Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Ihe Bụ́ Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ Na-abara Anyị Uru

Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Ihe Bụ́ Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ Na-abara Anyị Uru

Ka anyị leba anya n’ụzọ ebe anọ ihe Baịbụl kwuru nyeerela ọtụtụ nde mmadụ aka, nke mere ka ha tụkwasị ihe o kwuru obi.

1. Alụmdi na Nwunye

Ihe ndị mmadụ chere gbasara alụmdi na nwunye na ihe ga-eme ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ dịgasị iche iche.

BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya otú ọ hụrụ onwe ya. Nwunye kwesịkwara ịna-akwanyere di ya ezigbo ùgwù.”​—Ndị Efesọs 5:33.

IHE Ọ PỤTARA: Ọ bụ Chineke malitere alụmdi na nwunye. N’ihi ya, ọ ma ihe di na nwunye kwesịrị ịna-eme iji na-enwe obi ụtọ. (Mak 10:6-9) Di na nwunye ga na-enwe obi ụtọ ma mkpa ha bụrụ ime ibe ha obi ụtọ, kama onye nke ọ bụla ịchọwa ihe ga-abara naanị ya uru. Ọ bụrụ na di hụrụ nwunye ya n’anya, ọ ga na-egosi ya n’otú o si emeso ya nakwa n’otú o si elekọta ya. Ọ bụrụ na nwaanyị na-akwanyere di ya ùgwù, ọ ga-egosi ya n’ihe ọ na-ekwu nakwa n’ihe ọ na-eme.

NDỤMỌDỤ BAỊBỤL NA-ABA URU: E nwere otu di na nwunye si Vietnam. Aha ha bụ Quang na Thi. Alụmdi na nwunye ha gbụrụ ha. Quang na-emegbukarị nwunye ya emegbu. Ọ sịrị: “Achọghị m ịma otú obi dị ya, m na-emenyekarị ya ihere.” Thi chọrọ ka ha gbaa alụkwaghịm. Ọ sịrị: “Echere m na agaghịzi m atụkwasili di m obi ma ọ bụ kwanyere ya ùgwù.”

Ma, Quang na Thi mechara mụta ihe Baịbụl na-akụzi nakwa otú ha ga-esi na-eme ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 5:33 n’alụmdi na nwunye ha. Quang sịrị: “Amaokwu a nyeere m aka ịmata na m kwesịrị ịdị obiọma ma na-eme ka Thi ghọta na m hụrụ ya n’anya, na-elekọta ya ma na-egboro ya mkpa ya. Mgbe ọ bụla m mere otú ahụ, nwunye m na-ahụkwu m n’anya ma na-akwanyekwuru m ùgwù.” Thi kwukwara, sị: “Ọ na-abụ m na-agbalịsikwu ike na-eme ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 5:33 ma na-akwanyere di m ùgwù, di m ana-egosikwu m na ọ hụrụ m n’anya, na-emekwa ka obi ruo m ala.”

Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ gbasara alụmdi na nwunye, gaa na jw.org gụọ Teta! Nke 2 2018, nke isiokwu ya bụ, “Ihe Iri na Abụọ Na-eme Ka Ezinụlọ Na-enwe Obi Ụtọ.”

2. Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-emeso Ndị Ọzọ Ihe

Ndị mmadụ na-emegbukarị ndị ọzọ n’ihi agbụrụ ha, mba ha, otú ha dị n’anya, okpukpe ha, ma ọ bụkwanụ n’ihi na ha na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha.

BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Sọpụrụnụ ụdị mmadụ niile.”​—1 Pita 2:17.

IHE Ọ PỤTARA: Baịbụl akwadoghị ka anyị na-akpọ ndị mmadụ asị n’ihi agbụrụ ha, mba ha, ma ọ bụ n’ihi na ha na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha. Kama, ọ gbara anyị ume ka anyị na-akwanyere onye ọ bụla ùgwù n’agbanyeghị agbụrụ na mba o si, ma ọ̀ bara ọgaranya ma ọ̀ dara ogbenye. (Ọrụ Ndịozi 10:34) Ọ bụrụgodị na anyị ekwetaghị n’ihe ndị ọzọ kweere ma ọ bụkwanụ na otú ha si akpa àgwà adịghị anyị mma, anyị ka nwere ike iji obiọma na-emeso ha ihe ma na-akwanyere ha ùgwù.​—Matiu 7:12.

NDỤMỌDỤ BAỊBỤL NA-ABA URU: A kụziiri Daniel ka o were ndị si Eshia ka ndị na-akpata nsogbu n’obodo ya. Ihe a mere ka ọ kpọọ onye ọ bụla si Eshia asị. Ọtụtụ mgbe, ọ na-akparịkwa ha n’ihu ọha. Daniel sịrị: “M chere na ihe m na-eme dị mma maka na ọ na-egosi na m hụrụ mba m n’anya. E nweghị mgbe m chere na otú ahụ m si na-eche echiche ma na-akpa àgwà adịghị mma.”

Daniel mechara mata ihe Baịbụl na-akụzi. Ọ sịrị: “M gbanweziri otú m si eche echiche. M leweziri ndị mmadụ anya otú Chineke si ele ha, ya bụ, na mmadụ niile bụ otu n’agbanyeghị ebe onye nke ọ bụla si.” Daniel kwuziri otú obi na-adị ya ma ọ hụ ndị ọzọ. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ugboro, anaghịdị m echewe ebe ha si. Ahụrụ m ụdị mmadụ niile n’anya ugbu a, nweekwa ezigbo ndị enyi n’ebe dị iche iche n’ụwa.”

Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya, gaa na jw.org gụọ Teta! Nke 3 2020, nke isiokwu ya bụ, “Ò Nwere Ihe Ga-emeli Ka Ịkpọasị Kwụsị?

3. Ego

Ihe mere ọtụtụ ndị ji na-achụ akụnụba bụ maka na ha chọrọ ịna-enwe obi ụtọ nakwa ka ihe dịrị ha ná mma n’ọdịnihu.

BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Amamihe na-echebe mmadụ, ego na-echebekwa mmadụ. Ma uru mmadụ ịma ihe bara bụ na amamihe na-echebe onye nwere ya ndụ.”​—Ekliziastis 7:12.

IHE Ọ PỤTARA: Ego dị anyị mkpa. Ma, ọ bụghị ego ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ma ọ bụ ka ihe dịrị anyị mma n’ọdịnihu. (Ilu 18:11; 23:4, 5) Kama, ọ bụ isoro amamihe Chineke nke dị na Baịbụl ga-eme ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ, ihe adịkwara anyị mma n’ọdịnihu.​—1 Timoti 6:17-19.

NDỤMỌDỤ BAỊBỤL NA-ABA URU: E nwere otu nwoke bi n’Indoneshia aha ya bụ Cardo. Ihe bụ́ mkpa ya bụ ịchụ ego. Ọ sịrị: “M nwere ihe niile ọtụtụ ndị na-achọ inweta ná ndụ. M na-aga ebe dị iche iche, na-azụ ihe ndị dị oké ọnụ, ma ụgbọala ma ụlọ.” Ma, akụnụba ya adịteghị aka. Cardo kwuru, sị: “E gwuru m wayo, ego niile m tara ahụhụ kpaa kemgbe ọtụtụ afọ efuo n’otu ntabi anya. Eji m ndụ m niile chụọ akụnụba. Ma n’ikpeazụ, ihe m nwetara bụ obi mgbawa.”

Cardo malitere ime ihe Baịbụl kwuru gbasara ego. Ọ kwụsịrị ịchụ ego ọnwụ ọnwụ. O kwuru, sị: “Echere m na mmadụ na Chineke ịdị ná mma bụ akụ̀ na-adịgide adịgide nke kacha akụ̀ niile. M na-ehi ụra abalị nke ọma ugbu a, obi na-adịkwa m ezigbo ụtọ.”

Ị chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru gbasara ego, gaa na jw.org gụọ isiokwu bụ́ “Inwe Ego na Ịgụ Oké Akwụkwọ Hà Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Nke 3 2021.

4. Mmekọahụ

Ihe ndị mmadụ chere gbasara ụdị mmekọahụ kwesịrị ekwesị dịgasị iche iche.

BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Ghara ịna-akwa iko. Onye ọ bụla n’ime unu kwesịrị ịma otú ọ ga-esi na-ejide ahụ́ ya, ka ahụ́ ya wee dị nsọ ma dị ùgwù, ọ bụghị ime ka mba ndị na-amaghị Chineke, bụ́ ndị anyaukwu na-eme ka ha ghara ijide onwe ha ma agụụ mmekọahụ gụwa ha.”​—1 Ndị Tesalonaịka 4:3-5.

IHE Ọ PỤTARA: Baịbụl kwuru na ọ bụghị onye ọ bụla mmadụ chọrọ ka ya na ya ga-enwe mmekọahụ. “Ịkwa iko” pụtara di ma ọ bụ nwunye ịgba n’èzí, ịgba akwụna, ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye inwe mmekọahụ, nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ, mmadụ na anụmanụ inwe mmekọahụ, na ihe ndị yiri ya. (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10) Mmekọahụ bụ onyinye Chineke nyere ụmụ mmadụ. Ọ chọkwara ka ọ bụrụ naanị maka nwoke na nwaanyị bụ́ di na nwunye.​—Ilu 5:18, 19.

NDỤMỌDỤ BAỊBỤL NA-ABA URU: E nwere otu nwaanyị bi n’Ọstrelia aha ya bụ Kylie. Ọ sịrị: “Mgbe m na-alụbeghị di, m chere na ọ bụrụ na mụ na mmadụ enwee mmekọahụ, m ga-aghọta na e ji m kpọrọ ihe, ahụ́ ga-erukwa m ala. Mana, ọ bụghị ihe merenụ. Kama nke ahụ, obi gbawara m, ya adịzie m ka e nweghị ihe e ji m kpọrọ.”

Mgbe e mechara, Kylie mụtara ihe Baịbụl na-akụzi gbasara mmekọahụ, ya amalitekwa ime ya eme. Ọ sịrị: “Achọpụtara m na ihe mere Chineke ji nye ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl bụ iji mee ka anyị ghara ịkpatara onwe anyị nsogbu na obi mgbawa. Ugbu a, obi eruola m ala, o dookwala m anya na Jehova hụrụ m n’anya maka na m na-eme ihe ọ chọrọ. Ime ihe Baịbụl kwuru emeela ka m zere ọtụtụ nsogbu.”

Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ gbasara ya, gaa na jw.org gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Nwoke na Nwaanyị Ibikọ Ọnụ n’Alụghị Alụ?

Onye kere anyị na-eme ka anyị mata ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ bụ eziokwu na ime ihe o kwuru anaghị adịrị anyị mfe mgbe niile, mana anyị mee ya, ọ na-abara anyị ezigbo uru. Obi kwesịrị isi anyị ike na ime ihe o kwuru ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.