Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile?

Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile?

Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile?

Ihe ndị mmadụ na-azakarị:

▪ “Eenụ, Jizọs bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile.”

▪ “Jizọs bụ Chineke nke bịara n’ụdị mmadụ.”

Olee ihe Jizọs kwuru?

▪ “Ọ bụrụ na unu hụrụ m n’anya, unu ga-aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna m, n’ihi na Nna m ka m ukwuu.” (Jọn 14:28) Jizọs kwuru na ya na Nna ya ahaghị.

▪ “Ana m arịgokwuru Nna m na Nna unu nakwa Chineke m na Chineke unu.” (Jọn 20:17) Jizọs ekwughị na ya bụ Chineke, kama o kwuru na Chineke bụ Onye ọzọ.

▪ “Ihe m kwuru esighị n’echiche m, kama ọ bụ Nna m bụ́ onye zitere m nyere m iwu ihe m ga-akọ na ihe m ga-ekwu.” (Jọn 12:49) Ihe Jizọs kụziri esighị n’uche nke ya, kama o si n’uche Nna ya.

JIZỌS kwuru na ya bụ Ọkpara Chineke, o kwughị na ya bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. Ọ bụrụ na Jizọs bụ Chineke, ònye ka o kpekuru ekpere mgbe ọ nọ n’ụwa? (Matiu 14:23; 26:26-29) N’eziokwu, anyị ekwesịghị iche na Jizọs ma ụma na-eme ka ọ̀ na-agwa onye ọzọ okwu mgbe ọ na-agwa onwe ya okwu.

Mgbe mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs gwara Jizọs ka o nye ha ọkwá pụrụ iche n’Alaeze ya, ọ gwara ha, sị: “Ọ bụghị m na-eme ka a nọdụ n’aka nri m na n’aka ekpe m, kama ọ dịịrị ndị Nna m kwadebeere ya.” (Matiu 20:23) Jizọs ọ̀ ghaara ha ụgha mgbe ọ gwara ha na ya enweghị ikike imere ha ihe ha rịọrọ ya? Mbanụ! Kama nke ahụ, o ji umeala n’obi kwuo na ọ bụ naanị Chineke nwere ikike ikpebi ihe ndị dị otú ahụ. Jizọs kwudịrị na e nwere ihe ụfọdụ yanwa na ndị mmụọ ozi na-amaghị, kama naanị Nna ya maara ha.—Mak 13:32.

Ọ̀ bụ naanị mgbe ahụ Jizọs nọ n’ụwa ka Chineke ka ya ukwuu? Mba. Ọbụnadị mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, Baịbụl kwuru na ọ nọ n’okpuru Chineke. Pọl onyeozi chetaara anyị na “Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrịnt 11:3) Baịbụl kwuru na n’ọdịnihu, “mgbe a ga-edoworị ihe niile n’okpuru ya, mgbe ahụ, Ọkpara ahụ n’onwe ya ga-edokwa onwe ya n’okpuru Onye ahụ nke doro ihe niile n’okpuru ya, ka Chineke wee bụrụ ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.”—1 Ndị Kọrịnt 15:28.

O doro anya na Jizọs abụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kpọọ Nna ya “Chineke m.”—Mkpughe 3:2, 12; 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ya, gụọ peeji nke 201 ruo nke 204 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 7]

Jizọs kwuru na e nwere ihe ụfọdụ naanị Nna ya maara, bụ́ ndị ya na ndị mmụọ ozi na-amaghị