Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Mbọ M Gbara Ibi Ndụ Dị Mma Kụrụ Afọ n’Ala Ọtụtụ Ugboro

Mbọ M Gbara Ibi Ndụ Dị Mma Kụrụ Afọ n’Ala Ọtụtụ Ugboro
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1953

  • ABỤ M ONYE: ỌSTRELIA

  • NDỤ M BIRI: ILE NDỊ GBA ỌTỌ RIRI M AHỤ́

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

N’afọ 1949, papa m si Jamanị kwaga Ọstrelia. Ọ gara ịchọ ọrụ n’ebe a na-egwupụta akụ̀ ndị dị́ n’ime ala nakwa n’ụlọ ọrụ ndị na-enye ọkụ. Ọ gara biri n’ime ime obodo dị na Viktoria. Ebe ahụ ka ọ nọ lụọ mama m, ha amụọkwa m n’afọ 1953.

Mgbe afọ ole na ole gachara, mama m malitere iso Ndịàmà Jehova amụ Baịbụl. Ọ bụ ya mere m ji mata ọtụtụ ihe na Baịbụl mgbe m ka dị obere. Ma, papa m enweghị ihe o ji okpukpe ọ bụla kpọrọ. Ọ na-akụ ndị mmadụ ihe, na-amajakwa ha. Mama m na-atụkwa ya ụjọ. Ọ na-anọ ebe papa m na-agaghị ahụ ya na-amụ Baịbụl, ihe ọ na-amụtakwa na-atọ ya ụtọ. Ọ na-abụ papa m pụọ, mama m akụziwere mụ na nwanne m nwaanyị ihe ọ na-amụta na Baịbụl. Ọ gwara anyị na ụwa ga-aghọ paradaịs, gwakwa anyị na anyị ga na-enwe obi ụtọ ma anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru.—Abụ Ọma 37:10, 29; Aịzaya 48:17.

Akwapụrụ m n’ụlọ anyị mgbe m dị afọ iri na asatọ n’ihi otú papa m si emesi onye ọ bụla ike. Ọ bụ eziokwu na ama m na ihe mama m kụziiri m si na Baịbụl, ejighị m ya kpọrọ ihe. Ọ bụ ya mere na emeghị m ihe ndị ahụ m mụtara na Baịbụl. Ebidoro m ịrụ na ngalaba na-awaya ọkụ n’ụlọ ọrụ ndị na-egwupụta kol. Mgbe m dị afọ iri abụọ, alụrụ m nwaanyị. Anyị mụrụ ada anyị afọ atọ anyị lụchara. Ebidokwara m ichebara ihe kacha mkpa ná ndụ m echiche. Ebe m ma na Baịbụl ga-enyeliri ezinụlọ m aka, amalitere m iso otu Onyeàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Ma, nwunye m achọghị iji anya ahụ Ndịàmà Jehova. Ụbọchị mbụ m gara ọmụmụ ihe ha lọta, ya asị m kwụsị ịmụ Baịbụl, ma ọ́ bụghị ya, anyị ekewaa. Amaghịzi m ihe m ga-eme eme. M kwụsịziri iso Ndịàmà Jehova amụ ihe ka obi dị ya mma. Ma, o mechara wute m na m hapụrụ ime ihe m kwesịrị ime.

Otu ụbọchị, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ gosiri m foto ndị gba ọtọ. Ọ tọrọ m ụtọ, ma obi m nọ na-ama m ikpe. Echetara m na Baịbụl kwuru na ihe a m na-eme adịghị mma, obi m na-agwakwa m na Chineke ga-ata m ahụhụ. Ma, ka m nọgidere na-ele foto ndị gba ọtọ, obi m kwụsịziri ịna-ama m ikpe. Nwayọọ nwayọọ, ile ndị gba ọtọ bịara rie m ahụ́.

Sí mgbe ahụ ruo ihe karịrị afọ iri abụọ, àgwà ọjọọ bịara mara m ahụ́, o nweghịzi ihe mama m kụziiri m na-abata m n’uche. Ihe ọjọọ ndị m na-amụta ka m bịaziri na-eme. M malitere ịna-ekwu okwu iberiibe, na-amakwa njakịrị iberiibe. Ewereghịzi m ịkwa iko ka ihe ọjọọ. Ọ bụ eziokwu na mụ na nwunye m ka bi, mụ na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ na-akwa iko. Otu ụbọchị, m lere onwe m n’enyo, gwa onwe m, sị, ‘Ị daala iberiibe.’ Onwe m bịaziri na-asọ m oyi.

Mụ na nwunye m mechara gbasaa, ndụ m aghasaakwa. Ejizi m obi m niile rịọ Jehova ka o nyere m aka. Ọ bụ eziokwu na o meela afọ iri abụọ m kwụsịrị ịmụ Baịbụl, ebidoghachiri m ịmụ Baịbụl. Papa m anwụọla mgbe ahụ, mama m emeekwala baptizim, ghọọ Onyeàmà Jehova.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

Ndụ m na-ebi dị ezigbote iche n’ụdị ndụ Baịbụl kwuru mmadụ kwesịrị ịna-ebi. Ma, ekpebiziri m na m ga-ebiwe ndụ otú Baịbụl kwuru ka m nwee ike inwe udo nke Chineke na-enye. Ekpebiri m ịkwụsị ikwu okwu rere ure, iwe iwe ọkụ, ịkwa iko, ịgba chaa chaa, ịṅụ oké mmanya, na izu ọga m ohi.

Ndị ọrụ ibe m aghọtaghị ihe mere m ji na-agbasi mbọ ike ịgbanwe ndụ m. Ha gbagidere mbọ ruo afọ atọ ka ha mee ka m bidokwa ibi ndụ ọjọọ ahụ m na-ebibu. Ọ bụrụ na e nwee mgbe m na-ejidelighị onwe m, wee ezigbo iwe ma ọ bụ kwuo okwu ọjọọ, ha niile na-eji ọṅụ tie, sị: “Ehee! Ugbu a ka i mere ka Joe anyị ma.” Ihe a ha na-ekwu na-agbawa m obi. Ụdị ihe a mee, ọ na-adịkarị m ka enweghịzi m mmekwata.

I rute n’ebe m na-arụ ọrụ, ị ga-ahụ foto ndị gba ọtọ n’ebe ọ bụla i lere anya, ma na kọmputa ma n’ekwentị ma n’akwụkwọ nkịtị. Ọ na-abụ onye nweta foto ndị gba ọtọ, ya ezigara ibe ya na kọmputa. M na-esobukwa ha eme ụdị ihe a. Ka m na-agba mbọ ịkwụsị ile foto ndị gba ọtọ, ha ana-ezitere m ha na kọmputa. Akọọrọ m onye na-amụrụ m Baịbụl ihe a ka o nyere m aka. O gere m nnọọ ntị ka m na-akọrọ ya otú obi dị m. Ọ gụụrụ m amaokwu Baịbụl dị iche iche ga-enyere m aka ịkwụsị àgwà a ririla m ahụ́. Ọ gwakwara m ka m na-ekpe ekpere mgbe niile, na-arịọ Jehova ka o nyere m aka.—Abụ Ọma 119:37.

N’ebe m na-arụ ọrụ, e nwere ụmụ nwoke abụọ gwara anyị na ha achọghịzi ịbụ ndị aṅụrụma. Otu ụbọchị, agwara m ndị ọrụ ibe m ka anyị zukọọ, na o nwere ihe m chọrọ ịgwa ha. Mgbe anyị zukọrọ, m gwara ha ka ha nye ụmụ nwoke abụọ ndị ahụ biya, ha niile asị: “Mbanụ! Ị ma na ha achọghịzi ịbụ ndị aṅụrụma.” M gwaziri ha, sị: “Mụnwa achọghịzikwa ịna-ele ndị gba ọtọ.” Ụbọchị ahụ ka ha ghọtara ihe mụ na ya na-alụ kemgbe ha na-enye m nsogbu. Ha enyeghịzikwa m nsogbu ọzọ.

Nwayọọ nwayọọ, Jehova nyeere m aka mụ akwụsị ile ndị gba ọtọ. N’afọ 1999, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova. Obi dị m ụtọ na Jehova nyeere m aka mụ ebidokwa biwe ndụ dị mma.

Aghọtala m ugbu a ihe mere Jehova ji kpọọ ihe ndị ahụ m hụburu n’anya asị. Ebe ọ bụ Nna hụrụ m n’anya, ọ chọghị ka nsogbu na-abịara ndị na-ele ndị gba ọtọ bịara m. Ilu 3:5, 6 kwuru, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.” Achọpụtala m na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ime ihe ndị m na-amụta na Baịbụl na-echebe m, na-emekwa ka ihe na-agaziri m.—Abụ Ọma 1:1-3.

URU NDỊ M RITERELA:

Onwe m na-asọbu m oyi, mana ugbu a, ama m na o nwere ihe m dị mma ya, obi na-erukwa m ala. M na-ebizi ndụ dị mma. Amakwa m na Jehova agbagharala m nakwa na ọ na-enyere m aka. N’afọ 2000, alụrụ m ọmarịcha nwaanyị aha ya bụ Karolin. Ọ bụ Onyeàmà Jehova ibe m. Ọ hụrụ Jehova n’anya otú mụnwa hụkwara ya. Anyị na-ebi n’udo. Obi na-atọgbu anyị atọgbu na anyị nọ n’ọgbakọ Chineke dị ọcha, ọgbakọ ndị nọ na ya n’ụwa niile hụrụ ibe ha n’anya.