Gaa n'Isiokwu

Olee Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Ihe Ị Na-agụ na Baịbụl?

Olee Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Ihe Ị Na-agụ na Baịbụl?

Ihe Baịbụl kwuru

 Baịbụl n’onwe ya gwara anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịghọta ihe e dere na ya. Ma ị̀ gụrụ akwụkwọ ma ọ bụ na ị gụghị, ihe Chineke na-agwa anyị na Baịbụl agaghị ‘esiri gị oké ike, ọ dịghịkwa n’ebe dị anya.’​—Diuterọnọmi 30:11.

Ihe ndị ga-enyere gị aka ịghọta ihe ị na-agụ na Baịbụl

  1.   Kweta n’ihe Baịbụl kwuru. Kweta na Baịbụl bụ Okwu Chineke. Dịrị umeala n’obi n’ihi na Chineke anaghị anabata ndị mpako. (1 Ndị Tesalonaịka 2:13; Jems 4:6) Ma, ọ pụtaghị na a sị gị na ọ dị iri, gị achịrị wụnye n’akpa. Chineke chọrọ ka i jiri ‘ike iche echiche’ gị chọpụta nke bụ́ eziokwu.​—Ndị Rom 12:​1, 2.

  2.   Rịọ Chineke ka o nye gị amamihe. N’Ilu 3:​5, Baịbụl sịrị gị “adaberekwala ná nghọta gị.” Kama ịdabere ná nghọta gị, “na-arịọ Chineke” ka o nye gị amamihe ị ga-eji ghọta ihe ị na-agụ na Baịbụl.​—Jems 1:5.

  3.   Na-amụ Baịbụl mgbe niile. Ị ga-aka erite uru ma ọ bụrụ na ị na-amụchi Baịbụl anya karịa ịna-amụ ya mgbe ọ dabara.​—Jọshụa 1:8.

  4.   Ị mụchaa otu ihe Baịbụl kwuru gị agafee n’ọzọ. Otu ụzọ ị ga-esi ghọta ihe Baịbụl na-akụzi bụ ịhọrọ otu ihe ma lee ihe Baịbụl kwuru gbasara ya. Ị mụchaa nke ahụ, gị ahọrọkwa ọzọ ị ga-amụ. Buru ụzọ mụọ ndị nke dị mfe. E mechazie gị amụwa ndị nke e nwere ike ikwu na ha bụ maka ndị ‘tozuru okè.’ (Ndị Hibru 6:​1, 2) Ị na-eme ya otú a, ọ ga-enyere gị aka iji ihe e dere n’otu amaokwu Baịbụl ghọta ihe e dere n’amaokwu ọzọ, ị ga-ahụkwa otú otu amaokwu Baịbụl si akọwa ibe ya, ọ sọgodị ya ya bụrụ amaokwu ndị “siri ike nghọta.”​—2 Pita 3:16.

  5.   Gwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. Ihe e dere na Baịbụl na-egosi na anyị kwesịrị ikwe ka ndị ọzọ nyere anyị aka ịghọta ihe dị na Baịbụl. (Ọrụ Ndịozi 8:​30, 31) Ndịàmà Jehova na-agwa ndị mmadụ ka ha na ha na-amụ Baịbụl na-anaghị ha ego. Ha na-eji amaokwu Baịbụl dị iche iche enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi otú ahụ Ndị Kraịst oge mbụ mere.​—Ọrụ Ndịozi 17:​2, 3.

Ihe ndị na-adịghị gị mkpa iji ghọta ihe ị na-agụ na Baịbụl

  1.   Inwe oké amamihe ma ọ bụ ịgụ oké akwụkwọ. Ndịozi iri na abụọ Jizọs ghọtara ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ ma kụziere ya ndị ọzọ n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị weere ha ka “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.”​—Ọrụ Ndịozi 4:13.

  2.   Ego. Ọ gaghị efu gị ego iji mụta Baịbụl. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.”​—Matiu 10:8.