Iwu Bible Ọ̀ Dị Gị Mkpa n’Ihe Nile?
Iwu Bible Ọ̀ Dị Gị Mkpa n’Ihe Nile?
MGBE ị bụ nwata, eleghị anya ndị mụrụ gị nyere gị ọtụtụ iwu. Ka ị na-etolite, ị bịara ghọta na ha bu ọdịmma gị n’obi. Dị ka onye toworo eto, eleghị anya ị ka na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị ha kụnyere n’ime gị, ọ bụ ezie na ị nọghịzi n’okpuru ha.
Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova, na-enye anyị ọtụtụ iwu ndị a kapịrị ọnụ site n’Okwu ya, bụ́ Bible. Dị ka ihe atụ, ọ machibidoro ikpere arụsị, ịkwa iko, ịkwa iko nke ndị di ma ọ bụ nwunye, na izu ohi. (Ọpụpụ 20:1-17; Ọrụ 15:28, 29) Ka anyị ‘na-etolite n’ụzọ ime mmụọ n’ihe nile,’ anyị na-abịa ghọta na Jehova bu ọdịmma anyị kasịnụ n’obi nakwa na iwu ya adịghị amachibido anyị gabiga ókè.—Ndị Efesọs 4:15; Aịsaịa 48:17, 18; 54:13.
Otú ọ dị, e nwere ọtụtụ ọnọdụ ebe a na-enweghị iwu a kapịrị ọnụ. N’ihi ya, ụfọdụ ndị na-eche na ọ bụrụ na e nweghị iwu Bible a kapịrị ọnụ, ha nweere onwe ha ime otú masịrị ha. Ha na-ekwu na ọ bụrụ na Chineke chere na ọ dị mkpa, ọ gaara ekwu uche ya site n’inye iwu a kapịrị ọnụ.
Ndị si otú a eche echiche na-emekarị mkpebi ndị ha na-emecha kwaa ụta banyere ha. Ha adịghị aghọta na Bible nwere ọ bụghị nanị iwu kamakwa ihe ndị na-egosipụta ụzọ Chineke si eche echiche. Ka anyị na-amụ Bible ma na-amata ụzọ Jehova si ele ihe anya, anyị na-abịa nwee akọ na uche e ji Bible zụọ, a na-enyekwara anyị aka ime nhọrọ ndị na-egosipụta ụzọ ya. Mgbe anyị mere otú ahụ, anyị na-eme ka obi ya ṅụrịa ma na-enweta abamuru ndị na-esi n’ime mkpebi ndị amamihe dị na ha apụta.—Ndị Efesọs 5:1.
Ihe Atụ Bible Ndị Pụtara Ìhè
Mgbe anyị tụlere ihe ndekọ Bible banyere ndị ohu Chineke n’oge ochie, anyị na-ahụ ọnọdụ ebe ndị ha tụlere echiche Jehova ọbụna mgbe a na-enweghị iwu a kapịrị ọnụ. Tụlee ihe banyere Josef. Mgbe nwunye Pọtịfa nọ na-ara ya ụra iso ya mee omume rụrụ arụ, e nweghị iwu e dere n’ike mmụọ nsọ Chineke megide ịkwa iko. N’agbanyeghị nke ahụ, ọbụna mgbe a na-enweghị iwu a kapịrị ọnụ, Josef ghọtara na ịkwa iko bụ mmehie ọ bụghị nanị megide akọ na uche ya kamakwa “megide Chineke.” (Jenesis 39:9) Ihe àmà na-egosi na Josef ghọtara na ịkwa iko megidere echiche na uche Chineke, dị ka e kwupụtara ya n’Iden.—Jenesis 2:24.
Tụlee ihe atụ ọzọ. N’Ọrụ 16:3, anyị na-achọpụta na tupu ya akpọrọ Timoti gaa njem ndị o mere n’ozi Ndị Kraịst, Pọl biri ya úgwù. Ma, n’amaokwu nke 4, anyị na-agụ na Pọl na Timoti mesịrị na-agabiga n’obodo dị iche iche na-enye ha “iwu ndị ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem kpebiworo.” Ihe so n’iwu ndị a bụ mkpebi e mere na iwu ejighịzi Ndị Kraịst ịbụ ndị e biri úgwù! (Ọrụ 15:5, 6, 28, 29) N’ihi gịnị ka Pọl ji chee na ọ dị mkpa ka e bie Timoti úgwù? Ọ bụ “n’ihi ndị Juu nọ n’ebe ndị ahụ, n’ihi na mmadụ nile maara na nna [Timoti] bụ onye Grik.” Pọl achọghị ime ihe ga-akpasu ndị ọzọ iwe ma ọ bụ mee ka ha sụọ ngọngọ n’ụzọ na-enweghị isi. Ọ chọrọ ka Ndị Kraịst “na-eme ka akọ na uche mmadụ ọ bụla nakwere [ha] n’anya Chineke.”—2 Ndị Kọrint 4:2; 1 Ndị Kọrint 9:19-23.
E ji isi otú a eche echiche mara Pọl na Timoti. Gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Ndị Rom 14:15, 20, 21 na 1 Ndị Kọrint 8:9-13; 10:23-33 ma hụ otú Pọl si gosi nchegbu miri emi maka ọdịmma ime mmụọ nke ndị ọzọ, karịsịa ndị pụrụ ịsụ ngọngọ n’ihi ihe ndị na-adịghị njọ n’ezie ma e nyochawa ha. Pọl dekwara banyere Timoti, sị: “Enweghị m onye ọzọ nke ọchịchọ obi ya dị ka nke ya bụ́ onye ga-elekọta ihe ndị metụtara unu nke ọma. N’ihi na ndị ọzọ nile na-achọ ọdịmma nke onwe ha, ọ bụghị ndị nke Kraịst Jizọs. Ma unu maara ihe àmà o nyere banyere onwe ya, na dị ka nwata ya na nna ya nọ, o so m bụrụ ohu n’ime ka ozi ọma na-aga n’ihu.” (Ndị Filipaị 2:20-22) Lee ihe nlereanya dị mma ndị ikom abụọ a bụ́ Ndị Kraịst setịpụụrụ anyị taa! Kama ime ihe ha chọrọ ma ọ bụ ihe na-amasị ha mgbe a na-enweghị iwu Chineke a kapịrị ọnụ, ha ṅomiri ịhụnanya Jehova na Ọkpara ya site n’iche echiche otú mkpebi ha pụrụ isi metụta ọnọdụ ime mmụọ nke ndị ọzọ.
Tụlee ihe banyere Jizọs Kraịst, bụ́ onye nlereanya anyị bụ́ isi. N’Ozizi Elu Ugwu ya, ọ kọwara n’ụzọ doro anya na onye ghọtara ihe mere e ji nye iwu Chineke ga-erubere ha isi ọbụna mgbe ha na-akapịghị ihe ụfọdụ ọnụ. (Matiu 5:21, 22, 27, 28) Jizọs, Pọl, Timoti na Josef adịghị nke chere na ọ bụrụ na e nweghị iwu Chineke a kapịrị ọnụ, mmadụ pụrụ ime ihe masịrị ya. N’ime ihe kwekọrọ n’ụzọ Chineke si eche echiche, ndị ikom a biri ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe Jizọs kwuru na ha bụ iwu abụọ kachasịnụ—mmadụ ịhụ Chineke na mmadụ ibe ya n’anya.—Matiu 22:36-40.
Gịnị Banyere Ndị Kraịst Taa?
O doro anya na anyị ekwesịghị ile Bible anya otú e si ele akwụkwọ iwu—na-atụ anya ka a kapịa ibu ọrụ nile ọnụ. Anyị na-eme ka obi Jehova ṅụrịa nke ukwuu mgbe anyị na-ahọrọ ime ihe ndị na-egosipụta ụzọ o si eche echiche, ọbụna mgbe a na-enweghị iwu a kapịrị ọnụ ịchịkwa ihe anyị na-eme. Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, kama ịchọ ka a na-agwa anyị mgbe nile ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme, anyị pụrụ ‘ịghọta ihe uche Jehova bụ.’ (Ndị Efesọs 5:17; Ndị Rom 12:2) N’ihi gịnị ka nke a ji eme ka obi Jehova ṅụrịa? Ọ bụ n’ihi na ọ na-egosi na anyị nwere mmasị n’ime ihe na-atọ ya ụtọ karịa ka anyị nwere n’ime ihe ndị na-amasị anyị na inweta ihe ndị ruuru anyị. Ọ na-egosikwa na anyị nwere ekele maka ịhụnanya ya ruo n’ókè nke na anyị chọrọ iṅomi ya, na-eme ka ịhụnanya dị otú ahụ bụrụ ihe na-akpali anyị. (Ilu 23:15; 27:11) Tụkwasị na nke ahụ, ime ihe dabeere n’ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ na-eso eme ka e nwee ahụ́ ike ime mmụọ nakwa ọtụtụ mgbe, nke anụ ahụ́.
Ka anyị hụ otú anyị pụrụ isi tinye ụkpụrụ ndị a n’ọrụ n’ihe ndị dịịrị onwe onye.
Nhọrọ Ntụrụndụ
Tụlee ihe banyere nwa okorobịa nke chọrọ ịzụ kaseti egwú. Ihe ọ nụworo na kaseti ahụ na-adọrọ nnọọ mmasị, ma o nwere nchegbu n’ihi na mkpo ya na-egosi na okwu egwú ahụ na-akpali agụụ mmekọahụ ma rụọ arụọ. Mgbe ahụ ya achọpụtakwa na ihe ka ukwuu n’egwú onye egwú ahụ gụrụ na-ada iwe iwe na ike ike. Dị ka onye hụrụ Jehova n’anya, nwa okorobịa a nwere mmasị n’echiche Ya na mmetụta Ya n’okwu ahụ. Olee otú ọ pụrụ isi ghọta ihe bụ́ uche Chineke n’okwu a?
N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Galeshia, Pọl onyeozi depụtara ọrụ nile nke anụ ahụ́ na mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. Eleghị anya ị ma ihe ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke: ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo Ndị Galeshia 5:19-23.
ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye. Ma olee ihe ndị mejupụtara ọrụ nile nke anụ ahụ́? Pọl na-ede, sị: “Ma ọrụ nke anụ ahụ́ pụtara ìhè, ha bụkwa ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ, ikpere arụsị, ime mgbaasị, ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndọrọ ndọrọ, nkewa, ịrọ òtù, anyaụfụ, ịṅụ oké mmanya, oriri oké mkpọtụ, na ihe ndị dị ka ndị a. Ebu m ụzọ na-adọ unu aka ná ntị banyere ihe ndị a, n’otu ụzọ ahụ m buru ụzọ dọọ unu aka ná ntị, na ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ agaghị eketa alaeze Chineke.”—Rịba ama kpọmkwem okwu ikpeazụ dị n’ihe ndị ahụ e depụtara—“ihe ndị dị ka ihe ndị a.” Pọl edepụtachaghị ihe nile a pụrụ ile anya dị ka ọrụ nke anụ ahụ́. Ọ pụtaghị na mmadụ pụrụ iche sị, ‘Akwụkwọ Nsọ nyere m ohere ime ihe ọ bụla na-esoghị n’ọrụ nile nke anụ ahụ́ Pọl depụtara.’ Kama nke ahụ, ndị na-agụ akwụkwọ ozi ya kwesịrị iji ikike nghọta ha eme ihe iji mata ihe ndị na-adịghị n’ihe ndị ahụ o depụtara ma ha “dị ka ihe ndị a.” Ndị na-eme omume ndị a na-akpọtụghị aha ma ha “dị ka ihe ndị a” n’egosighị nchegharị agaghị eketa ngọzi nke Alaeze Chineke.
Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịghọta ihe ndị na-adịghị mma n’anya Jehova. Ò siri ike ime otú ahụ? Ka e were ya na dọkịta gị gwara gị ka ị na-arakwu mkpụrụ osisi ma na-erikwu akwụkwọ nri ma zere akara, anụ na ihe ndị dị ka ihe ndị a. Ọ̀ ga-esiri gị ike ịmata ebe keeki so? Ugbu a leghachi anya ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke na ọrụ nile nke anụ ahụ́. Olee nke kaseti egwú ahụ a kpọtụrụ uche n’elu so na ya? N’ezie, ọ dịghị otú ya na ịhụnanya, ịdị mma, njide onwe onye, ma ọ bụ àgwà ndị ọzọ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke si yie. Iwu a kapịrị ọnụ adịghị mmadụ mkpa iji ghọta na ụdị egwú a ekwekọghị n’ụzọ Chineke si eche echiche. Otu ụkpụrụ ahụ ga-emetụtakwa akwụkwọ ọgụgụ, ihe nkiri sịnịma, ihe omume telivishọn, egwuregwu kọmputa, ógbè Intanet, na ihe ndị ọzọ.
Ọdịdị Onwe Onye Kwesịrị Ekwesị
Bible na-enyekwa ụkpụrụ ndị metụtara uwe na ejiji. Ha na-enye Onye Kraịst nke ọ bụla nduzi n’ịnọgide na-enwe ọdịdị onwe onye kwesịrị ekwesị ma dị mma n’anya. N’ebe a kwa, onye hụrụ Jehova n’anya na-ele nke a anya dị ka ohere, ọ bụghị iji na-eme ihe masịrị ya, kama iji na-eme ihe ga-eme ka Nna ya nke eluigwe ṅụrịa. Dị ka anyị hụworo, eziokwu ahụ bụ́ na Jehova enyeghị iwu a kapịrị ọnụ n’okwu ahụ apụtaghị na ihe ndị ya na-eme agbasaghị ya. Otú e si akwa uwe na-adị iche site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ, ọbụnadị n’otu ebe, ha na-agbanwe site n’oge ruo n’oge. Otú ọ dị, Chineke nyere ụkpụrụ bụ́ isi ndị kwesịrị iduzi ndị ya n’oge nile na n’ebe nile.
Dị ka ihe atụ, 1 Timoti 2:9, 10 na-ekwu, sị: “N’otu aka ahụ, achọrọ m ka ụmụ nwanyị jiri uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè, ọ bụghị n’ụdị dị iche iche nke ịkpa isi na ọlaedo ma ọ bụ nkume pel ma ọ bụ ejiji dị nnọọ oké ọnụ, kama n’ụzọ kwesịrị ụmụ nwanyị ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke, ya bụ, site n’ezi ọrụ.” Ya mere, ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst—na ndị ikom—kwesịrị iche echiche banyere ụdị ejiji ndị nọ n’ógbè ha na-atụ anya ka ndị “na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke” na-eji. O kwesịrị ekwesị karịsịa ka Onye Kraịst chee echiche banyere ihe ọdịdị ya ga-eme ka ndị ọzọ chee banyere ozi Bible ọ na-ezisa. (2 Ndị Kọrint 6:3) Onye Kraịst na-egosi ezi ihe nlereanya agaghị echegbubiga onwe ya ókè banyere ihe ndị na-amasị ya ma ọ bụ ihe ndị o chere ruuru ya, kama nke ahụ, ọ ga-eche banyere ịghara ịbụrụ ndị ọzọ ihe ndọpụ uche ma ọ bụ ihe ịsụ ngọngọ.—Matiu 18:6; Ndị Filipaị 1:10.
Mgbe Onye Kraịst chọpụtara na ọdịdị ya na-enye ndị ọzọ nsogbu n’obi ma ọ bụ na-eme ka ha sụọ ngọngọ, ọ pụrụ iṅomi Pọl onyeozi site n’ibute nchegbu banyere ọdịmma ime mmụọ nke ndị ọzọ ụzọ karịa ihe ndị na-amasị ya. Pọl kwuru, sị: “Bụrụnụ ndị 1 Ndị Kọrint 11:1) Pọl dekwara banyere Jizọs, sị: “Ọbụna Kraịst ahụ emeghị ihe masịrị ya.” Ntụziaka Pọl na-enye Ndị Kraịst nile doro anya: “Anyị ndị siri ike kwesịrị iburu adịghị ike nke ndị na-esighị ike, ọ bụghịkwa ịdị na-eme ihe na-amasị anyị onwe anyị. Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-eme ihe na-amasị onye agbata obi ya n’ihe dị mma maka iwuli ya elu.”—Ndị Rom 15:1-3.
na-eṅomi m, ọbụna dị ka m bụ onye na-eṅomi Kraịst.” (Ime Ka Ikike Nghọta Anyị Dị Nkọ
Olee otú anyị pụrụ isi na-azụlite ikike nghọta anyị ka anyị wee mara otú anyị pụrụ isi na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ ọbụna mgbe ọ na-enyeghị iwu a kapịrị ọnụ banyere otu ihe? Ọ bụrụ na anyị na-agụ Okwu ya kwa ụbọchị, na-amụchi ya anya ma na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị na-agụ, anyị ga-ahụ na ikike nghọta anyị ga-akawanye mma. Ọganihu dị otú ahụ adịghị ewere ọnọdụ ngwa ngwa. Dị ka uto anụ ahụ́ nke nwata, uto ime mmụọ na-aga nwayọọ nwayọọ, a dịghịkwa achọpụta ya ozugbo. N’ihi ya, ọ dị mkpa inwe ndidi, anyị ekwesịghịkwa inwe nkụda mmụọ ma ọ bụrụ na anyị achọpụtaghị ọganihu ozugbo. N’aka nke ọzọ, ngabiga nke oge agaghị eme n’onwe ya ka ikike nghọta anyị dị nkọ. Anyị aghaghị iji oge dị otú ahụ na-amụchi Okwu Chineke anya dị ka e kwuru n’elu, anyị aghaghịkwa ịdị na-eme ihe kwekọrọ n’Okwu ahụ ruo ókè anyị nwere ike.—Ndị Hibru 5:14.
A pụrụ ikwu na ebe iwu Chineke na-anwale nrubeisi anyị, ụkpụrụ ya na-anwale ókè anyị jiruru ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na otú anyị nweruru ọchịchọ ime ihe na-atọ ya ụtọ. Ka anyị na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ, anyị ga na-etinyekwu uche n’iṅomi Jehova na Ọkpara ya. Anyị ga-achọsi ike ime ka mkpebi anyị dabere n’otú Chineke si ele ihe anya dị ka e gosiri n’Akwụkwọ Nsọ. Ka anyị na-eme Nna anyị nke eluigwe obi ụtọ n’ihe nile anyị na-eme, anyị ga-achọpụta na ọṅụ nke anyị onwe anyị na-amụbakwa.
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Otú e si akwa uwe na-adị iche site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ, ma ụkpụrụ Bible kwesịrị iduzi nhọrọ anyị