Ihe Ga-akwụsị Mkpesa Ndị A Na-emekarị
Ihe Ga-akwụsị Mkpesa Ndị A Na-emekarị
BAỊBỤL ekwughị na alụmdi na nwunye dị mfe. Chineke nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ide na di na nwunye ga na-enwe “ọtụtụ nsogbu.” (1 Ndị Kọrịnt 7:28, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Ma, e nwere ọtụtụ ihe di na nwunye ga-emeli iji belata nsogbu ndị ha na-enwe ma mekwuo ibe ha obi ụtọ. Ka anyị tụlee mkpesa isii ndị dị n’okpuru ebe a bụ́ ndị di na nwunye na-emekarị ma hụ otú ime ihe Baịbụl kwuru nwere ike isi nyere ha aka.
1
MKPESA:
“Ohere anaghịzi adịrị mụ na di m ma ọ bụ nwunye m imekọ ihe.”
IHE BAỊBỤL KWURU:
“Chọpụta ihe ndị ka mkpa.”—NDỊ FILIPAỊ 1:10.
Alụmdi na nwunye unu bụ otu n’ime ihe ndị kacha mkpa ná ndụ unu. O kwesịrị ịbụ ihe mbụ ná ndụ unu. N’ihi ya, tụlee ma ihe ndị ị na-eme kwa ụbọchị hà so na-akpata nsogbu ahụ. Ekwela ka ihe ndị dị mkpa ị na-eme n’ụbọchị mee ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akpa iche iche. O doro anya na ọrụ ego na ihe ndị ọzọ ị na-agaghị ezereli nwere ike ime ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ghara ịnọ mgbe ụfọdụ. Ma, i nwere ike ibelata ihe ọ bụla ị na-eme bụ́ nke ị ga-ebelatali—dị ka oge ị na-eji
atụrụ ndụ na nke gị na ndị enyi gị na-eji anọrị—i kwesịkwara ime otú ahụ.Ma, ụfọdụ ndị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ịnara ọrụ ọzọ ma ọ bụ malite igwu egwuregwu ọhụrụ naanị ka ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha ghara ịna-anọ. Ọ bụghị na “ohere anaghịzi adịrị” ndị di na nwunye dị otú ahụ imekọ ihe. Ha na-agbara nsogbu ha ọsọ. Ọ bụrụ na gị ma ọ bụ di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eme otú ahụ, i kwesịrị ịchọpụta ihe na-akpata nsogbu ahụ ma gbalịa imeri ya. Naanị ihe ga-eme ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị dịkwuo ná mma ma ‘ghọọ otu anụ ahụ́’ n’ezie bụ unu imekọ ihe ọnụ.—Jenesis 2:24.
Otú ụfọdụ sirila gbasoo ndụmọdụ a: Andrew * na Tanji, bụ́ di na nwunye bi n’Ọstrelia, alụọla afọ iri. Andrew kwuru, sị: “Achọpụtala m na ịrụbiga ọrụ ókè na ịga ọtụtụ ememme nwere ike ịkpa alụmdi na nwunye aka ọjọọ. N’ihi ya, mụ na nwunye m na-ewepụta oge iji na-ekwurịta okwu ma na-agwa ibe anyị ihe dị anyị n’obi.”
Dave na Jane, bụ́ ndị bi n’Amerịka, ndị lụkwarala afọ iri abụọ na abụọ, na-eji nkeji iri atọ mbụ ha lọtara ọrụ akọrị ihe ndị mere n’ụbọchị na ihe ha na-eche. Jane kwuru, sị: “Oge a dị anyị ezigbo mkpa nke na anyị anaghị ekwe ka ihe ọ bụla ọzọ were ya.”
2
MKPESA:
“Anaghịzi m enweta ihe m chọrọ n’alụmdi na nwunye a.”
IHE BAỊBỤL KWURU:
“Ka onye ọ bụla na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.”—1 NDỊ KỌRỊNT 10:24.
Onye ihe kacha ya mkpa bụ uru ọ na-erite n’alụmdi na nwunye adịghị mgbe ọ ga-enwe obi ụtọ, ya bụrụgodị na ọ lụgharịa di ma ọ bụ nwunye ọtụtụ ugboro. Ihe na-aga nke ọma n’alụmdi na nwunye mgbe onye nke ọ bụla kacha elekwasị anya n’inye ihe karịa n’ịnara ihe. Jizọs kwuru ihe mere o ji dị otú ahụ, sị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
Otú ụfọdụ sirila gbasoo ndụmọdụ a: Maria na Martin, bụ́ ndị bi na Meksiko, alụọla afọ iri atọ na itoolu. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ihe gaara ha werewere. Ha chetara otu oge siiri ha ike. Maria chetara ihe merenụ, sị: “Otu oge mụ na Martin na-abarịta mba, agwara m ya otu ihe gburu ya mmụọ. Ezigbo iwe were ya. Anwara m ịkọwara ya na ihe ahụ m kwuru esighị m n’obi, na ọ bụ iwe kpatara ya. Ma, o kweghị ege m ntị.” Martin kwuru, sị, “N’esemokwu ahụ, amalitere m iche na anyị agaghị ebikọlikwa, na ọ bazighị uru mụ ịgbawa mbọ idozi alụmdi na nwunye anyị.”
Martin chọrọ nsọpụrụ. Maria chọrọ ka a ghọta otú obi dị ya. O nweghị onye n’ime ha na-enweta ihe ọ chọrọ.
Olee otú ha si merie nsogbu ahụ? Martin kwuru, sị: “Enyere m onwe m ohere ka obi dajụọ m, anyị abụọ kpebikwara ịgbaso ezi ndụmọdụ Baịbụl nyere ka di na nwunye na-akwanyere ibe ha ùgwù ma jiri obiọma na-emeso ibe ha ihe. Ka ọtụtụ afọ gaferela, anyị amụtala na n’agbanyeghị ugboro ole nsogbu bịaara anyị, anyị nwere ike imeri ha ma ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka enyemaka Chineke ma gbasoo ndụmọdụ Baịbụl.”—Aịzaya 48:17, 18; Ndị Efesọs 4:31, 32.
3
MKPESA:
“Di m ma ọ bụ nwunye m anaghị eme ihe ndị o kwesịrị ime.”
IHE BAỊBỤL KWURU:
“Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.”—NDỊ ROM 14:12.
O doro anya na alụmdi na nwunye agaghị na-aga nke ọma ma ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu onye na-agba mbọ ime ka ọ gazie agazie. Ma, ihe ga-aka njọ ma ọ bụrụ na ọ dịghị onye nke ji ọrụ ya n’ezinụlọ kpọrọ ihe, ha ana-atarịtakwa ibe ha ụta.
Ọ bụrụ na i lekwasị anya n’ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị kwesịrị ịna-eme, ọ dịghị mgbe ị ga-enwe obi ụtọ. Ọ ga-adị otú ahụ karịsịa ma ọ bụrụ na ị hapụ ihe ndị i kwesịrị ime n’ihi na di gị ma ọ bụ nwunye gị anaghị emezi emezi. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ị na-agbalị ịbụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye, ihe nwere ike ịka mma n’alụmdi na nwunye unu. (1 Pita 3:1-3) Nke ka nke bụ na ị ga na-egosi Chineke na ị na-akwanyere ndokwa alụmdi na nwunye o mere ùgwù, àgwà gị ga na-emekwa ya nnọọ obi ụtọ.—1 Pita 2:19.
Otú ụfọdụ sirila gbasoo ndụmọdụ a: Kim na di ya, bụ́ ndị bi na Koria, alụọla afọ iri atọ na asatọ. Kim kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, di m na-eweso m iwe ma kwụsị ịtụpụrụ m ọnụ, agaghịdị m ama ihe kpatara ya. Nke ahụ na-eme ka m chee na ọ hụzighị m n’anya otú ọ hụburu m. Mgbe ụfọdụ, m na-eche, sị, ‘Olee ihe mere ọ ga-eji chọọ ka m ghọta ihe dị ya n’obi ebe ọ na-anakwanụghị agbalị ịghọta nke m?’”
Kim nwere ike ilekwasị anya n’otú di ya si na-emegbu ya nakwa n’ihe na-adịghị mma di ya na-eme. Kama nke ahụ, o kpebiri ime ihe dị iche. Kim kwuru, sị, “Kama ịnọgide na-ewe iwe, amụtala m na ọ kacha mma ịgakwuru ya ka anyị kpezie. E mechaa, obi na-alọtu anyị, anyị ejirikwa nwayọọ kwurịta ihe merenụ.”—Jems 3:18.
4
MKPESA:
“Nwunye m anaghị erubere m isi.”
IHE BAỊBỤL KWURU:
“Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla.”—1 NDỊ KỌRỊNT 11:3.
Di nke na-eche na nwunye ya anaghị erubere ya isi kwesịrị ibu ụzọ jụọ onwe ya ma ọ̀ dị njikere irubere Isi ya, bụ́ Jizọs Kraịst, isi. Di nwere ike igosi na ọ na-erube isi site n’ịgbaso ihe nlereanya Jizọs.
Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.” (Ndị Efesọs 5:25) Jizọs emesoghị ndị na-eso ụzọ ya ihe ‘ka ọ̀ bụ ya nwe ha.’ (Mak 10:42-44) O nyere ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka doro anya ma gbazie ha mgbe ọ dị mkpa. Ma, ọ dịghị mgbe ọ chịrị ha ọchịchị aka ike. O ji obiọma meso ha ihe ma leghara ebe ha na-anaghị eme nke ọma anya. (Matiu 11:29, 30; Mak 6:30, 31; 14:37, 38) O butere ọdịmma ha ụzọ mgbe niile.—Matiu 20:25-28.
Ọ dị mkpa ka di jụọ onwe ya, sị, ‘Ihe kacha ekpebi otú m si ele ịbụisi na ndị inyom anya ọ̀ bụ omenala obodo anyị ka ọ̀ bụ ndụmọdụ na ihe nlereanya ndị dị na Baịbụl?’ Dị ka ihe atụ, olee ihe ị ga-eche banyere nwaanyị na-ekwenyereghị di ya ma jiri nkwanye ùgwù kwuo hoo haa ihe dị iche o chere? Na Baịbụl, e ji nwunye Ebreham, bụ́ Sera, maa atụ otú nwaanyị kwesịrị isi na-edo onwe ya n’okpuru di ya. (1 Pita 3:1, 6) N’agbanyeghị nke ahụ, o kwuru echiche ya mgbe ọ dị mkpa, dị ka mgbe Ebreham na-ahụghị otu ihe na-achọ ịkpatara ezinụlọ ha nsogbu.—Jenesis 16:5; 21:9-12.
O doro anya na Ebreham agbọchighị Sera ọnụ. Ọ dịghị aka ike. N’otu aka ahụ, di nke na-agbaso ndụmọdụ Baịbụl agaghị na-amanye nwunye ya ime ihe, sie ọnwụ na ọ ga-eme ihe ọ bụla ọ gwara ya. Nwunye ya ga na-akwanyere ya ùgwù n’ihi otú o si eji ọmịiko edu ya.
Otú ụfọdụ sirila gbasoo ndụmọdụ a: James, bụ́ onye bi n’Ịngland, nke lụkwarala nwaanyị afọ asatọ, kwuru, sị: “Amụtawala m ịghara ime mkpebi ndị gbara ọkpụrụkpụ n’ajụghị nwunye m echiche ya. M na-agba mbọ ka m ghara iche naanị banyere onwe m. Kama nke ahụ, m na-agbali ibute mkpa ya ụzọ karịa nke m.”
George bi n’Amerịka, ọ lụọkwala nwaanyị iri afọ ise na itoolu. O kwuru, sị: “M gbalịala ka m ghara ime nwunye m ka ọ̀ bụ ohu, kama m na-emeso ya ka ezigbo onye inyeaka nke nwere ọgụgụ isi.”—Ilu 31:10.
5
MKPESA:
“Di m anaghị eme ka onyeisi ezinụlọ.”
IHE BAỊBỤL KWURU:
“Nwaanyị nke maara ihe n’ezie ewulitewo ụlọ ya, ma nwaanyị nzuzu na-eji aka ya akwatu ya.”—ILU 14:1.
Ọ bụrụ na ọ na-esiri di gị ike ime mkpebi ma ọ bụ ibute ụzọ n’ilekọta ezinụlọ unu, ya dịkarịa ala, e nwere ihe atọ i nwere ike ime. (1) I nwere ike na-agwa ya mgbe niile ebe ọ na-emejọ ma ọ bụ (2) naghara ya ọrụ idu ndú n’ezinụlọ ma ọ bụ (3) si n’obi gị na-aja ya mma maka mgbalị ọ bụla ọ na-eme. Ọ bụrụ na i mee nke ọ bụla n’ime abụọ ndị mbụ ahụ, ị ga-eji aka gị kwatuo ụlọ gị. Ikpebi ime ihe nke atọ ahụ ga-enyere gị aka iwuli ezinụlọ gị ma ọ bụ iwusi ya ike.
Ọtụtụ ụmụ nwoke chọdịrị nsọpụrụ karịa ịhụnanya. Ya mere, ọ bụrụ na i mee ka di gị mara na ị na-asọpụrụ ya—mee ka ọ ghọta na mbọ ọ na-agba idu ezinụlọ unu na-arụpụta ezi ihe nakwa na ọ dị gị mma—o yiri ka ọ̀ ga na-arụkwu ọrụ ya nke ọma. N’ezie, a ga-enwe mgbe ị na-agaghị ekwenyere di gị. Ọ ga-adị mkpa ka unu abụọ kwurịta ya. (Ilu 18:13) Ma, ihe ndị i kwuru na otú i si kwuo ha ga-akwatu ma ọ bụ wulie alụmdi na nwunye unu elu. (Ilu 21:9; 27:15) Jiri nsọpụrụ gwa ya otú obi dị gị, o nwekwara nnọọ ike ịka mee ka i nweta ihe ị chọrọ, ya bụ, inwe di nke ọ na-anaghị esiri ike ibute ụzọ n’ezinụlọ ya.
Otú ụfọdụ sirila gbasoo ndụmọdụ a: Michele, bụ́ onye bi n’Amerịka nke lụkwarala di iri afọ atọ, kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na nne m enweghị di mgbe ọ zụlitere mụ na ụmụnne m ndị nwaanyị, ọ bụ agụ nwaanyị, nke na-emere onwe ya mkpebi. Ọ dị nnọọ ka m̀ na-emekarị ka ya. N’ihi ya, m na-agbalị ịrụ ọrụ mgbe niile iji na-edo onwe m n’okpuru di m otú m kwesịrị. Dị ka ihe atụ, amụtala m ịjụ di m echiche ya kama ime nnọọ mkpebi n’onwe m.”
Otú e si zụlite Rachel, bụ́ onye bi n’Ọstrelia nke ya na Mark lụkwarala afọ iri abụọ na otu, metụtakwara ya. O chetara, sị: “Nne m anatụghị edo onwe ya n’okpuru nna m. A na-arụ ụka mgbe niile n’ụlọ anyị, nne m na-akparịkwa nna m mgbe niile. Mgbe m lụchara di, eṅomiri m nne m ruo afọ ole na ole. Ma, ka oge na-aga, ahụla m uru ọ bara ịgbaso ndụmọdụ Baịbụl nyere ụmụ nwaanyị ịsọpụrụ di ha. Mụ na Mark na-enwezi obi ụtọ karịa n’alụmdi na nwunye anyị.”
6
MKPESA:
“Àgwà ọjọọ di m ma ọ bụ nwunye m agwụla m ike.”
IHE BAỊBỤL KWURU:
“Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya.”—NDỊ KỌLỌSI 3:13.
Mgbe gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị malitere ịkpa tupu unu alụọ, ikekwe, i lekwasịrị nnọọ anya n’àgwà ọma ndị o nwere nke na ị hụghị àgwà ọjọọ ya. Ì nwere ike ime otu ihe ahụ ugbu a? O doro anya na ọ dị ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eme nke nwere ike ime ka i mee
mkpesa. Ma, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee àgwà di m ma ọ bụ nwunye m nwere nke m ga-achọ ilekwasị anya—ọ̀ bụ nke ọma ka ọ̀ bụ nke ọjọọ?’Jizọs mere otu ihe atụ bụ́ ịgba nke gosiri na ọ dị mkpa ka anyị leghara ihe ndị anyị hụrụ ndị ọzọ na-emejọ anya. Ọ jụrụ, sị “Gịnịzi mere i ji ele irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma i chebaraghị ntụhie dị n’anya nke gị echiche?” (Matiu 7:3) Irighiri ahịhịa na-adị nnọọ obere. Ma, ntụhie bụ nnukwu okporo osisi na-ejigide uko ụlọ. Olee ihe Jizọs na-ekwu? O kwuru, sị: “Buru ụzọ wepụ ntụhie dị n’anya nke gị, mgbe ahụ ka ị ga-ahụ nke ọma otú ị ga-esi wepụ irighiri ahịhịa n’anya nwanna gị.”—Matiu 7:5.
Tupu Jizọs emee ihe atụ a, ọ dọrọ ndị na-ege ya ntị aka ná ntị, sị. “Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe; n’ihi na otú unu si ekpe ikpe ka a ga-esi kpee unu ikpe.” (Matiu 7:1, 2) Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka Chineke leghara mmejọ gị, ya bụ, ntụhie dị gị n’anya, anya, ihe ga-enyere gị aka bụ ileghara mmejọ nke di gị ma ọ bụ nwunye gị anya.—Matiu 6:14, 15.
Otú ụfọdụ sirila gbasoo ndụmọdụ a: Jenny, bụ́ onye bi n’Ịngland, bụ́kwa onye ya na Simon lụrụla afọ itoolu ugbu a, kwuru, sị: “Achọpụtara m na ihe kacha ewe m iwe n’ebe di m nọ bụ na ọ naghị elepụ anya n’ihu eme atụmatụ, bụ́ nke na-eme ka ọ na-eme ihe mgbe oge gwụrụla agwụ. Nke ahụ bụ ihe ijuanya, n’ihi na mgbe anyị na-akpa tupu anyị alụọ, ọ na-atọ m ụtọ ịhụ otú o si eme ihe n’emeghị atụmatụ. Ma, achọpụtala m na m nwekwara nsogbu, dị ka ihe atụ, m na-achọ ịgwa di m ihe ọ ga-eme mgbe niile. Mụ na Simon amụtawala ileghara obere mmejọ ibe anyị anya.”
Curt, bụ́ di Michele, bụ́ onye e kwurula ihe o kwuru, sịrị: “Ọ bụrụ na i lekwasị anya n’àgwà di gị ma ọ bụ nwunye gị ndị na-akpasu gị iwe, mmejọ ya ndị ahụ ga na-ebuwanye ibu n’anya gị. Ọ na-akara m mma ilekwasị anya n’àgwà ndị Michele nwere, bụ́ ndị mere ka m malite ịhụ ya n’anya.”
Ihe Ga-eme Ka Unu Nwee Ihe Ịga nke Ọma
Ihe atụ ole na ole ndị a na-egosi na di na nwunye ga-enwerịrị nsogbu, ma ha ga-emerili ha. Olee ihe ga-enyere unu aka inwe ihe ịga nke ọma? Mụtanụ ịhụ Chineke n’anya ma dịnụ njikere ịgbaso ndụmọdụ ya ndị dị n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl.
Alex na Itohan, bụ́ ndị bi na Naịjirịa, bụ́kwa ndị lụrụla iri afọ abụọ, amụtala ime otú ahụ. Alex kwuru, sị: “Achọpụtala m na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ọ dịghị esemokwu di na nwunye nwere nke ha na-agaghị emerili ma ọ bụrụ na ha ime ihe Baịbụl kwuru.” Nwunye ya kwuru, sị: “Anyị amụtala na ọ dị mkpa ikpekọ ekpere ọnụ mgbe niile na ịgbaso ndụmọdụ Baịbụl bụ́ iji obi anyị niile hụ ibe anyị n’anya na inwere ibe anyị ndidi. Anyị anaghịzi enwe nsogbu otú anyị na-enwe mgbe anyị lụrụ ọhụrụ.”
Ị̀ ga-achọ ịmatakwu otú ndụmọdụ ndị bara uru dị n’Okwu Chineke nwere ike isi baara ezinụlọ gị uru? Ya bụrụ otú ahụ, gwa Ndịàmà Jehova ka gị na ha tụlee isi nke 14 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? *
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
^ par. 63 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
[Foto dị na peeji nke 4]
Ànyị na-ewepụtara ibe anyị oge?
[Foto dị na peeji nke 5]
M̀ na-agbalị inye ihe karịa ịnara anara?
[Foto dị na peeji nke 6]
M̀ na-ebute ụzọ n’idozi esemokwu?
[Foto dị na peeji nke 7]
M̀ na-atụle echiche nwunye m tupu mụ emee mkpebi?
[Foto dị na peeji nke 9]
M̀ na-elekwasị anya n’àgwà ọma ndị di m ma ọ bụ nwunye m nwere?