M̀ kwesịrị isonyere okpukpe?
Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .
M̀ kwesịrị isonyere okpukpe?
▪ Ọ̀ na-esiri gị ike isonyere okpukpe ọ bụla n’ihi na ihu abụọ na adịghị n’otu nke ndị na-aga chọọchị na nke ndị ụkọchukwu na-asọ gị oyi? Ya bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịbụ na i kweere nnọọ ilu ndị Frans a, “Ọ bụghị ibi ụlọ ụka nso bụ ịnọ Chineke nso.”
Ikekwe, ị na-akwanyere Baịbụl ùgwù ma chee na gọọmenti na ndị ọzọ kwesịrị ịhapụ mmadụ ka o kpewe okpukpe ọ bụla ọ chọrọ. Ma, i nwere ike ịnọ na-eche, sị, ‘Chineke ò kwuru n’ezie na ndị chọrọ ife ya otú ọ na-achọ aghaghị ịnọ n’otu okpukpe?’
Azịza ya dị nkenke bụ ee. Olee ihe mere anyị ga-eji jide nke ahụ n’aka? Mmadụ ò nwekwara nnọọ ike ịnọ n’okpukpe ọ bụla sọrọ ya?
Tụlee ihe nlereanya Jizọs. Ò nwere okpukpe ọ nọ na ya? Mgbe Jizọs dị obere, ọ na-eso ezinụlọ ya bụ́ ndị Juu na ndị ọzọ aga efe ofufe na Jeruselem. (Luk 2:41-43) Mgbe Jizọs toro, o so ndị Juu ibe ya fee Chineke n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị n’obodo ya. (Luk 4:14-16) Mgbe Jizọs na-agwa nwaanyị nọ n’okpukpe ọzọ okwu, Jizọs kwuru, sị: “Anyị na-efe ihe anyị maara.” (Jọn 4:22) Ihe Jizọs kwuru ebe a gosiri nnọọ na ọ nọ n’okpukpe ndị Juu.
Jizọs mechara kwuo na ebe ọ bụ na mba ndị Juu jụrụ ya, Chineke ga-ajụ ofufe ha rụrụ arụ. (Matiu 23:33–24:2) Ma, o kwuru ihe gosiri na ndị chọrọ ife Chineke ofufe ọ na-anabata aghaghị ịnọ n’okpukpe. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Ọ ga-esiri onye na-eso ụzọ Kraịst nke ya na ndị kwere ekwe ibe ya na-anaghị akpakọrịta ike ịhụ ha n’anya. N’ezie, Jizọs kwuru hoo haa na okpukpe niile nọ n’ụzọ abụọ. Ọ kọwara na otu bụ okporo ụzọ “sara mbara ma dị obosara” nke na-eduba “ná mbibi.” Ma, o kwuru, sị: “Ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.”—Matiu 7:13, 14.
N’ihi ya, o doro anya na ọ bụghị okpukpe ọ bụla ga-eduga mmadụ ná ndụ. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara isonyere ndị “ga-eyi ndị okpukpe ma ha ajụwo ike ya.” Okwu Chineke kwukwara, sị, “zere ndị dị otú ahụ.” (2 Timoti 3:5, The NET Bible) N’aka nke ọzọ, anyị ga-erite uru dị ukwuu ma ọ bụrụ na anyị achọta ndị nọ n’ụzọ ahụ nke na-eduba ná ndụ ma sonyere ha. Ha ga na-agba anyị ume ma na-akwado anyị ugbu a, anyị ga-enwekwa ezigbo olileanya maka ọdịnihu.—Ndị Hibru 10:24, 25.
Olee otú ị ga-esi mata okpukpe nke nọ n’ụzọ ahụ dị warara? Ọ́ gaghị adị mma ka ị tụlee otú Baịbụl si zaa ya n’isi nke 15 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? * Isiokwu ahụ ga-enyere gị aka ịmata okpukpe nke i kwesịrị isonyere.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.