Gị na Ndị Ọgọ Gị Ma Ọ Bụ Nne na Nna Di Gị Imekọ Ihe
Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ
Gị na Ndị Ọgọ Gị Ma Ọ Bụ Nne na Nna Di Gị Imekọ Ihe
Jeni * kwuru, sị: Nne Rayan anaghị ezo ọnụ ịgwa m na ihe m adịghị ya mma. Ma, ndị mụrụ m na-emekwa Rayan otu ihe ahụ. N’eziokwu, ahụtụbeghị m ebe ha ledara onye ọ bụla anya otú ha si eleda ya! Obi anaghịzi eru anyị ala ịga leta ndị mụrụ anyị.
Rayan kwuru, sị: Ọ dịghị onye nne m na-eche na o kwesịrị ụmụ ya. N’ihi ya, o nweghị mmasị n’ebe Jeni nọ site ná mmalite. Ndị mụrụ Jeni chekwara otú ahụ banyere m—ha na-akatọ m mgbe niile. Nke ka njọ bụ na mgbe ọ bụla ụdị ihe ahụ mechara, mụ na Jeni na-agbachitewere nne na nna anyị ma na-akatọ ibe anyị.
ESEMOKWU na-adị n’etiti nwoke na ndị ọgọ ya na nwaanyị na nne na nna di ya nwere ike ịtọ ọchị mgbe ndị na-eme ihe egwuregwu ji ya eme ihe ọchị, ma, ọ naghị atọ onye ọ na-eme n’ezinụlọ ya ọchị. Rina, bụ́ nwaanyị bi n’India, kwuru, sị: “Nne di m nọ na-atụ ihe na-eme n’alụmdi na nwunye anyị ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụ di m ka m na-ewesakarị iwe n’ihi na enweghị m ike ịgwa nne ya otú obi dị m. O yiri ka ọ̀ na-esiri ya ike mgbe niile ikpebi ma ọ̀ bụ ya bụrụ ezigbo di ka ọ̀ bụ ya bụrụ ezigbo nwa.”
Olee ihe mere ụfọdụ nne na nna ji etinye aka ná ndụ ụmụ ha lụrụla di ma ọ bụ nwunye? Jeni, bụ́ onye e kwuru ihe o kwuru ná mmalite, kwuru otu ihe nwere ike ịkpata ya. O kwuru, sị: “O nwere ike isiri ha ike ịnọ na-ele n’anya ka onye na-akatebeghị ahụ́ nke na-enwebeghị ihe ọ hụrụ ná ndụ na-elekọtazi nwa ha nwoke ma ọ bụ nwa ha nwaanyị.” Dilip, bụ́ di Rina, gbakwụnyere ihe na nke ahụ. O kwuru, sị: “Nne na nna zụrụla ụmụ ha ma meere ha ọtụtụ ihe ná ndụ nwere ike iche na a na-ekewapụ ha n’ebe ụmụ ha nọ. O nwekwara ike ịbụ na ihe na-echegbu ha bụ na nwa ha enweghị amamihe ga-ezuru ya ime ka alụmdi na nwunye ya gaa nke ọma.”
Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ di na nwunye na-akpọ nne na nna ha ka ha tinye aka n’alụmdi na nwunye ha. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe mere Maịkel na Lin, bụ́ di na nwunye bi n’Ọstrelia. Maịkel kwuru, sị: “Lin si n’ezinụlọ na-emekọ nnọọ ihe ọnụ ma na-akọrọ ibe ha ihe niile. N’ihi ya, mgbe anyị lụchara, ọ na-agakwuru nna ya ka o nye ya ndụmọdụ n’ihe ndị dịịrị
nnọọ mụ na ya ikpebi. Nna ya maara nnọọ ihe ọ ga-agwa ya mee, ma ọ na-ewute m na ọ na-agakwuru ya kama ịbịakwute m!”O doro anya na ihe metụtara ndị ọgọ na nne di na nna di nwere ike ịkpata nsogbu n’alụmdi na nwunye. Ọ̀ dị otú ahụ na nke gị? Olee otú mmekọrịta gị na ndị mụrụ di ma ọ bụ nwunye gị dị, oleekwa otú mmekọrịta di ma ọ bụ nwunye gị na ndị mụrụ gị dị? Ka anyị tụlee nsogbu abụọ unu nwere ike inwe na ihe i nwere ike ime banyere ha.
NSOGBU NKE 1: O yiri ka di ma ọ bụ nwunye gị ọ̀ na-akpa ndị mụrụ ya nso gabiga ókè. Otu di bi na Spen nke aha ya bụ Luwis, kwuru, sị: “Nwunye m chere na ọ bụrụ na anyị ebighị ndị mụrụ ya nso, na ọ pụtara na ọ gbakụtara ha azụ.” O kwukwara, sị: “N’aka nke ọzọ, mgbe nwunye m mụrụ nwa anyị nwoke, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ndị mụrụ m na-abịa n’ụlọ anyị kwa ụbọchị, bụ́ nke mere ka nwunye m ghara ịna-ezu ike. Nke a mere ka anyị see okwu ugboro ugboro.”
Ihe bụ́ nsogbu: Mgbe Baịbụl na-akọwa ndokwa alụmdi na nwunye, o kwuru na ‘nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.’ (Jenesis 2:24) Ịbụ “otu anụ ahụ́” abụghị naanị ibikọta ọnụ. Ọ pụtara nnọọ na di na nwunye aghọọla ezinụlọ ọhụrụ—bụ́ ezinụlọ dị mkpa karịa ezinụlọ ndị ha si pụta. (1 Ndị Kọrịnt 11:3) N’ezie, ọ ka dịkwa mkpa ka ma di ma nwunye na-asọpụrụ ndị mụrụ ha, mgbe mgbe, nke ahụ na-apụtakwa na ha ga na-elebara ha anya. (Ndị Efesọs 6:2) Ya bụrụkwanụ na otú di ma ọ bụ nwunye gị si elebara ndị mụrụ ya anya na-eme ka ọ dị gị ka ò leghaara gị anya?
Ihe i nwere ike ime: Leruo ọnọdụ ahụ anya. Ọ̀ bụ eziokwu na di ma ọ bụ nwunye gị na-akpa ndị mụrụ ya nso gabiga ókè, ka ọ̀ bụ nnọọ na gị na ndị mụrụ gị adịghị ná mma otú ahụ ya na ndị mụrụ ya dị? Ya bụrụ otú ahụ, ụdị ezinụlọ i si ọ́ naghị emetụta otú i si na-ele okwu ahụ anya? Ọ̀ ga-abụ na ekworo so na-eme ka ị na-ele ihe anya otú ahụ i si na-ele ya?—Ilu 14:30; 1 Ndị Kọrịnt 13:4; Ndị Galeshia 5:26.
Ịza ajụjụ ndị ahụ ga-achọ ka i nyochaa onwe gị nke ọma ma gwa onwe gị eziokwu. Ma, ọ dị mkpa ka i mee otú ahụ. A sị kwuwe, ọ bụrụ na gị na di ma ọ bụ nwunye gị na-esekarị okwu n’ihi okwu metụtara ndị mụrụ unu, ihe unu nwere bụ nsogbu alụmdi na nwunye—ọ bụghị nsogbu ndị mụrụ unu.
Ọtụtụ nsogbu alụmdi na nwunye ndị mmadụ na-enwe na-abụ n’ihi na ọ dịghị di na nwunye na-ele ihe niile anya n’otu ụzọ. Ì nwere ike ịgbalị ile ihe anya otú di ma ọ bụ nwunye gị si ele ya? (Ndị Filipaị 2:4; 4:5) Nke ahụ bụ ihe otu nwoke bi na Meksiko nke aha ya bụ Edrian mere. O kwuru, sị: “A zụlitere nwunye m n’ezinụlọ na-adịghị mma, n’ihi ya, m na-ezere mụ na ndị ọgọ m imekọtachi ihe anya. M mechara jụ ịgakwuru ha maka ihe ọ bụla—ruo ọtụtụ afọ. Nke a kpatara nsogbu n’alụmdi na nwunye anyị n’ihi na nwunye m ka chọrọ ịnọ ezinụlọ ya nso, karịsịa nne ya.”
Ka oge na-aga, Edrian malitere ile ihe ahụ anya otú kwesịrị ekwesị. O kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na m maara na anyị na ndị mụrụ nwunye m ịkpakọ gabiga ókè na-eme ka nwunye m chewe echiche na-adịghị mma, ịgbakụtacha ha azụ nwekwara ike ịkpata nsogbu n’ezinụlọ anyị. Agbalịala m ịhụ na anyị na ndị ọgọ m mekọtawakwara ihe ruo otú anyị nwere ike.” *
MEGODỊNỤ IHE A: Gị na di ma ọ bụ nwunye gị dee ihe ndị unu chere kacha enye unu nsogbu banyere nne na nna unu. Ya bụrụ na ọ ga-ekwe unu mee, sinụ otú a malite ya, “Echere m na . . . ” Nyezienụ ibe unu ihe unu dere. Nọkọtanụ ọnụ kwurịta ihe onye nke ọ bụla n’ime unu chere unu nwere ike ime banyere ihe na-enye ibe unu nsogbu.
NSOGBU NKE 2: Ndị ọgọ gị ma ọ bụ nne di na nna di gị na-etinye aka mgbe niile n’alụmdi na nwunye unu, na-enye unu ndụmọdụ ndị unu na-arịọghị ha. Otu nwaanyị bi na Kazakstan nke aha ya bụ Nelya kwuru, sị: “Anyị na nne di m na nna di m biri afọ asaa malite mgbe anyị lụrụ. Anyị na ha na-ese okwu mgbe niile banyere otú anyị si na-azụ ụmụ anyị nakwa banyere ihe ndị
dị ka isi nri na idebe ụlọ ọcha. Agwara m di m na nne di m okwu banyere ya, ma ihe nke ahụ mere bụ naanị ịkpatakwu esemokwu!”Ihe bụ́ nsogbu: Mgbe ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ị nọzighị n’okpuru ndị mụrụ gị. Kama nke ahụ, Baịbụl kwuru na “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwaanyị,” ya bụ, nwunye ya. (1 Ndị Kọrịnt 11:3) N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka e kwuru na mbụ, ma di ma nwunye kwesịrị ịsọpụrụ ndị mụrụ ha. N’ezie, Ilu 23:22 gwara anyị, sị: “Gee nna nke mụrụ gị ntị, eledakwala nne gị anya naanị n’ihi na o mewo agadi.” Ma, ya bụrụkwanụ na ndị mụrụ gị—ma ọ bụ ndị mụrụ di ma ọ bụ nwunye gị—amanyewa aka n’alụmdi na nwunye unu ma nwawa ime ka unu mee ihe ha chọrọ?
Ihe unu nwere ike ime: Jirinụ obi ọmịiko gbalịa ghọta ihe ha bu n’obi na-eme ihe ahụ yiri ka ọ̀ bụ ịmanye aka n’alụmdi na nwunye unu. Rayan, bụ́ onye e kwuru ihe o kwuru ná mmalite isiokwu a, kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ihe dị ndị nne na nna mkpa bụ ịmara na ha ka dị mkpa ná ndụ ụmụ ha.” O nwere ike ịbụ na ha amaghị ụma na-etinye aka otú ahụ n’alụmdi na nwunye unu, e nwekwara ike idozi ya site n’iso ndụmọdụ a Baịbụl nyere bụ́, “na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya.” (Ndị Kọlọsi 3:13) Ma, ya bụrụkwanụ na ndị ọgọ gị ma ọ bụ nne di na nna di gị na-etinyekarị aka n’alụmdi na nwunye unu nke na ọ na-akpatara gị na di ma ọ bụ nwunye gị esemokwu?
Ụfọdụ di na nwunye amụtala ịkpara ndị mụrụ ha ókè kwesịrị ekwesị n’alụmdi na nwunye ha. Nke a apụtaghị na unu ga-enye ha iwu ihe ha ga-eme na ihe ha na-agaghị eme. * Mgbe mgbe, naanị ihe dị mkpa bụ ime ka o doo ha anya site n’omume gị na ọ bụ di gị ma ọ bụ nwunye gị kacha mkpa ná ndụ gị. Dị ka ihe atụ, otu nwoke na Japan nke aha ya bụ Masayuki, kwuru, sị: “Ya bụrụgodị na ndị mụrụ gị ekwuo echiche ha, ekwetala nnọọ ihe ha kwuru ozugbo. Cheta na unu na-amalite ezinụlọ ọhụrụ. N’ihi ya, burugodị ụzọ chọpụta ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị chere banyere ndụmọdụ ahụ.”
MEGODỊNỤ IHE A: Gị na di ma ọ bụ nwunye gị kwurịta otú aka ndị mụrụ unu na-etinye n’alụmdi na nwunye unu si na-akpatara unu esemokwu. Unu abụọ dee ókè unu ga-akpara ha na otú unu ga-esi hụ na unu mere ihe unu kwuru ma n’otu mgbe ahụ na-akwanyekwara ndị mụrụ unu ùgwù.
I nwere ike ibelata esemokwu n’etiti gị na di ma ọ bụ nwunye gị na ndị mụrụ unu site n’ịghọta ihe ndị mụrụ unu bu n’obi na ịghara ikwe ka nke ahụ na-esere gị na di ma ọ bụ nwunye gị okwu. Jeni kwuru banyere nke a, sị: “Mgbe ụfọdụ, mụ na di m na-akpasu onwe anyị iwe mgbe anyị na-ekwu banyere ndị mụrụ anyị, anyị hụkwara nnọọ na anyị nwere ike ịkpasu onwe anyị iwe ma ọ bụrụ na anyị ana-ekwu banyere mmejọ ndị mụrụ anyị. Ma, anyị mechara mụta ịkwụsị iji mmejọ nke ndị mụrụ anyị na-akpasu ibe anyị iwe, kama nke ahụ, na-elekwasị anya ná nsogbu e nwere mgbe ahụ. N’ihi ya, mụ na di m adịkwuola ná mma.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Aha a kpọrọ ha abụghị ezigbo aha ha.
^ par. 14 O doro anya na ọ bụrụ na nne na nna na-akpa àgwà jọrọ oké njọ—karịsịa ma ọ bụrụ na ha nọgidere na-akpa ya n’enweghị nchegharị—o nwere ike ime ka ha na ụmụ ha ghara ịdịkwa ná mma, meekwa ka ha gbawara ha ọsọ.—1 Ndị Kọrịnt 5:11.
^ par. 19 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka unu na ndị ọgọ gị ma ọ bụ nne di gị na nna di gị kwurịta ihe dị unu n’obi n’ezoghị ọnụ. Ya bụrụ otú ahụ, jirinụ nkwanye ùgwù na ịdị nwayọọ mee nke a.—Ilu 15:1; Ndị Efesọs 4:2; Ndị Kọlọsi 3:12.
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .
▪ Olee àgwà ọma ndị ọgọ m ma ọ bụ nne di na nna di m nwere?
▪ Olee otú m nwere ike isi na-akwanyere nne na nna m ùgwù ma ghara ileghara di ma ọ bụ nwunye m anya?