Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Hulda Nwetara Ihe Ọ Chọrọ

Hulda Nwetara Ihe Ọ Chọrọ

E NWERE ụmụnna nwaanyị atọ bi na Sangi Besa, bụ́ obere agwaetiti dị n’Indoneshia. N’afọ ole na ole gara aga, ha atọ nọ na-arụkọ ọrụ ọnụ n’akụkụ mmiri. Ihe e ji mara ha n’agwaetiti ahụ bụ inyere ndị mmadụ aka ịghọta Baịbụl. Ma, n’oge ahụ, e nwere ọrụ ọzọ ha na-arụ.

Agwaetiti Sangi Besa dị n’ebe ugwu Indoneshia

Ihe mbụ ha na-eme bụ na ha na-abanye n’ime mmiri ahụ, bupụta okwute n’akụkụ mmiri ahụ. Ụfọdụ n’ime okwute ndị ahụ na-aha ka bọl. Ihe ọzọ ha na-eme bụ ịnọrọ n’obere oche e ji osisi rụọ, jiri hama na-akụrisị okwute ndị ahụ, ha epekarịa àkwá ọkụkọ na mpe. Ha mechaa, ha etinye okwute ndị ahụ na bọket, buru ya gazie n’ebe ha bi. Ha na-agbazi okwute ndị ahụ ná nnukwu akpa otú ọ ga-adị mfe itinye ya n’ụgbọala ga-eburu ya. A na-eji okwute ndị ahụ arụ ụzọ.

Ebe Hulda na-ekpokọta okwute n’akụkụ mmiri

Aha otu n’ime ụmụnna nwaanyị ndị ahụ bụ Hulda. Otú ihe si dịrị ya mere ka ọ na-eji oge buru ibu arụ ọrụ a karịa ndị nke ọzọ. Ọ na-eji ego ọ na-enweta akpa afọ ezinụlọ ya. Ma ugbu a, e nwere ihe ọzọ o bu n’obi iji ya eme. Ọ chọrọ inweta tablet ọ ga-eji na-emepe JW Library®. Hulda ma na vidio na ihe ndị ọzọ dị na ya ga-enyere ya aka n’ozi ya, nyekwara ya aka ịghọta Baịbụl.

Hulda rụrụ ọrụ awa abụọ n’ụtụtụ ọ bụla ruo ihe dị ka otu ọnwa na ọkara. Ọ kụriri okwute ga-eju otu obere gwongworo. O mechara nweta ego ga-ezuru ya ịzụta tablet.

Ebe Hulda ji tablet ya

Hulda sịrị: “Ọ bụ eziokwu na ike na-agwụ m ma m gaa kụchaa okwute ahụ, aka ana-afụkwa m ụfụ, m chefuru ihe ndị ahụ niile mgbe m nwetara tablet m, nke nyeere m aka ịna-emekwu nke ọma n’ozi ọma na ịna-akwadokwu ọmụmụ ihe nke ọma.” O kwukwara na tablet ahụ nyeere ya aka n’oge ọrịa koronavaịrọs malitere ọhụrụ n’ihi na ọ bụ ekwentị ka e ji na-amụ ihe, na-ekwusakwa ozi ọma. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Hulda nwetara ihe ọ chọrọ.