ iyi ozugbo. Abịaziri m chebara ihe e dere n’Aịzaya 40:26 echiche. Nke a nyeere m ezigbo aka. Ebe ahụ kwuru banyere eluigwe nke kpakpando juru. Ọ sịrị: “Lelienụ anya elu hụrụ. Ònye kere ihe ndị a? Ọ bụ Onye ahụ nke na-eme ka ha pụta n’ìgwè ọbụna dị ka ọnụ ọgụgụ ha si dị, ọ na-akpọ ha niile ọbụna n’aha. Ọ dịghị otu n’ime ha ọ na-achọ achọ, n’ihi na ike ya dị ukwuu, n’ihi na o nwekwara ume dị ukwuu.” M ghọtara na ebe ọ bụ na Chineke nwere ike o ji kee ihe ndị ahụ m na-ahụ na mbara ígwé, bụ́ ndị na-eme m obi ụtọ, o doro anya na ọ ga-enyeli m ike m ga-eji gbanwee àgwà ọjọọ ndị m na-akpa ma mewe ihe dị ya mma. Ọtụtụ ekpere m kpere na mbọ m gbara mere ka m jiri nwayọọ nwayọọ kwụsị ịkpọ ndị mmadụ iyi.

URU NDỊ M RITERELA:

Ebe ọ bụ na m na-azụ ịnyịnya, enwechaghị m ohere mụ na ndị mmadụ ịkparịta ụka. Ihe ọzọkwa bụ na ndị na-arụ ọrụ n’ebe m na-arụ ọrụ dị mmadụ ole na ole. Ma, ihe ndị m mụtara n’ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova enyerela m aka ịma otú m ga-esi na-agwa ndị mmadụ okwu. O meekwala ka m na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke.—Matiu 6:9, 10; 24:14.

O teela m bụ okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Obi dị m ụtọ na m na-eme ihe niile m nwere ike ime ka m nyere ụmụnna m aka. Ihe kacha eme m obi ụtọ bụ na mụ na ezigbo nwunye m na ọmarịcha ụmụ anyị abụọ na-efe Jehova.

Ana m ekele Jehova na ọ na-akụziri m ihe n’agbanyeghị na agachaghị m akwụkwọ. (Aịzaya 54:13) Ekwetara m na ihe Baịbụl kwuru n’Ilu 10:22 bụ eziokwu. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya.” Mụ na ezinụlọ m na-atụ anya ịmụtakwu ihe n’aka Jehova na ife ya ruo mgbe ebighị ebi.