Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị kọrịnt 11:1-34

  • “Na-emenụ ka m” (1)

  • Onye bụ́ onyeisi na ikpuchi isi (2-16)

  • Otú a ga-esi na-eri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị (17-34)

11  Na-emenụ ka m,* otú mụnwa si eme ka Kraịst.+  Ụmụnna m, unu emeela maka otú unu si echeta m n’ihe niile, nakwa maka otú unu si eme ihe niile m kụziiri unu.  Ma, achọrọ m ka unu mara na Kraịst bụ onyeisi nwoke ọ bụla.+ Nwoke bụ onyeisi nwaanyị,+ Chineke bụkwa onyeisi Kraịst.+  Nwoke ọ bụla nke kpuchiri isi ya na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ebu amụma na-emenye onyeisi ya ihere.  Ma, nwaanyị ọ bụla na-ekpuchighị isi ya na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ebu amụma+ na-emenye onyeisi ya ihere, n’ihi na ya na nwaanyị kpụrụ isi ya akpụ bụ otu.  N’ihi ya, ọ bụrụ na nwaanyị anaghị ekpuchi isi ya, ya kpụọ isi ya. Ma, ọ bụrụ na ihere na-eme nwaanyị ma ọ kpụọ isi ya ma ọ bụ kpachapụ ntutu isi ya, ya kpuchie isi ya.  Nwoke ekwesịghị ikpuchi isi ya, n’ihi na Chineke kere ya n’oyiyi ya+ nakwa n’ebube ya. Ma nwaanyị bụ ebube nwoke.  N’ihi na Chineke esighị n’ahụ́ nwaanyị kee nwoke, ma, o si n’ahụ́ nwoke kee nwaanyị.+  Chineke ekeghịkwa nwoke n’ihi nwaanyị, ma, o kere nwaanyị n’ihi nwoke.+ 10  N’ihi ihe a nakwa n’ihi ndị mmụọ ozi,+ nwaanyị kwesịrị ikpuchi isi ya, ka o gosi na ọ nọ n’okpuru nwoke. 11  N’ọgbakọ Onyenwe anyị, nwaanyị enweghị ike ịdị ma nwoke adịghị, nwoke enweghịkwa ike ịdị ma nwaanyị adịghị. 12  N’ihi na otú ahụ o si bụrụ na e si n’ahụ́ nwoke kee nwaanyị,+ ka o sikwa bụrụ na nwaanyị na-amụ nwoke. Ma, ọ bụ Chineke kere ihe niile.+ 13  Chegodịnụ ma ò kwesịrị ekwesị ka nwaanyị ghara ikpuchi isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere. 14  Otú e si kee mmadụ ọ́ naghị akụziri unu na nwoke na-emenye onwe ya ihere ma ọ hapụ ntutu isi ya ka o too ogologo? 15  Ma, ọ bụrụ na nwaanyị ahapụ ntutu isi ya ka o too ogologo, ọ́ naghị eme ka a na-aja ya mma? N’ihi na Chineke nyere nwaanyị ogologo ntutu isi kama inye ya ákwà isi. 16  Ma, ọ bụrụ na e nwere onye na-ekwetaghị ihe a, gwanụ ya na o nweghị otú ọzọ ọgbakọ Chineke si eme ya. 17  Ma, ọ bụ eziokwu na m na-agwa unu ihe ndị unu kwesịrị ịna-eme, anaghị m aja unu mma, maka na nzukọ unu na-enwe na-aghọ unu ahịa kama ịbara unu uru. 18  N’ihi na ana m anụ na unu na-akpa iche iche n’ọgbakọ unu ma unu zukọọ. Ọ dịkwa m ka ọ̀ bụ eziokwu. 19  Ya bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụrịrị na òtù dị iche iche dịzi n’ọgbakọ unu,+ ka e si otú ahụ mata ndị omume ha dị Chineke mma n’ime unu. 20  Ọ na-abụ unu zukọọ otu ebe maka iri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị,+ unu anaghị eri ya otú kwesịrị ekwesị. 21  N’ihi na ọ na-abụ tupu oge unu ga-eri ya eruo, ụfọdụ n’ime unu na-ebu ụzọ rie nri anyasị nke ha, nke mere na agụụ na-agụ ụfọdụ, mmanya ana-egbu ụfọdụ. 22  Ọ̀ bụ na unu enweghị ụlọ unu ga-anọ rie ihe ma ṅụọ mmanya? Ka ùnu na-eleda ọgbakọ Chineke anya ma na-eme ka ihere mee ndị na-enweghị ihe ọ bụla? Gịnị ka m ga-agwa unu? Ọ̀ bụ m jawa unu mma? Mbanụ. Agaghị m aja unu mma n’ihe a unu na-eme. 23  N’ihi na ọ bụ ihe Onyenwe anyị kụziiri m ka m na-akụziri unu. N’abalị ahụ+ a ga-arara Onyenwe anyị Jizọs nye n’aka ndị iro ya, o weere otu ogbe achịcha. 24  Mgbe o kelechara Chineke, ọ nyawara ya, sị: “Nke a pụtara ahụ́ m,+ nke m ga-enye n’ihi unu. Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”+ 25  Mgbe ha richara nri anyasị,* o buuru iko, meekwa otu ihe ahụ.+ Ọ sịrị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ+ nke ga-enwe isi mgbe m wụpụrụ ọbara m.+ N’oge niile unu na-aṅụ ihe dị n’ime iko a, na-emenụ ya iji na-echeta m.”+ 26  N’ihi na n’oge niile unu na-ata achịcha a ma na-aṅụ mmanya dị n’iko a, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịa. 27  N’ihi ya, onye ọ bụla na-erughị eru taa achịcha ahụ ma ọ bụ ṅụọ mmanya dị n’iko Onyenwe anyị emehiela ahụ́ na ọbara Onyenwe anyị. 28  Ka mmadụ buru ụzọ nyochaa onwe ya.+ Ọ bụrụ na ọ chọpụtakwa na ya ruru eru, ya taa achịcha ahụ ma ṅụọ mmanya dị n’iko ahụ. 29  N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ na-ata achịcha a ma na-aṅụ mmanya dị n’iko a, ma ọ maghị na ha nọchiri anya ahụ́ Onyenwe anyị, ọ na-ama onwe ya ikpe. 30  Ọ bụ ya mere na ọtụtụ n’ime unu adịghị ike, ọtụtụ na-arịa ọrịa, ọtụtụ anwụọkwala.*+ 31  Ma ọ bụrụ na anyị nyochara onwe anyị nke ọma, a gaghị ekpe anyị ikpe. 32  Ma, ọ bụrụ na anyị enyochaghị onwe anyị, a na-ekpe anyị ikpe, Jehova* na-esikwa otú ahụ gbazie anyị,+ ka a ghara ịmakọ anyị na ụwa ikpe.+ 33  N’ihi ya, ụmụnna m, mgbe unu zukọtara iri ya, cherenụ ibe unu. 34  Ọ bụrụ na e nwere onye agụụ na-agụ, ya rie ihe n’ụlọ, ka ọ ga-abụ unu zukọta, a gaghị ekpe ya ikpe.+ Ma, m ga-edozi okwu ndị fọdụrụ mgbe m rutere ebe ahụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Na-eṅominụ m.”
Ya bụ, nke Ememme Ngabiga.
Ọnwụ a abụghị ọnwụ nkịtị. Kama ọ pụtara na ndị ahụ na Chineke adịghịzi ná mma.
Gụọ A5.