ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 5
Àgwà Ndị Na-eme Ka Anyị Na-achọ Ịga Ọmụmụ Ihe
“Na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịarute.”—1 KỌR. 11:26.
ABỤ 18 Anyị Na-ekele Chineke Maka Ihe Mgbapụta
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1-2. (a) Gịnị ka Jehova na-ahụ ma ọtụtụ nde mmadụ zukọta maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.) (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?
CHEGODỊ ihe Jehova na-ahụ ma ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile zukọta maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ma ọ bụ Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ihe ọ na-ahụ abụghị naanị ìgwè mmadụ zukọtaranụ, kama ọ na-ahụ onye ọ bụla bịaranụ n’otu n’otu. Dị ka ihe atụ, ọ na-ahụ ndị niile na-abịa kwa afọ. Ọtụtụ n’ime ha nwere ike ịbụ ndị na-abịa n’agbanyeghị na a na-emekpọ ha ọnụ. E nwere ndị nke na-anaghị abịachi ọmụmụ ihe anyị ndị ọzọ anya, ma ha ejighị ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs egwu egwu. Jehova na-ahụkwa ndị o nwere ike ịbụ na nke a bụ nke mbụ ha ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, ikekwe ha chọrọ ịma ihe a na-eme na ya.
2 N’eziokwu, obi na-atọ Jehova ụtọ ịhụ na ọtụtụ ndị na-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (Luk 22:19) Ma, ihe bụ́ mkpa Jehova abụghị mmadụ ole bịaranụ, kama ọ bụ ihe mere ha ji bịa. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ajụjụ dị ezigbo mkpa. Ajụjụ ahụ bụ: Gịnị mere na ọ bụghị naanị Ncheta Ọnwụ Jizọs a na-eme kwa afọ ka anyị na-aga, kama anyị na-agakwa ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe kwa izu, bụ́ ndị Jehova kwadebeere ndị hụrụ ya n’anya?
ỊDỊ UMEALA N’OBI NA-EME KA ANYỊ NA-AGA ỌMỤMỤ IHE
3-4. (a) Gịnị mere anyị ji aga ọmụmụ ihe? (b) Olee àgwà mere anyị ji aga ọmụmụ ihe? (ch) N’ihi ihe 1 Ndị Kọrịnt 11:23-26 kwuru, gịnị mere anyị ekwesịghị ịhapụ ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs?
3 Ihe kacha mkpa mere anyị ji aga ọmụmụ ihe anyị bụ n’ihi na ọ bụ otu ụzọ anyị si efe Jehova. Ihe ọzọ abụrụ n’ihi na Jehova na-akụziri anyị ihe ma anyị gaa ọmụmụ ihe. Ndị mpako anaghị ekweta na e kwesịrị ịkụziri ha ihe. 3 Jọn 9) Ma, anyị adịghị otú ahụ. Anyị na-achọ ka Jehova na nzukọ ya na-akụziri anyị ihe.—Aịza. 30:20; Jọn 6:45.
(4 Ọmụmụ ihe anyị na-aga na-egosi na anyị dị umeala n’obi, dị njikere ma chọọ ka Jehova kụziere anyị ihe. Ihe mere anyị ji na-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs abụghị naanị n’ihi na anyị kwesịrị ịga ya, kama, ọ bụ n’ihi na anyị dị umeala n’obi ma na-eme ihe Jizọs kwuru nke bụ́: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 11:23-26.) Ọmụmụ ihe a na-eme ka okwukwe anyị nwere maka ọdịnihu sikwuo ike, na-echetakwara anyị otú Jehova hụruru anyị n’anya. Ma, Jehova ma na ọ bụghị naanị otu ugboro n’afọ ka e kwesịrị ịgba anyị ume ma mee ka obi sie anyị ike. N’ihi ya, o mere ka anyị na-enwe ọmụmụ ihe kwa izu ma na-agba anyị ume ka anyị na-aga ha. Ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị na-aga ha. Anyị na-eji ọtụtụ awa n’izu ọ bụla na-akwadebe ọmụmụ ihe ndị ahụ ma na-aga ha.
5. Gịnị mere ndị dị umeala n’obi ji aza òkù Jehova na-akpọ ha?
5 N’afọ ọ bụla, ọtụtụ ndị dị umeala n’obi na-aza òkù Jehova kpọrọ ha ka ọ kụziere ha ihe. (Aịza. 50:4) Ha na-ebukarị ụzọ abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, e mechaa, ha abịawa ọmụmụ ihe anyị ndị ọzọ. (Zek. 8:20-23) Obi na-atọ ma anyị ma ndị batara n’ọgbakọ ọhụrụ ụtọ ka Jehova, bụ́ ‘onye na-enyere anyị aka na Onye na-emere anyị ụzọ mgbapụ’ kụziere anyị ihe ma duzie anyị. (Ọma 40:17) N’eziokwu, o nweghị ihe karịrị mmadụ ịbịa ka Jehova na Jizọs, bụ́ Ọkpara ọ hụrụ n’anya nke ukwuu, kụziere ya ihe.—Mat. 17:5; 18:20; 28:20.
6. Olee otú ịdị umeala n’obi si nyere otu nwoke aka ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs?
6 Kwa afọ, anyị na-agba mbọ akpọ ọtụtụ ndị òkù ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ọtụtụ ndị dị umeala n’obi azala òkù a, ya abakwaara ha uru. Tụlee otu ihe atụ. Ọtụtụ afọ gara aga, otu nwanna nyere otu nwoke akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs, ya agwa nwanna ahụ na ya agaghị abịali. Ma, n’abalị ahụ e mere Ncheta Ọnwụ Jizọs, o juru nwanna ahụ anya ịhụ nwoke ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Obi tọrọ nwoke ahụ ụtọ n’ihi otú ụmụnna si kelee ya. Ihe a mere ka ọ malite ịbịa ọmụmụ ihe kwa izu. N’afọ ahụ niile, ọ bụ naanị ugboro atọ ka ọ na-abịaghị ọmụmụ ihe. Olee ihe nyeere ya aka ikpebi ịbịa ọmụmụ ihe niile? Ọ bụ n’ihi na ọ dị umeala n’obi mere o ji gbanwee obi ya. Nwanna ahụ kpọrọ ya mechara kwuo, sị: “Ọ bụ nwoke dị umeala n’obi.” O doro anya na ọ bụ Jehova dọtara nwoke a ka ọ bịa fee ya. Ọ bụ nwanna e merela baptizim ugbu a.—2 Sam. 22:28; Jọn 6:44.
7. Olee otú ihe anyị na-amụta n’ọmụmụ ihe na ihe ndị anyị na-agụ na Baịbụl si enyere anyị aka ịdị umeala n’obi?
7 Ihe ndị anyị na-amụta n’ọmụmụ ihe na ihe ndị anyị na-agụ na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi. Izu ole na ole tupu Ncheta Ọnwụ Jizọs, ọmụmụ ihe anyị na-elekwasị anya n’ihe ndị Jizọs mere nakwa otú o si gosi na ọ dị umeala n’obi n’ihi iji ndụ ya chụọ àjà. Abalị ole na ole tupu Ncheta Ọnwụ Jizọs, a na-agba anyị ume ịna-agụ ihe Baịbụl kwuru mere n’oge e gburu Jizọs na ihe ndị mere mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ. Ihe ndị anyị na-amụta n’ọmụmụ ihe ndị ahụ na ihe ndị ahụ anyị na-agụ na Baịbụl na-eme ka obi na-atọkwu anyị ụtọ maka àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ n’ihi anyị. Ha na-emekwa ka anyị na-adị umeala n’obi ka Jizọs ma na-eme uche Jehova ma mgbe ime otú ahụ siiri anyị ike.—Luk 22:41, 42.
OBI IKE NA-EME KA ANYỊ NA-AGA ỌMỤMỤ IHE
8. Olee otú Jizọs si gosi na ya nwere obi ike?
8 Anyị na-eṅomikwa Jizọs n’inwe obi ike. Chegodị otú o si gosi na ya nwere obi ike n’ụbọchị ole na ole tupu ọnwụ ya. O doro ya anya na n’oge na-adịghị anya, ndị iro ya ga-eme ya ihe ọchị, pịa ya ihe, ma gbuo ya. (Mat. 20:17-19) N’agbanyeghị ya, o ji obi ya niile kweta ịnwụ. Mgbe oge ahụ ruru, ọ gwara ndịozi ya, bụ́ ndị ya na ha nọ na Getsemeni, sị: “Bilienụ, ka anyị pụọ. Lee! Onye ga-arara m nye abịawo nso.” (Mat. 26:36, 46) Mgbe ìgwè mmadụ ji ngwá agha bịara ijide ya, ọ gakwuuru ha ma kwuo na ọ bụ ya bụ Jizọs. Ọ gwara ndị agha nọ ebe ahụ ka ha hapụ ndịozi ya ka ha laa. (Jọn 18:3-8) Ihe a o mere gosiri na o nwere obi ike. Taa, Ndị Kraịst e tere mmanụ na atụrụ ọzọ na-agbalị iṅomi Jizọs n’inwe obi ike. Olee otú ha si eme ya?
9. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji nwee obi ike ịna-abịachi ọmụmụ ihe anya? (b) Olee otú anyị inwe obi ike nwere ike isi nyere ụmụnna a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha aka?
9 Ka anyị nwee ike ịna-agachi ọmụmụ ihe anya, anyị kwesịrị igosi na anyị nwere obi ike ma mgbe anyị nọ n’ọnọdụ tara akpụ. Ụfọdụ ụmụnna anyị na-abịa ọmụmụ ihe n’agbanyeghị na ha dara mbà n’obi, na-eru uju ma ọ bụ na-arịa ọrịa. Ndị ọzọ na-eji obi ike abịa ya n’agbanyeghị na ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị ọchịchị na-emekpọ ha ọnụ. Chegodị otú obi ike anyị nwere si eme ka ụmụnna anyị a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. (Hib. 13:3) Ha nụ na anyị nọgidere na-efe Jehova n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara anyị, ọ na-agba ha ume ịnọgide na-efe Chineke, meekwa ka ha na-enwe obi ike ma na-ekwesị ntụkwasị obi. Ụdị ihe a mere Pọl onyeozi. Mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ dị na Rom, obi tọrọ ya ụtọ mgbe ọ bụla ọ nụrụ na ụmụnna ya ka na-efe Chineke. (Fil. 1:3-5, 12-14) Obere oge tupu a tọhapụ ya ma ọ bụ obere oge a tọhapụchara ya, o degaara ndị Hibru, bụ́ Ndị Kraịst akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ gwara ha ka ha mee ka ‘ịhụnanya ụmụnna ha dịgide.’—Hib. 10:24, 25; 13:1.
10-11. (a) Ole ndị anyị kwesịrị ịkpọ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs? (b) Olee ihe Ndị Efesọs 1:7 kwuru mere anyị ji kwesị ime otú ahụ?
10 Anyị na-egosi na anyị nwere obi ike mgbe anyị na-akpọ ndị ikwu anyị, ndị ọrụ ibe anyị, na ndị agbata obi anyị ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Gịnị mere anyị ji akpọ ha? Ọ bụ n’ihi na obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ihe Jehova na Jizọs meere anyị nke na anyị chọrọ ka ndị ọzọ bịa. Anyị chọrọ ka ha mụta otú ha ga-esikwa erite uru ‘n’obiọma dị ukwuu nke na-erughịrị mmadụ’ Jehova si n’ihe mgbapụta ahụ gosi anyị.—Gụọ Ndị Efesọs 1:7; Mkpu. 22:17.
11 Ọ bụrụ na anyị ana-abịa ọmụmụ ihe iji gosi na anyị nwere obi ike, anyị na-egosikwa na anyị nwere ezigbo àgwà ọzọ, bụ́ àgwà Chineke na Ọkpara ya na-egosi n’ụzọ pụrụ iche.
ỊHỤNANYA NA-EME KA ANYỊ NA-ABỊA ỌMỤMỤ IHE
12. (a) Olee otú ọmụmụ ihe anyị si eme ka anyị hụkwuo Jehova na Jizọs n’anya? (b) Gịnị ka 2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15 na-agba anyị ume ka anyị na-eme iji ṅomie Jizọs?
12 Otú anyị si hụ Jehova na Jizọs n’anya na-eme ka anyị na-abịa ọmụmụ ihe. Ihe ndị anyị na-amụta na ha na-emekwa ka anyị na-ahụkwu ha n’anya. N’ọmụmụ ihe, a na-echetara anyị ihe ndị ha meere anyị. (Rom 5:8) Ncheta Ọnwụ Jizọs na-echetara anyị otú ha hụruru anyị n’anya, ma ndị nke na-aghọtaghị uru ihe mgbapụta ahụ bara. Anyị ji obi ụtọ na-agbalị iṅomi Jizọs n’otú anyị si ebi ndụ anyị kwa ụbọchị. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15.) Ihe ọzọ bụ na anyị si n’ala ala obi anyị na-eto Jehova maka inye anyị ihe mgbapụta ahụ. Otu ụzọ anyị nwere ike isi na-eto ya bụ iji obi anyị niile na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe anyị.
13. Olee otú anyị nwere ike isi egosi otú anyị hụruru Jehova na Ọkpara ya n’anya? Kọwaa.
13 Otú anyị nwere ike isi egosi otú anyị hụruru Jehova na Ọkpara ya n’anya bụ ịdị njikere ịhapụ ihe ọ bụla n’ihi ha. Anyị na-emekarị ya iji na-abịa ọmụmụ ihe. Ọtụtụ ọgbakọ na-enwe ọmụmụ ihe mgbe ụmụnna gbasara ọrụ, bụ́ mgbe ọ ga-abụ na ike gwụchara ha. A na-enwekwa ọmụmụ ihe ná ngwụcha izu mgbe ndị ọzọ na-ezu ike. Jehova ọ̀ ma na anyị na-abịa ọmụmụ ihe ma mgbe ike gwụrụ anyị? À na-ajụkwa ajụ? N’eziokwu, ka anyị na-agbakwu mbọ ịna-abịa ọmụmụ ihe, ka obi na-atọkwu Jehova ụtọ maka otú anyị si na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya.—Mak 12:41-44.
14. A bịa n’otú Jizọs si wepụta onwe ya meere ndị ọzọ ihe, olee ihe o mere anyị kwesịrị iṅomi?
14 Jizọs kụziiri anyị otú anyị nwere ike isi ewepụta onwe anyị na-emere ndị ọzọ ihe iji gosi na anyị hụrụ ha n’anya. Otú o si mee ya bụ na ọ dị njikere ịnwụ n’ihi ndị na-eso ụzọ ya, nakwa ibi ndụ ya kwa ụbọchị otú na-egosi na ọ na-ebute ọdịmma ha ụzọ. Dị ka ihe atụ, ọ gakwuuru ndị na-eso ụzọ ya ma mgbe ike gwụchara ya ma ọ bụ mgbe obi na-erughị ya ala. (Luk 22:39-46) O lekwasịkwara anya n’ihe o nwere ike imere ndị ọzọ, ọ bụghị ihe o nwere ike inweta n’aka ha. (Mat. 20:28) Ọ bụrụ na anyị ahụ Jehova na ụmụnna anyị n’anya nke ukwuu, anyị ga-eme ihe niile anyị nwere ike ime iji na-aga Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, nakwa ọmụmụ ihe anyị ndị ọzọ.
15. Ole ndị anyị kwesịrị inyere aka karịchaa?
Gal. 6:10) Otú anyị si egosi na anyị hụrụ ha n’anya bụ ịna-agba ha ume ka ha na-abịa ọmụmụ ihe, nke ka nke, Ncheta Ọnwụ Jizọs. Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ otú ọ na-atọ Jehova na Jizọs ma ndị kwụsịrị ịga ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma laghachikwute Jehova, bụ́ Nna anyị hụrụ anyị n’anya nakwa Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị.—Mat. 18:14.
15 Ọ bụ naanị anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst e nwere n’ụwa niile. Anyị na-agbalịkwa eji oge buru ibu agwa ndị ọzọ ka ha bịa soro anyị na-efe Jehova. Ma ndị anyị kwesịrị inyere aka karịchaa bụ “ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe,” bụ́ ndị kwụsịrị ịga ozi ọma ma ọ bụ ọmụmụ ihe. (16. (a) Olee otú anyị nwere ike isi na-agbarịta ibe anyị ume? Oleekwanụ uru ọmụmụ ihe anyị ga-abara anyị? (b) Gịnị mere ụdị oge a n’afọ ji kwesị ekwesị icheta ihe Jizọs kwuru na Jọn 3:16?
16 N’izu ole na ole na-abịanụ, gbalịa kpọọ ọtụtụ ndị otú i nwere ike ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs ná mgbede Fraịdee, abalị iri na itoolu n’ọnwa Eprel, afọ 2019. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ị̀ Ga-akpọ Ha?”) N’ihi ya, ka anyị na-aga ọmụmụ ihe niile Jehova na-akwadebere anyị ma si otú ahụ na-agbarịta ibe anyị ume. Ka ọgwụgwụ ụwa ochie a na-eru nso, anyị kwesịrị ịna-aga ọmụmụ ihe iji na-adị umeala n’obi, enwe obi ike ma na-ahụ ndị ọzọ n’anya. (1 Tesa. 5:8-11) Ka anyị si n’ala ala obi anyị na-egosi otú obi dị anyị banyere Jehova na Ọkpara ya maka otú ha si hụ anyị n’anya nke ukwuu.—Gụọ Jọn 3:16.
ABỤ 126 Mụrụ Anya, Ka Okwukwe Gị Sie Ike, Dị Ike
^ par. 5 Ncheta Ọnwụ Kraịst a ga-eme ná mgbede Fraịdee, abalị iri na itoolu n’ọnwa Eprel, afọ 2019, ga-abụ ọmụmụ ihe kacha mkpa n’afọ. Olee ihe mere anyị ji aga ya? Ọ bụ n’ihi na anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’àgwà ndị na-eme ka anyị na-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs nakwa ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe kwa izu.
^ par. 50 IHE E SERE N’IHU ỤLỌ NCHE A: A na-anabata ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị
^ par. 52 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ya na-agụ akwụkwọ ozi gbara ya ume e si n’ụlọ zitere ya. Ebe ọ ma na ndị ezinụlọ ya echefubeghị ya, obi dị ya ụtọ mgbe ọ nụrụ na ha ka ji obi ha niile na-efe Jehova n’agbanyeghị tigbuo zọgbuo dị n’obodo ha.