Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỤLỌ NCHE Nke 1 n'Afọ 2024 | Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịma Ihe Bụ́ Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ?

Olee otú i si ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ? Ihe na-enyere ọtụtụ ndị aka ikpebi ya bụ akọnuche ha na ihe ndị ha mụtarala. Ụfọdụ ndị na-eso ihe ndị ọzọ chere. Olee ihe na-enyere gịnwa aka ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ? Gịnị ga-enyere gị aka ikpebi ihe ndị ga-akacha baara gị na ndị ezinụlọ gị uru n’ọdịnihu?

 

Mmadụ Niile Kwesịrị Ịmata Ihe Bụ́ Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ

Ị chọwa ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, gịnị ka ị ga-agbakwasị ụkwụ na ya kpebie ya?

Otú Ọtụtụ Ndị Si Ekpebi Ihe Bụ́ Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ

Anyị nwere ike ịgbakwasị ụkwụ n’ihe anyị chere ma ọ bụ n’ihe ndị ọzọ chere kpebie ihe anyị ga-eme. Ma è nwere ihe ka mma ga-enyere anyị aka?

Baịbụl Ga-akacha Enyere Anyị Aka Ikpebi Ihe Bụ́ Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ

Olee otú anyị ga-esi jide n’aka na Baịbụl ga-enyeliri anyị aka ịmata ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ?

Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Ihe Bụ́ Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ Na-abara Anyị Uru

Leba anya n’ụzọ ebe anọ ihe Baịbụl kwuru nyeerela ọtụtụ nde mmadụ aka, nke mere ka ha tụkwasị ihe o kwuru obi.

Olee Ebe I Nwere Ike Isi Nweta Ndụmọdụ Ga-abara Gị Uru n’Oge A?

Baịbụl ga-enyeliri gị aka ịna-eme mkpebi ndị ị na-agaghị emecha kwaara mmakwaara.