Gosi Na Ị Hụrụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị n’Anya Ma Na-akwanyere Ya Ùgwù Site n’Ịchịkwa Ire Gị
Gosi Na Ị Hụrụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị n’Anya Ma Na-akwanyere Ya Ùgwù Site n’Ịchịkwa Ire Gị
“Ka onye ọ bụla n’ime unu n’otu n’otu sikwa otú ahụ hụ nwunye ya n’anya dị ka o si hụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị inwe nkwanye ùgwù miri emi maka di ya.”—NDỊ EFESỌS 5:33.
1, 2. Olee ajụjụ dị mkpa ndị nile lụrụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịjụ onwe ha, n’ihi gịnịkwa?
KA E were ya na i nwetara onyinye a fụchiri afụchi nke e dere n’elu ya, sị: “Jizie Ya Ejizie.” Olee otú ị ga-esi jie onyinye ahụ? N’ezie, ị ga-akpachapụ anya ka ọ ghara imebi. Olee banyere onyinye nke alụmdi na nwunye?
2 Naomi, bụ́ onye Izrel nke di ya nwụrụ, gwara Ọpa na Rut, sị: “Jehova mee ka unu chọta izu ike, nwanyị ọ bụla n’ụlọ di ya.” (Rut 1:3-9) Bible kwuru banyere ezigbo nwunye, sị: “Ụlọ na akụ̀ bụ ihe nketa ndị bụ́ nna na-ahapụ: ma Jehova ka nwunye nke nwere uche sitere n’aka.” (Ilu 19:14) Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, i kwesịrị iwere di ma ọ bụ nwunye gị dị ka onyinye sitere n’aka Chineke. Olee otú i si eji onyinye a Chineke nyere gị?
3. Olee ndụmọdụ Pọl nke ndị di na nwunye kwesịrị irubere isi?
3 Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst narị afọ mbụ akwụkwọ, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu n’otu n’otu sikwa otú ahụ hụ nwunye ya n’anya dị ka o si hụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị inwe nkwanye ùgwù miri emi maka di ya.” (Ndị Efesọs 5:33) Ka anyị hụ otú ndị di na nwunye nwere ike isi rube isi na ndụmọdụ a ma a bịa n’ihe banyere okwu ọnụ ha.
Kpachara Anya Banyere “Ihe Ọjọọ Siri Ike Nchịkwa”
4. Olee otú ire pụrụ isi gwọọ mmadụ ma ọ bụ merụọ mmadụ ahụ́?
4 Onye so dee Bible bụ́ Jems kwuru na ire bụ “ihe ọjọọ siri ike nchịkwa” nke “jupụtara ná nsí na-eweta ọnwụ.” (Jems 3:8) Jems maara eziokwu a dị mkpa: Ire a na-achịkwaghị achịkwa na-emebi ihe. O doro anya na ọ maara ilu Bible nke kwuru na okwu a na-echeghị echiche kwuo dị ka “ndụpu nke mma agha.” N’aka nke ọzọ, otu ilu ahụ kwuru na “ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.” (Ilu 12:18) N’ezie, okwu ọnụ na-akpa ike dị egwu. O nwere ike imerụ mmadụ ahụ́ ma ọ bụ gwọọ mmadụ. Olee otú okwu ọnụ gị si emetụta di ma ọ bụ nwunye gị? Ọ bụrụ na ị jụọ di ma ọ bụ nwunye gị ajụjụ a, olee ihe ọ ga-aza gị?
5, 6. Olee ihe ndị na-eme ka o siere ụfọdụ ndị ike ịchịkwa ire ha?
5 Ọ bụrụ na okwu ọjọọ ejirila nke nta nke nta bata n’alụmdi na nwunye gị, i nwere ike ịgbanwe ọnọdụ ahụ. Otú ọ dị, ọ ga-achọ mgbalị. N’ihi gịnị? Otu ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na anyị na-alụso anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè ọgụ. Mmehie anyị ketara eketa na-emetụta ihe anyị na-eche banyere ibe anyị na otú anyị si agwa ibe anyị okwu. Jems dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, onye a bụ nwoke zuru okè, nke nwere ike ịchịkwa ahụ́ ya dum.”—Jems 3:2.
6 E wezụga ezughị okè mmadụ, ụdị ezinụlọ a zụlitere mmadụ na ya so eme ka mmadụ ghara ịchịkwa ire ya. A zụlitere ụfọdụ n’ezinụlọ ebe nne na nna bụ “ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla, . . . ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike.” (2 Timoti 3:1-3) Mgbe mgbe, ụmụaka ndị a zụlitere n’ebe a na-akpa àgwà ndị dị otú ahụ na-amalite ịkpa àgwà ndị ahụ mgbe ha tolitere. N’ezie, anyị ekwesịghị iji ezughị okè ma ọ bụ ọzụzụ na-adịghị mma e nyere anyị mere ihe ngọpụ iji na-ekwu okwu ọjọọ. Ma, ịmata ihe ndị a na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere o ji esiri nnọọ ụfọdụ ndị ike ịchịkwa ire ha iji ghara iji ya kwuo okwu ọjọọ.
‘Wepụnụ Okwu Azụ’
7. Gịnị ka Pita bu n’obi mgbe ọ dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha ‘wepụ ụdị ikwu okwu azụ nile’?
7 N’agbanyeghị ihe mere di na nwunye ji agwa ibe ha okwu ọjọọ, ikwu okwu ọjọọ pụrụ igosi enweghị ịhụnanya na nkwanye ùgwù n’ebe ibe ha nọ. E nwere ezi ihe mere Pita ji dụọ Ndị Kraịst ọdụ ka ha ‘wepụ ụdị ikwu okwu azụ nile.’ (1 Pita 2:1) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “okwu azụ” pụtara “okwu mkparị.” Ọ pụtara ‘ịgwa ndị mmadụ okwu na-adụ adụ n’ahụ́.’ Nke ahụ bụ nnọọ ihe ire a na-achịkwaghị achịkwa na-eme!
8, 9. Gịnị pụrụ isi n’okwu mkparị pụta, n’ihi gịnịkwa ka di na nwunye kwesịrị iji zere ịgwa ya ibe ha?
8 Okwu mkparị pụrụ iyi obere ihe, ma chee echiche ihe na-eme mgbe mmadụ gwara di ma ọ bụ nwunye ya okwu ọjọọ. Mmadụ ịkpọ di ma ọ bụ nwunye ya onye iberibe, onye umengwụ ma ọ bụ onye na-eche nanị banyere onwe ya pụtara na a pụrụ iji otu okwu—nke bụ́kwanụ okwu mkparị—kọwaa àgwà ya nile. N’ezie, nke a dị nnọọ njọ. Gịnị banyere mmadụ itinye okwu ya nnu na ose mgbe ọ na-ekwu banyere ebe ndị di ma ọ bụ nwunye ya na-adịghị emezi emezi? Ọ̀ bụ na okwu ndị dị ka “Ọ dịghị mgbe ị na-eji oge eme ihe” ma ọ bụ “Ọ dịtụghị mgbe ị na-ege m ntị” abụghị nnọọ itinye ihe nnu na ose? Okwu ndị dị otú ahụ ga-emerịrị ka onye a gwara ha zọwa onwe ya. Nke ahụ pụkwaranụ ịkpata arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ.—Jems 3:5.
9 Mkparịta ụka okwu mkparị jupụtara na ya na-akpatara di na nwunye esemokwu, nke a pụkwara imebi ihe. Ilu 25:24 na-ekwu, sị: “Ọ dị mma ịnọkwasị na nkuku elu ụlọ, karịa ịnọnyere nwanyị na-ese okwu n’ụlọ buru ibu.” N’ezie, a pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere di nke na-ese okwu. Ka oge na-aga, okwu ọjọọ ndị mmadụ na-agwa di ma ọ bụ nwunye ya na-eji nwayọọ nwayọọ emebi mmekọrịta dị n’etiti ha, ikekwe mee ka di ma ọ bụ nwunye chewe na a hụghị ya n’anya, ma ọ bụkwanụ na ya erughị eru ka a hụ ya n’anya. O doro anya na ọ dị mkpa ka a na-achịkwa ire achịkwa. Ma, olee otú anyị nwere ike isi mee nke a?
‘Chịkwaa Ire Gị’
10. N’ihi gị ka o ji dị mkpa ịchịkwa ire achịkwa?
10 Jems 3:8 na-ekwu, sị: “Ire, ọ dịghị otu n’ime ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ịzụta ya.” Ka o sina dị, dị nnọọ ka onye na-agba ịnyịnya na-eji eriri achịkwa ya, otú ahụ ka anyị kwesịrị ime ike anyị nile iji chịkwaa ire anyị. “Ọ bụrụ na o yiri onye ọ bụla ka ya bụ onye nwere ụdị ofufe nke ya ma ọ dịghị achịkwa ire ya, kama na-aga n’ihu na-aghọgbu obi nke ya, ụdị ofufe nke onye a bụ ihe efu.” (Jems 1:26; 3:2, 3) Okwu ndị a na-egosi na otú i si eji ire gị ekwu okwu dị nnọọ mkpa. Ọ bụghị nanị mmekọrịta nke gị na di ma ọ bụ nwunye gị ka ọ na-emetụta; ọ na-emetụta mmekọrịta gị na Jehova Chineke.—1 Pita 3:7.
11. Olee otú mmadụ nwere ike isi gbochie obere nghọtahie ịghọ nnukwu esemokwu?
11 Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịrịba ama otú i si agwa di ma ọ bụ nwunye gị okwu. Ọ bụrụ na obi ajọọ di ma ọ bụ nwunye gị njọ, gbalịa imeda ya obi. Tụlee otu ihe mere n’etiti Aịzik na nwunye ya bụ́ Ribeka, bụ́ nke e dekọrọ na Jenesis 27:46–28:4. Ebe ahụ kwuru, sị: “Ribeka wee si Aịzik, Ike ndụ m agwụsịwo m site n’ihu ụmụ ndị inyom Het: ọ bụrụ na Jekọb lụrụ nwunye sitere n’ụmụ ndị inyom Het, dị ka ndị a, bụ́ site n’ụmụ ndị inyom ala nke a, uru gịnị ka ndụ baara m?” Ọ dịghị ihe gosiri na Aịzik ji iwe zaghachi Ribeka. Kama nke ahụ, o zipụrụ nwa ha nwoke bụ́ Jekọb ka ọ gaa lụọ nwanyị na-atụ egwu Chineke bụ́ onye na-eyighị ka ọ̀ ga-emewa Ribeka obi. Ka e were ya na di na nwunye ghọtahiere onwe ha. Ilekwasị anya n’ihe kpatara nghọtahie ahụ kama ịtawa di ma ọ bụ nwunye gị ụta ga-eme ka obere nghọtahie ghara ịghọ nnukwu esemokwu. Dị ka ihe atụ, kama ikwu, sị, “Ọ dịghị mgbe ị na-ewepụta oge ka mụ na gị nọọ!” i nwere ike ikwu, sị, “Ọ ga-amasị m nnọọ ma a sị na anyị ga na-ewepụtatụkwu oge iji nọrịa.” Lekwasị anya n’ihe bụ́ nsogbu, ọ bụghị nanị ịtawa di ma ọ bụ nwunye gị ụta. Zere ịchọwa onye ikpe mara. Ndị Rom 14:19 na-ekwu, sị: “Na-achụso ihe ndị na-akpata udo na ihe ndị na-ewuli ibe anyị elu.”
Wepụnụ ‘Obi Ilu, Iwe, na Ọnụma’
12. Iji chịkwaa ire anyị, gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-ekpe ekpere maka ya, n’ihi gịnịkwa?
12 Ịchịkwa ire anyị akwụsịghị n’ịkpachapụ anya banyere ihe anyị na-ekwu. A sị ka e kwuwe, okwu ọnụ anyị na-egosi ihe anyị na-eche n’obi. Jizọs kwuru, sị: “Ezi mmadụ na-ewepụta ezi ihe site n’ezi akụ̀ nke obi ya, ma ajọ mmadụ na-ewepụta ajọ ihe site n’ajọ akụ̀ ya; n’ihi na ọnụ ya na-ekwu okwu site n’ihe jupụtara n’obi ya.” (Luk 6:45) N’ihi ya, iji chịkwaa ire gị, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ikpe ekpere dị ka Devid, sị: “Keere m obi dị ọcha, Chineke; meekwa ka mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ n’ime m.”—Abụ Ọma 51:10.
13. Olee otú obi ilu, iwe na ọnụma nwere ike isi mee ka mmadụ kwuo okwu mkparị?
13 Pọl gbara ndị Efesọs ume ka ha zere ọ bụghị nanị okwu ọjọọ, kamakwa ihe ndị na-eme mmadụ ikwu ya. O dere, sị: “Ka e wepụ obi ilu na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị n’ebe unu nọ tinyere ihe ọjọọ nile.” (Ndị Efesọs 4:31) Rịba ama na Pọl buru ụzọ kwuo banyere “obi ilu na iwe na ọnụma” tupu ya ekwuo banyere “iti mkpu na okwu mkparị.” Ọ bụ oké iwe mmadụ bu n’obi na-akpali ya ikwu okwu ọjọọ. N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Àna m ebu iwe na ọnụma n’obi? Àna m “enwe ọnụma hie nne”?’ (Ilu 29:22) Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, kpegara Chineke ekpere ka o nyere gị aka ịkwụsị ya ma mee ka ị na-ejide onwe gị, ka i wee ghara iji iwe ọkụ kwuo okwu. Abụ Ọma 4:4 na-ekwu, sị: “Maanụ jijiji, emehiekwala: sịnụ otú a n’obi unu n’elu ihe ndina unu, wee dere duu.” Ọ bụrụ na iwe gị achọọ ịdị ọkụ, ya adịkwa gị ka ị gaghị ejideli onwe gị, jiri ndụmọdụ dị n’Ilu 17:14 mee ihe, nke bụ́: “Tupu ịlụ ọgụ esie ike hapụ ya.” Sigodị ebe ahụ pụọ ruo mgbe obi dajụrụ gị.
14. Olee otú ibu iwe n’obi pụrụ isi metụta alụmdi na nwunye?
14 Ọ naghị adị mfe ịchịkwa iwe na ọnụma, karịsịa ma ọ bụrụ na ihe kpatara ya bụ ihe Pọl kpọrọ “obi ilu.” A kọwara okwu Grik Pọl ji mee ihe dị ka “ọnụma nke na-eme ka mmadụ ghara ịchọ ka e kpezie” na ‘obi ilu nke na-eme ka mmadụ na-agụkọ ihe ọjọọ e mere ya.’ Mgbe ụfọdụ, iro di na nwunye buuru ibe ha n’obi na-egbochi ha ikwurịta okwu, ọ pụkwara ịdịgide otú ahụ ruo ogologo oge. Ịghara idozi esemokwu nke ọma pụrụ ime ka di na nwunye na-elelị ibe ha. Ma ọ baghị uru di na nwunye iburu ibe ha iwe n’obi n’ihi ihe ọjọọ gara aga ha mere ibe ha. Ihe mere eme emeela, anyị enweghị ike imegharị ya. Anyị kwesịrị ichefu ihe ọjọọ di ma ọ bụ nwunye anyị mere anyị mgbe anyị gbaghachaara ya. Ịhụnanya ‘adịghị agụkọ ihe ọjọọ.’—1 Ndị Kọrint 13:4, 5.
15. Gịnị ga-enyere ndị okwu ọjọọ marala ahụ́ aka ịgbanwe otú ha si ekwu okwu?
Ndị Efesọs 4:29, nke bụ́: “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta.” Nke a ga-achọ ka i ‘yipụ ụdị mmadụ ochie ahụ na omume ya, ma yikwasị onwe gị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ, bụ́ nke a na-esite n’ezi ihe ọmụma na-eme ka ọ dị ọhụrụ dị ka onyinyo nke Onye ahụ kere ya si dị.’—Ndị Kọlọsị 3:9, 10.
15 Gịnị ma ọ bụrụ na a na-ekwukarị okwu ọjọọ n’ezinụlọ ebe a zụlitere gị, ya abụrụkwa na ọ maala gị ahụ́? I nwere ike ịkwụsị ya. Ọ dịla ihe ndị ọzọ ị na-emebu i kpebirila na o nweghị ihe ga-eme ka i mee ha ọzọ. Olee mkpebi ị ga-eme n’ihe banyere otú i si ekwu okwu? Ị̀ ga-ekpebi ịghara ikwu okwu mkparị? I kwesịrị ikpebi ime ihe ahụ e kwuru náDi na Nwunye Aghaghị Ịdị Na-Agbarịta “Izu Nzuzo”
16. N’ihi gịnị ka di na nwunye ịkwụsị ighe ibe ha ọnụ ji emebi alụmdi na nwunye?
16 Di na nwunye ịkwụsị ighe onwe ha ọnụ enweghị ezi ihe ọ na-arụpụta, ọ pụkwara imebiri ha ihe. Nke a anaghị abụ mgbe nile iji taa di ma ọ bụ nwunye mmadụ ahụhụ, n’ihi na ihe na-akpata ya mgbe ụfọdụ bụ amaghị ihe a ga-eme na ịda mbà n’obi. N’agbanyeghị nke ahụ, di na nwunye ịkwụsị ighe onwe ha ọnụ na-eme ka esemokwu ka njọ. Otu nwanyị kwuru, sị: “Mgbe anyị maliteghachiri ighe onwe anyị ọnụ, ọ dịghị onye na-ekwute ihe na-esere anyị ka anyị nwee ike kpezie.”
17. Gịnị ka Ndị Kraịst nwere nsogbu n’alụmdi na nwunye ha kwesịrị ime?
17 Mgbe di na nwunye na-esesa ibe ha okwu, ọ dịghị otú ihe ga-esi gazie agazie. Ilu 15:22 na-ekwu, sị: “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị: ma n’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ ka ha na-eguzosi ike.” Ọ dị gị na di ma ọ bụ nwunye gị mkpa ịnọdụ ala ma kwurịta nsogbu ahụ. Mee ike gị nile iji obi ọcha gee di ma ọ bụ nwunye gị ntị. Ọ bụrụ na ime otú ahụ eyie ihe na-agaghị ekwe omume, kọọrọnụ ya ndị okenye ọgbakọ unu. Ha maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma ma nwee ahụmahụ n’otú e si etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Ndị ikom dị otú ahụ dị “ka ebe izonahụ ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo.”—Aịsaịa 32:2.
Ị Pụrụ Imeri n’Ọgụ Ahụ
18. Olee ọgụ a kọwara ná Ndị Rom 7:18-23?
18 Ịchịkwa ire anyị adịghị mfe. Otú ahụ ka ọ dịkwa ịchịkwa àgwà anyị. Pọl kọwara ihe isi ike o nwere, sị: “Amaara m na n’ime m, ya bụ, n’anụ ahụ́ m, ọ dịghị ezi ihe bi n’ime ya; n’ihi na enwere m ikike ịchọ ime ihe, ma enweghị m ikike ịrụpụta ihe dị mma. N’ihi na ezi ihe nke m na-achọ ka m na-adịghị eme, kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị ka m na-eme. Ma, ọ bụrụ na ihe m na-achọghị ka m na-eme, onye ahụ nke na-arụpụta ya abụkwaghị m, kama ọ bụ mmehie ahụ nke bi n’ime m.” N’ihi ‘iwu nke mmehie nke dị n’ahụ́ anyị,’ anyị na-achọkarị iji ire anyị na akụkụ ahụ́ anyị ndị ọzọ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. (Ndị Rom 7:18-23) Otú ọ dị, anyị aghaghị ịlụso nsogbu a ọgụ—anyị ga-emerikwa ya site n’enyemaka Chineke.
19, 20. Olee otú ihe nlereanya Jizọs pụrụ isi nyere ndị di na nwunye aka ịchịkwa ire ha?
19 Di na nwunye hụrụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù ekwesịghị ịgwa ibe ha okwu n’ebughị ụzọ chee ya echee, ha ekwesịghịkwa ịgwa ibe ha okwu ọjọọ. Chee echiche banyere ihe nlereanya Jizọs Kraịst setịpụrụ na nke a. Ọ dịtụghị mgbe Jizọs kparịrị ndị na-eso ụzọ ya. Ọbụna n’abalị ikpeazụ nke ndụ ya n’elu ala, mgbe ndị na-eso ụzọ ya na-arụrịta ụka banyere onye n’ime ha nke kasị ndị ọzọ ukwuu, Ọkpara Chineke abaraghị ha mba. (Luk 22:24-27) Bible dụrụ ọdụ, sị: “Ndị bụ́ di, nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst ahụ hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.”—Ndị Efesọs 5:25.
20 Ma, gịnị banyere nwunye? O “kwesịrị inwe nkwanye ùgwù miri emi maka di ya.” (Ndị Efesọs 5:33) Nwanyị nke na-akwanyere di ya ùgwù, ọ̀ ga-abara ya mba, na-akparị ya? Pọl dere, sị: “Achọrọ m ka unu mara na isi nke nwoke ọ bụla bụ Kraịst ahụ; n’aka nke ọzọ isi nke nwanyị bụ nwoke; n’aka nke ọzọ isi nke Kraịst ahụ bụ Chineke.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Ndị bụ́ nwunye ga-edo onwe ha n’okpuru di ha dị ka Kraịst na-edo onwe ya n’okpuru Chineke. (Ndị Kọlọsi 3:18) Ọ bụ ezie na ọ dịghị mmadụ na-ezughị okè nke nwere ike iṅomi Jizọs n’ụzọ zuru okè, ndị di na nwunye ịgbalị ‘ịgbasochi nzọụkwụ ya anya’ ga-enyere ha aka imeri n’ọgụ ha na-alụso ikwu okwu ọjọọ.—1 Pita 2:21.
Gịnị Ka Ị Mụtara?
• Olee otú ire a na-achịkwaghị achịkwa pụrụ isi mebie alụmdi na nwunye?
• N’ihi gịnị ka o ji esi ike ịchịkwa ire?
• Gịnị ga-enyere anyị aka ịchịkwa ire anyị?
• Gịnị ka i kwesịrị ime mgbe i nwere nsogbu n’alụmdi na nwunye gị?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 24]
Ndị okenye na-eji Bible enyere di na nwunye aka