ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 46
Otú Jehova Si Mee Ka Obi Sie Anyị Ike na Ụwa Ga-aghọ Paradaịs
“Onye ọ bụla nke chọrọ ka a gọzie ya n’ụwa rịọ Chineke, onye na-ekwu eziokwu, ka ọ gọzie ya.”—AỊZA. 65:16.
ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Gịnị ka Aịzaya onye amụma gwara ndị Izrel ibe ya?
AỊZAYA onye amụma kwuru na Jehova bụ “Chineke, onye na-ekwu eziokwu.” Okwu Hibru a sụgharịrị “eziokwu” bụ “amen.” (Ihe e dere n’ala ala peeji Aịza. 65:16.) “Amen” pụtara “ka ọ dị otú ahụ.” Na Baịbụl, e kwuo “amen” n’ihe gbasara Jehova ma ọ bụ Jizọs, ọ na-eme ka obi sie anyị ike na ihe ha kwuru bụ eziokwu. N’ihi ya, ihe Aịzaya na-agwa ndị Izrel bụ: Mgbe ọ bụla Jehova kwuru ihe ga-eme, ọ na-emezu. Jehova egosila na ihe a bụ eziokwu n’ihi na ọ na-emezu ihe ọ bụla o kwere ná nkwa.
2. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere maka ọdịnihu? Oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-aza?
2 Obi ọ̀ ga-esili anyị ike na nkwa ndị Jehova kwere maka ọdịnihu ga-emezu? Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị afọ asatọ (800) mgbe oge Aịzaya gafechara, Pọl onyeozi kọwara ihe mere e ji kwesị ịtụkwasị nkwa Jehova obi mgbe niile. Ọ sịrị: ‘Chineke emekataghị ghaa ụgha.’ (Hib. 6:18) Otu isi iyi agaghị na-asọpụta mmiri dị mma na mmiri na-atọ nnu nnu. Otú ahụ ka Jehova bụ́ onye eziokwu na-agaghị agha ụgha. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ọ bụla Jehova kwuru ga-emezu, ma nkwa niile o kwere maka ọdịnihu. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ajụjụ ndị a: Olee ihe Jehova kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu? Oleekwa otú Jehova si mee ka obi sie anyị ike na nkwa ya ga-emezu?
GỊNỊ KA JEHOVA KWERE ANYỊ NÁ NKWA?
3. (a) Olee nkwa na-atọgbu ndị ohu Jehova atọgbu? (Mkpughe 21:3, 4) (b) Gịnị ka ụfọdụ ndị na-eme ma anyị gụọrọ ha nkwa ahụ?
3 Nkwa Jehova anyị ga-eleba anya na ya bụ nkwa ndị na-efe Jehova n’ụwa niile ma nke ọma. (Gụọ Mkpughe 21:3, 4.) Jehova kwere nkwa na oge na-abịa mgbe ‘ọnwụ na-agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.’ Ọtụtụ n’ime anyị na-agụrụ ndị mmadụ amaokwu Baịbụl ndị a na-agba ume n’ozi ọma iji gosi ha otú ibi na Paradaịs ga-adị. Olee ihe ụfọdụ ndị na-eme ma anyị gụọrọ ha nkwa a? Ha nwere ike ịsị, “Ihe ndị a magburu onwe ha, ma ha yiri ihe na-agaghị ekwe omume.”
4. (a) Mgbe Jehova kwere nkwa ime ka ụwa ghọọ Paradaịs, olee ihe ọ ma ga-eme n’oge anyị? (b) E wepụ ikwe nkwa, olee ihe ọzọ Jehova mere?
4 N’eziokwu, mgbe Jehova mere ka Jọn onyeozi dee gbasara nkwa o kwere maka otú ndụ ga-adị na Paradaịs, ọ ma na anyị ga na-akọrọ ndị mmadụ gbasara nkwa a ma anyị na-ezi ha ozi ọma. Jehova makwa na ọ ga-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta “ihe ndị ọhụrụ” o kwere nkwa imere anyị. (Aịza. 42:9; 60:2; 2 Kọr. 4:3, 4) N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi eme ka obi sie ndị ọzọ ike, siekwa anyịnwa ike, na ihe ndị e dere ná Mkpughe 21:3, 4 ga-emezu? Ihe Jehova mere abụghị naanị ikwe anyị nkwa na-eme anyị obi ụtọ, kama ọ gwakwara anyị ihe ndị mere anyị ga-eji tụkwasị ya obi na ọ ga-emezu nkwa ya. Olee ihe ndị ọ bụ?
JEHOVA NA-EME KA OBI SIE ANYỊ IKE NA NKWA YA GA-EMEZU
5. Olee ihe ndị kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere ime ka ụwa ghọọ Paradaịs, oleekwa ebe e dere ha?
5 Amaokwu nke 5 na nke 6 na-eme ka anyị tụkwasị Jehova obi na nkwa o kwere na ụwa ga-aghọ Paradaịs ga-emezu. Ebe ahụ sịrị: “Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, sịkwara: ‘Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.’ Ọ sịkwara: ‘Dee ha edee, n’ihi na e kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu.’ Ọ sịkwara m: ‘Ha emezuola. Abụ m Alfa na Omega, mmalite na ọgwụgwụ.’—Mkpu. 21:5, 6a.
6. Gịnị mere ihe e kwuru ná Mkpughe 21:5, 6 ji eme ka anyị tụkwasịkwuo nkwa Jehova kwere obi?
6 Olee ihe mere ihe ndị e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị a ji eme ka anyị tụkwasị nkwa Chineke obi? Akwụkwọ Mmezu Mkpughe kwuru gbasara amaokwu ndị ahụ, sị: “Ọ bụ nnọọ dị ka à ga-asị na Jehova n’onwe ya na-abịanyere ihe a kpọrọ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi aka n’akwụkwọ ikwe nkwa, ma ọ bụ akwụkwọ na-enye ike, inweta ngọzi ndị a n’ọdịnihu.” b E dere nkwa Chineke kwere anyị ná Mkpughe 21:3, 4. Ma, n’amaokwu nke 5 na nke 6, anyị na-ahụ ihe Jehova mere nke dị ka à ga-asị na ọ bịanyere aka n’akwụkwọ, na-emesi anyị obi ike na nkwa ya ga-emezu. Ka anyị lee otú Jehova si mee ka obi sie anyị ike na nkwa ya ga-emezu.
7. Olee onye malitere ikwu okwu n’amaokwu nke 5, oleekwa ihe mere ihe o kwuru ji pụọ iche?
7 Ihe amaokwu nke 5 ji bido bụ: “Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, sịkwara.” (Mkpu. 21:5a) Ihe ndị e kwuru ebe a pụrụ iche n’ihi na ọ bụ otu ugboro n’ime naanị ugboro atọ akwụkwọ Mkpughe kwuru ihe Jehova n’onwe ya kwuru. N’ihi ya, ọ bụghị mmụọ ozi dị ike ma ọ bụ Jizọs mere ka obi sie anyị ike na nkwa a ga-emezu, kama ọ bụ Jehova n’onwe ya. Ihe a gosiri na anyị kwesịrị ịtụkwasị ihe ọzọ o kwuru obi. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova ‘enweghị ike ịgha ụgha.’ (Taị. 1:2) Ihe a mere ka obi sie anyị ezigbo ike na ihe e kwuru ná Mkpughe 21:5, 6 ga-emezurịrị.
“ANA M EME IHE NIILE KA HA DỊ ỌHỤRỤ”
8. Olee otú Jehova si mee ka obi sie anyị ike na ọ ga-emezu nkwa ọ bụla o kwere? (Aịzaya 46:10)
8 Ihe ọzọ Chineke kwuru bụ: “Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” N’eziokwu, Jehova na-ekwu gbasara ihe ndị ga-agbanwe n’ọdịnihu. Ma, obi siri ya ezigbo ike na ihe ndị ahụ ga-emezu nke na mgbe ọ na-ekwu gbasara ha, o kwuru ha ka à ga-asị na ha emewela emewe.—Gụọ Aịzaya 46:10.
9. (a) Olee ihe abụọ ‘ime ihe niile ka ha dị ọhụrụ’ gosiri na Jehova ga-eme? (b) Gịnị ga-eme “eluigwe” na “ụwa” dị ugbu a?
9 Ka anyị leba anya n’ihe ọzọ Jehova kwuru ná Mkpughe 21:5. Ọ sịrị: “Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” Gịnị ka ọ pụtara? Ọ pụtara na e nwere ihe abụọ Jehova ga-eme. Nke mbụ, Jehova ga-ebibi ihe ochie. Nke abụọ, ọ ga-eweta ihe ọhụrụ. Mkpughe 21:1 sịrị: “Eluigwe mbụ na ụwa mbụ alaala n’iyi.” “Eluigwe mbụ” bụ ọchịchị ụmụ mmadụ dị n’aka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Mat. 4:8, 9; 1 Jọn 5:19) Na Baịbụl, “ụwa” nwere ike ịpụta ụmụ mmadụ bi n’ụwa. (Jen. 11:1; Ọma 96:1) N’ihi ya, “ụwa mbụ” bụ ndị ajọ omume nọ n’ụwa taa. Ihe Jehova ga-eme abụghị imezi “eluigwe” na “ụwa” dị ugbu a, kama, ọ ga-ebibi ha kpamkpam. Ihe ọ ga-eji dochie ha bụ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” nke pụtara na a ga-enwe ọchịchị ọhụrụ nke ga-achị ndị ezi omume.
10. Olee ihe Jehova ga-eme ka ọ dị ọhụrụ?
10 Mkpughe 21:5 kwuru ihe ọzọ Jehova kwuru gbasara ihe ndị ọ ga-eme ka ha dị ọhụrụ. N’ebe a, Jehova asịghị: “Ana m eme ihe ọhụrụ niile.” Kama, ọ sịrị: “Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” Jehova ga-eme ka ụwa na ụmụ mmadụ dị ọhụrụ, n’ihi na ọ ga-eme ka ha zuo okè. Dị ka Aịzaya kwuru, a ga-eme ka ụwa niile bụrụ ebe mara mma nke ga-adị ka ogige Iden. A ga-emekwa ka anyịnwa dị ọhụrụ, ya bụ, a ga-agwọ onye ọ bụla n’ime anyị ọrịa ọ bụla na-arịa ya kpamkpam. A ga-agwọ ndị ngwọrọ, ndị ìsì, na ndị ntị chiri, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.—Aịza. 25:8; 35:1-7.
“E KWESỊRỊ ỊTỤKWASỊ OKWU NDỊ A OBI, HA BỤKWA EZIOKWU. . . . HA EMEZUOLA”
11. Gịnị ka Jehova gwara Jọn ka o mee, maka gịnị?
11 Olee ihe ọzọ Jehova kwuru iji mee ka obi sie anyị ike na anyị ga-atụkwasịli ya obi? Jehova gwara Jọn, sị: “Dee ha edee, n’ihi na e kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu.” (Mkpu. 21:5) Ihe Jehova gwara Jọn abụghị naanị ka o “dee ha edee,” o kwukwara ihe mere ọ ga-eji mee ya. Ọ sịrị: “N’ihi na e kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu,” ya bụ, na a ga-atụkwasịli ihe Jehova kwuru obi. Obi dị anyị ụtọ na Jọn rubere isi “dee” ihe ndị ahụ. Ọ bụ ya mere na anyị nwere ike ịgụ nkwa ndị Chineke kwere gbasara Paradaịs ma tụgharịa uche n’ihe ọma ndị ga-abịara anyị n’ọdịnihu.
12. Gịnị mere Jehova ji sị: “Ha emezuola”?
12 Olee ihe ọzọ Chineke kwuru? Ọ sịrị: “Ha emezuola.” (Mkpu. 21:6) N’ebe a, Jehova na-ekwu ka à ga-asị na ihe niile e kwuru gbasara Paradaịs emezuola. O nwekwara ikike ime otú ahụ n’ihi na e nweghị ihe ọ bụla ga-egbochi ya imezu nzube ya. Jehova kwukwara ihe ọzọ ga-emesi anyị obi ike na nkwa ya ga-emezurịrị. Olee ihe ọ bụ?
“ABỤ M ALFA NA OMEGA”
13. Olee ihe mere Jehova ji kwuo, sị: “Abụ m Alfa na Omega”?
13 Dị ka anyị kwuburu, Jehova kwuru okwu ugboro atọ n’ọhụụ ndị ahụ Jọn hụrụ. (Mkpu. 1:8; 21:5, 6; 22:13) Na nke ọ bụla n’ime ha, Jehova kwuru, sị: “Abụ m Alfa na Omega.” Ihe bidoro abịịdịị ndị Grik bụ alfa, nke ikpeazụ ya abụrụ omega. Mgbe Jehova kwuru “Alfa na Omega,” ihe ọ na-ekwu bụ na mgbe ọ bụla ọ malitere ime ihe, ọ na-emecharịrị ya.
14. (a) Olee mgbe e nwere ike ikwu na Jehova sịrị “Alfa,” oleekwa mgbe ọ ga-adị ka ọ̀ sịrị “Omega”? (b) Olee ihe e kwuru na Jenesis 2:1-3 na-eme ka obi sie anyị ike?
14 Mgbe Jehova kechara Adam na Iv, o kwuru ihe bụ́ nzube ya maka ụmụ mmadụ na ụwa. Baịbụl sịrị: “Chineke gọziri ha. Chineke sịkwara ha: ‘Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, junụ n’ụwa, na-elekọtakwanụ ya.’” (Jen. 1:28) N’oge ahụ, e nwere ike ikwu na Jehova sịrị “Alfa.” O mere ka nzube ya doo anya, ya bụ, na oge na-abịa mgbe ụmụ Adam na Iv na-erube isi ma zuo okè ga-eju n’ụwa, mee ka ọ ghọọ paradaịs. Mgbe Jehova mezuchara nzube ya a, ọ ga-adị ka ebe ọ sịrị “Omega.” Mgbe o kechara “eluigwe na ụwa na ihe niile dị na ha,” o kwuru ihe gosiri na nzube ya ga-emezurịrị. E dere ya na Jenesis 2:1-3. (Gụọ ya.) Jehova kwuru na ụbọchị nke asaa dị nsọ. Olee ihe ọ pụtara? Jehova mere ka obi sie anyị ike na e nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara imezu nzube ya maka ụmụ mmadụ na ụwa. Ọ ga-emezucha ya ná ngwụcha ụbọchị nke asaa ahụ.
15. Gịnị mere o ji yie ka Setan ò gbochiri Jehova imezu nzube ya maka ụmụ mmadụ?
15 Mgbe Adam na Iv nupụchaara Jehova isi, ha ghọrọ ndị mmehie ma mee ka ụmụ ha keta mmehie na ọnwụ. (Rom 5:12) Ihe a mere ka o yie ka Setan ọ̀ kụghasịrị nzube Jehova nke bụ́ na ụmụ mmadụ zuru okè ma na-erubere ya isi ga-eju n’ụwa. O yiri ka ò mere ka ọ ghara ikwe Jehova omume ịsị “Omega.” Ekwensu nwere ike iche na Jehova agaghị emezuli nzube ya. O nwere ike iche na Jehova ga-egbu Adam na Iv, kee di na nwunye ọzọ zuru okè iji mezuo nzube ya maka ụmụ mmadụ. Ma, ọ bụrụ na Jehova mere otú ahụ, Ekwensu gaara ekwu na Jehova bụ onye ụgha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe Jehova gwara Adam na Iv na Jenesis 1:28 bụ na ọ bụ ụmụ ha ga-eju ụwa.
16. Gịnị ka ọ ga-abụ ya mere Setan ji chee na Jehova agaghị emezuli nzube ya?
16 Olee ihe ọzọ Setan nwere ike iche na Jehova ga-eme? Ọ ga-abụ na Setan chere na Jehova ga-ahapụ Adam na Iv ka ha mụọ ụmụ na-ezughị okè, ndị na-enweghị mgbe ọ bụla ha ga-ezu okè. (Ekli. 7:20; Rom 3:23) A sị na Jehova mere otú ahụ, Setan gaara ekwu na nzube Jehova kụrụ afọ n’ala. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe a agaghị emezu nzube Jehova, ya bụ, na ọ bụ ụmụ Adam na Iv zuru okè, ndị na-erubekwara Jehova isi, ga-eju ụwa.
17. Mgbe Setan na Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi, gịnị ka Jehova mere, oleekwa ihe ga-emecha mee? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
17 Ọ ga-abụrịrị na otú Jehova si dozie okwu ahụ mgbe Setan na Adam na Iv nupụụrụ ya isi riri Setan ọnụ. (Ọma 92:5) Jehova kwere ka Adam na Iv mụọ ụmụ, si otú ahụ mezuo okwu ya. Jehova abụghị onye ụgha. O gosikwara na ọ bụrụ na o kwuo ihe, e nweghị ihe ga-egbochi ya imezu ya. O mere ihe iji jide n’aka na nzube ya ga-emezurịrị. O mere ka e nwee “nwa” ga-anapụta ụmụ Adam na Iv ga-erubere ya isi. (Jen. 3:15; 22:18) Ọ ga-abụrịrị na ndokwa a Jehova mere ka e nwee onye mgbapụta juru Setan anya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe mgbapụta ahụ gosiri na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, ọ naghịkwa achọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. (Mat. 20:28; Jọn 3:16) Setan enweghị ịhụnanya. Ọ na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. Gịnịzi ga-eme n’ihi na Jehova nyere ihe mgbapụta? Ná ngwụcha otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị, ụmụ Adam na Iv ndị na-erubere Jehova isi, ndị zukwara okè, ga-enweta ụwa nke ga-abụ paradaịs otú ahụ Jehova kwuru na mbụ. N’oge ahụ, ọ ga-eyi ka Jehova ọ̀ sịrị “Omega.”
IHE ANYỊ GA-EME KA OBI SIKWUO ANYỊ IKE NA JEHOVA GA-EMEZU NKWA O KWERE IWETA PARADAỊS
18. Olee ihe atọ Jehova kwuru na-eme ka obi sie anyị ike? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Atọ Mere Anyị Ga-eji Tụkwasị Nkwa Jehova Obi.”)
18 N’isiokwu a, anyị elebala anya n’ihe ndị mere ka obi sie anyị ike na ụwa ga-aghọ Paradaịs. Olee ihe anyị nwere ike ịgwa ndị ọzọ iji mee ka obi sie ha ike na ihe a ga-emerịrị? Nke mbụ, ọ bụ Jehova n’onwe ya kwere nkwa ahụ. Akwụkwọ Mkpughe sịrị: “Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, sịkwara: ‘Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.’” Jehova ma otú ọ ga-esi mezuo nkwa ya. O nwere ikike ime ya, chọọkwa ime ya. Nke abụọ, Jehova ma na ihe ọ bụla o kwuru ga-emerịrị. Ọ bụ ya mere o ji sị: “E kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu. . . . Ha emezuola.” Nke atọ, Jehova bido ime ihe, ọ na-eme ya ruo n’isi. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Abụ m Alfa na Omega.” Jehova ga-egosi na Setan bụ onye ụgha nakwa na ọ gaghị egbochili ya imezu nzube ya.
19. Ọ bụrụ na o siere mmadụ ike ikweta na Jehova ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs, olee ihe i nwere ike ime?
19 Cheta na mgbe ọ bụla ị nọ n’ozi ọma gwa mmadụ ihe ga-eme ka obi sie ya ike na nkwa Jehova kwere ga-emezu, ọ na-emekwa ka ị tụkwasịkwuo Jehova obi na ọ ga-emezu nzube ya. N’ihi ya, mgbe ọzọ ị ga-agụrụ mmadụ nkwa Chineke kwere ná Mkpughe 21:4 gbasara Paradaịs na-abịanụ, onye ahụ asị: “Ihe a yichara ihe na-agaghị ekwe omume,” gịnị ka i nwere ike ime? Ọ ga-adị mma ka ị gụọrọ ya amaokwu nke 5 na nke 6 ma kọwaa ya. Gosi ya ihe Jehova mere nke yiri ịbịanyere anyị aka n’akwụkwọ iji gosi na ihe o kwuru ga-emerịrị.—Aịza. 65:16.
ABỤ NKE 145 Chineke Kwere Anyị Nkwa Paradaịs
a N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị Jehova kwuru iji mee ka obi sie anyị ike na nkwa o kwere ime ka ụwa ghọọ Paradaịs ga-emezu. Mgbe ọ bụla anyị gwara ndị ọzọ ihe ndị a, ọ na-eme ka obi sikwuo anyị ike na nkwa ndị Jehova kwere ga-emezu.
b Gụọ akwụkwọ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! peeji nke 303, paragraf nke 8 na nke 9.