Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 6

ABỤ NKE 10 Toonụ Jehova Chineke Anyị

“Toonụ Aha Jehova”

“Toonụ Aha Jehova”

“Unu ndị ohu Jehova, toonụ ya. Toonụ aha Jehova.” ​—ỌMA 113:1.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-amụ ihe mere anyị ji eji ohere ọ bụla dapụtaranụ eto aha nsọ Jehova.

1-2. Gịnị ga-enyere anyị aka ịghọta otú ọ dị Jehova na a na-akatọ aha ya?

 KA E were ya na onye ị hụrụ n’anya kwuru ihe jọgburu onwe ya gbasara gị. Ị ma na ihe ahụ o kwuru bụ ụgha. Ma, e nwere ndị kweere ya. Nke kadị njọ bụ na ha malitere na-aghakwuru ọtụtụ ndị ụgha ahụ, ọtụtụ ndị ọzọ ana-ekwerekwa ya. Olee otú obi ga-adị gị? Ọ bụrụ na ị na-eche gbasara ndị mmadụ nakwa gbasara aha ọma gị, otú onye ahụ si katọọ aha gị ga-eme ka iwe wee gị, ọ̀ kwa ya?​—Ilu 22:1.

2 Ihe atụ a na-enyere anyị aka ịghọta otú obi dị Jehova mgbe e kwutọrọ aha ya. Otu n’ime ndị mmụọ ozi o kere ghaara nwaanyị mbụ bụ́ Iv ụgha gbasara ya. Iv kwetara ụgha ahụ. Ihe a mere ka nne na nna anyị mbụ nupụrụ Jehova isi, mezie ka mmehie na ọnwụ batara ụmụ mmadụ. (Jen. 3:1-6; Rom 5:12) Ihe kpatara nsogbu niile anyị na-ahụ n’ụwa taa, ma ọnwụ, agha, na ịta ahụhụ, bụ ụgha Setan malitere ịgha n’ogige Iden. Ihe a Ekwensu mere na ihe ọ kpatara ò wutere Jehova? O doro anya na o wutere ya. Ma, o meweghị ya obi ọjọọ ma ọ bụkwanụ ya ebuwe iwe n’obi. N’eziokwu, Jehova bụ “Chineke, onye obi ụtọ.”​—1 Tim. 1:11.

3. Olee ọrụ anyị nwere?

3 Anyị nwere ike inye aka gosi na ihe Setan kwuru gbasara Jehova bụ ụgha. Otú anyị ga-esi eme ya bụ idebe iwu Chineke bụ́: “Toonụ aha Jehova.” (Ọma 113:1) Anyị na-eto aha Jehova ma ọ bụrụ na anyị ana-agwa ndị mmadụ ihe ọma gbasara Jehova. Ị̀ ga-eme otú ahụ? Ka anyị tụlee ihe atọ dị ezigbo mkpa ga-enyere anyị aka ịna-eji obi anyị niile na-eto aha Chineke.

ANYỊ NA-EME KA JEHOVA ṄỤRỊA MA ANYỊ NA-ETO AHA YA

4. Gịnị mere obi na-eji adị Jehova ụtọ ma anyị too ya? Nye ihe atụ. (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

4 Anyị na-eme ka obi Nna anyị nke eluigwe ṅụrịa ma anyị na-eto aha ya. (Ọma 119:108) Ma, ihe a ọ̀ pụtara na Chineke pụrụ ime ihe niile dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ndị na-achọ ka e towe ha n’ihi na ha chọrọ ihe ga-agba ha ume? Mba. Legodị ihe atụ a. Otu nwatakịrị nwaanyị gbakwuuru nna ya, makụọ ya, ma gwa ya, sị: “Papa, ọ bụ gị bụ nna kacha mma n’ụwa niile.” Ihe a tọrọ nna ya ụtọ, metụkwa ya n’ahụ́. Maka gịnị? Ànyị ga-echewe na papa ya bụ nna na-achọ ka e towe ya, onye naanị ihe na-eme ka obi tọọ ya ụtọ bụ ma nwa ya na-eto ya? Mba. Kama, anyị ma na nna ahụ siri ike nakwa na obi na-atọ ya ụtọ ịhụ ka nwa ya na-egosi na ọ hụrụ ya n’anya nakwa na obi dị ya ụtọ maka ihe ọ na-emere ya. Nna ahụ ma na nwa ya ga na-enwe obi ụtọ ka ọ na-etolite ma ọ bụrụ na ọ na-ahụ ndị ọzọ n’anya ma na-eji ihe e meere ya akpọrọ ihe. Otú ahụkwa ka obi si atọ Jehova, bụ́ Nna kacha nna niile, ụtọ ma anyị too ya.

Otú ahụ obi si atọ nna ụtọ ma nwa ya na-agwa ya na ọ hụrụ ya n’anya, jirikwa ihe ndị ọ na-emere ya kpọrọ ihe, ka obi na-atọkwa Jehova ụtọ ma anyị na-eto aha ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)


5. Olee ụgha anyị na-agba n’anwụ ma anyị na-eto aha Jehova?

5 Ọ bụrụ na anyị ana-eto Nna anyị nke eluigwe, anyị na-enye aka egosi na ihe ọzọ Setan kwuru gbasara onye ọ bụla n’ime anyị bụ ụgha. Setan kwuru na o nweghị mmadụ ga-eji obi ya niile gbachitere aha Chineke. O kwuru na e nweghị mmadụ ọ bụla ga na-erubere Chineke isi ma ọnwụnwa bịara ya, na mmadụ ga-akwụsị ife Chineke ma onye ahụ chee na ime otú ahụ ga-abara ya uru. (Job 1:9-11; 2:4) Ma, Job, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, gosiri na ihe ahụ Setan kwuru bụ ụgha. Oleekwanụ gbasara gị? Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịgbachitere Nna anyị nke eluigwe ma mee ya obi ụtọ. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iji obi anyị niile na-efe ya. (Ilu 27:11) Ọ bụ ezigbo ihe ọma meere anyị ime otú ahụ.

6. Olee otú anyị nwere ike isi eme ka Eze Devid na ndị Livaị? (Nehemaya 9:5)

6 Ndị hụrụ Jehova n’anya na-eji obi ha niile na-eto aha ya. Eze Devid dere, sị: “Ka m too Jehova. Ka ihe niile dị n’ime m too aha nsọ ya.” (Ọma 103:1) Devid ghọtara na ito aha Jehova bụ ito Jehova n’onwe ya. Anyị nụ aha Jehova, anyị na-eche gbasara ụdị onye ọ bụ. Anyị na-echekwa gbasara àgwà ọma niile o nwere nakwa ọrụ ọma ndị ọ na-arụ. Devid chọrọ iwere aha Nna ya ka ihe dị nsọ, chọọkwa ito ya. Ọ chọrọ iji “ihe niile dị n’ime” ya mee ya, ya bụ, iji obi ya niile mee ya. Otú ahụkwa ka ọ dị ndị Livaị na-ebute ụzọ n’ito Jehova. Ha dị umeala n’obi ma kwuo na ọnụ ha enweghị ike itochali aha nsọ Jehova otú o kwesịrị. (Gụọ Nehemaya 9:5.) Obi siri anyị ike na otú a ha si wetuo onwe ha ala si n’obi ha too Jehova mere ka obi Jehova ṅụrịa.

7. Olee otú anyị nwere ike isi na-eto Jehova n’ozi anyị nakwa n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị?

7 Taa, ọ bụrụ na ihe anyị na-ekwu gbasara Jehova ana-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị nakwa na anyị hụrụ ya n’anya, anyị na-eme ka obi ya ṅụrịa. Anyị nọrọ n’ozi ọma, anyị na-eburu n’obi na ihe kacha mkpa anyị ga-eme bụ ime ka ndị mmadụ bịa fewe Jehova, nyekwara ha aka ka ha were Nna anyị hụrụ anyị n’anya otú anyị si were ya. (Jems 4:8) Obi na-atọ anyị ụtọ igosi ndị mmadụ otú Baịbụl si kọwaa Jehova, mee ka ha mata na ọ hụrụ anyị n’anya, na-ekpe ikpe ziri ezi, nwee amamihe, dị ike, nweekwa ọtụtụ àgwà ọma ndị ọzọ. Otú ọzọ anyị si eto Jehova ma na-eme ihe dị ya mma bụ ịgbasi mbọ ike na-eme ka ya. (Efe. 5:1) Anyị mee otú ahụ, anyị na-adị iche n’ụwa a jọgburu onwe ya. Ọtụtụ ndị nwere ike ịchọpụta na anyị dị iche, ha ana-echekwa ihe kpatara ya. (Mat. 5:14-16) Anyị na ha mekọwa ihe, anyị nwere ike ịkọwara ha ihe mere anyị ji eme ihe ndị anyị na-eme. Ihe a nwere ike ime ka ndị nwere ezi obi chọọ ịbịaru Jehova nso. Ọ bụrụ na anyị esiri n’ụzọ ndị a na-eto Jehova, anyị na-eme ka obi ya ṅụrịa.​—1 Tim. 2:3, 4.

ANYỊ NA-EME JIZỌS OBI ỤTỌ MA ANYỊ NA-ETO AHA JEHOVA

8. Olee otú Jizọs si bute ụzọ n’ito aha Jehova?

8 E nweghị onye ọ bụla nọ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa ma Jehova nke ọma karịa Jizọs. (Mat. 11:27) Jịzọs hụrụ Nna ya n’anya. Ọ bụ ya butekwara ụzọ n’ito aha Nna ya. (Jọn 14:31) Mgbe Jizọs na-ekpe ekpere n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, o kwuru gbasara ihe kacha mkpa o mere, sị: “Emeela m ka ha mara aha gị.” (Jọn 17:26) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

9. Olee otú Jizọs si jiri ihe atụ kọwaa ụdị onye Nna ya bụ otú kacha doo anya?

9 Ihe Jizọs mere abụghị naanị ịgwa ndị mmadụ na aha Chineke bụ Jehova. Ndị Juu Jizọs kụziiri ihe ma aha Chineke. Ma, Jizọs Kraịst butere ụzọ ‘n’ịkọwa onye Nna ya bụ.’ (Jọn 1:17, 18) Dị ka ihe atụ, Akwụkwọ Nsọ Hibru gosiri na Jehova na-eme ebere ma na-enwe ọmịiko. (Ọpụ. 34:5-7) Jizọs mere ka eziokwu ahụ dokwuo anya mgbe o mere ihe atụ gbasara nwa mmefu na nna ya. Anyị gụwa ihe nna nwa ahụ mere mgbe ọ hụrụ nwa ya ahụ chegharịrị echegharị “mgbe ọ ka nọ ebe dị anya,” otú o si gbara ọsọ gakwuru ya, makụọ ya, jirikwa obi ya niile gbaghara ya, ọ na-eme ka anyị ghọtakwuo otú Jehova si emere anyị ebere ma na-enwere anyị ọmịiko. (Luk 15:11-32) Jizọs nyeere ndị mmadụ aka ịghọta ụdị onye Nna ya bụ n’eziokwu.

10. (a) Olee otú anyị si mara na Jizọs kpọrọ aha Nna ya, chọọkwa ka ndị ọzọ mee otú ahụ? (Mak 5:19) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.) (b) Gịnị ka Jizọs chọrọ ka anyị na-eme taa?

10 Jizọs ọ̀ chọrọ ka ndị ọzọ na-akpọ aha Nna ya? À na-ajụkwa ajụ? O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị isi okpukpe n’oge ahụ kweere na mmadụ ịkpọ aha Chineke bụ ịkparị ya. Ma Jizọs ekweghị ka ihe a ha na-eme Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị gbochie ya ịsọpụrụ aha Nna ya. Chegodị ihe mere n’oge ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ na-enye otu nwoke nsogbu n’obodo ndị Gerasa. Ụjọ bịara ndị nọ ebe ahụ, ha arịọ Jizọs ka o si n’obodo ha pụọ. N’ihi ya, Jizọs pụrụ. (Mak 5:16, 17) Ma, Jizọs chọrọ ka ndị nọ ebe ahụ mara aha Nna ya. N’ihi ya, ọ gwara nwoke ahụ ọ gwọrọ ka ọ gaa na-agwa ndị mmadụ ihe Jehova mere, ọ bụghị ihe yanwa bụ́ Jizọs mere. (Gụọ Mak 5:19.) a Taakwa, Jizọs chọrọ ka anyị mee ka ndị mmadụ mara aha Nna ya n’ụwa niile. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Ọ bụrụ na anyị emee ya, obi na-atọ Eze anyị bụ́ Jizọs ụtọ.

Jizọs gwara nwoke ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ka ọ kọọrọ ndị mmadụ otú Jehova si nyere ya aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)


11. Gịnị ka Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere maka ya? Oleekwa ihe mere o ji dị mkpa? (Ezikiel 36:23)

11 Jizọs ma na nzube Nna ya bụ ido aha ya nsọ, ya bụ, ịgba ụgha niile a ghara gbasara ya n’anwụ. Ọ bụ ya mere Nna anyị ukwu ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Mat. 6:9) Jizọs ma na ọ bụ ihe a bụ ihe kacha mkpa gbasara ihe niile e kere eke. (Gụọ Ezikiel 36:23.) O nweghị onye ọ bụla ma n’eluigwe ma n’ụwa gbasiri mbọ ike ido aha Jehova nsọ ka Jizọs. Ma, mgbe e jidere Jizọs, olee ihe e boro ya ebubo na o mere? E boro ya ebubo na ọ na-ekwutọ aha Nna ya. Jizọs ma nke ọma na ikwutọ aha Nna ya bụ mmehie kachanụ mmadụ nwere ike ime. O wutere ya nnọọ n’obi na ọ bụ ihe a ka e boro ya ebubo ma maa ya ikpe na o mere. Ọ ga-abụ ihe a bụ isi ihe mere ‘obi erughị ya ala’ awa ole na ole tupu e jide ya.​—Luk 22:41-44.

12. Olee otú Jizọs si mee ka aha Nna ya dị nsọ otú onye ọ bụla ọzọ na-agaghị emeli?

12 Ka Jizọs doo aha Nna ya nsọ, o diri ọnụ niile e mekpọrọ ya, mkparị, na ụgha a ghagidere ya. Ọ ma na o ruberela Nna ya isi n’ihe niile. O kweghị ka ihere mee ya. (Hib. 12:2) Ọ makwa na ọ bụ Setan na-akpatara ya nsogbu ndị ahụ n’oge ahụ taara ya ezigbo akpụ. (Luk 22:2-4; 23:33, 34) Setan fooro ntutu taa na ọ ga-eme ka Jizọs kwụsị ife Chineke. Ma, Setan dara kụọ afọ n’ala. Jizọs gosiri na Setan bụ ezigbo onye ụgha nakwa na Jehova nwere ndị ohu ji obi ha niile na-erubere ya isi, ndị dị njikere irubere ya isi ọ bụrụgodị na a na-ata ha ezigbo ahụhụ.

13. Olee otú ị ga-esi eme ka obi dị Eze gị na-achị achị ugbu a ụtọ?

13 Ị̀ chọrọ ime ka obi dị Eze gị na-achị achị ugbu a ụtọ? Akwụsịla ito aha Jehova. Na-enyere ndị ọzọ aka ịmata ụdị onye Chineke bụ. I mee otú ahụ, ị na-eso nzọụkwụ Jizọs. (1 Pita 2:21) Dịkwa ka Jizọs, ị na-eme ka obi Jehova ṅụrịa, na-egosikwa na onye iro ya bụ́ Ekwensu bụ onye ụgha na-enweghị ihere ná ndụ ya.

ANYỊ NA-ENYE AKA AZỌ NDỊ MMADỤ NDỤ MA ANYỊ NA-ETO AHA JEHOVA

14-15. Olee ụfọdụ ihe ndị na-atụ n’anya nwere ike ime ma anyị kụziere ndị mmadụ gbasara Jehova?

14 Anyị towe aha Jehova, anyị na-enye aka na-azọ ndị mmadụ ndụ. Olee otú anyị si eme ya? N’eziokwu, Setan “kpuchiri uche [ndị na-amaghị Chineke].” (2 Kọr. 4:4) Ihe a emeela ka ọtụtụ ndị na-ekwere ụgha ndị Setan na-agha, ụgha ndị dị ka, Chineke adịghị, Chineke nọ anyị ebe dị anya, ọ chọkwaghị ịma gbasara ụmụ mmadụ, ọ bụ onye obi ọjọọ, na-atakwa ndị mejọrọ ya ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi. Ihe mere Setan ji agha ụgha ndị ahụ bụ ka ọ katọọ aha Jehova, meekwa ka ndị mmadụ na-ele ya anya ọjọọ, nke ga-eme ka ha ghara ịchọ ịbịaru ya nso. Ma ọrụ anyị bụ ịkụghasị atụmatụ Setan. Anyị na-akụziri ndị mmadụ eziokwu gbasara Nna anyị, na-eto aha nsọ Chineke anyị. Olee uru ọ na-aba?

15 Eziokwu dị n’Okwu Chineke na-akpa ezigbo ike. Anyị kụziere ndị mmadụ gbasara Jehova nakwa ụdị onye ọ bụ, anyị na-ahụ ihe na-atụ anyị n’anya. A na-eji nwayọọ nwayọọ ewepụ ihe Setan ji kechie ha anya, ha amalite ịhụ Nna anyị anyị hụrụ n’anya otú anyị si ahụ ya. Obi na-atọ ha ụtọ n’ihi na Jehova nwere ike na-enweghị atụ. (Aịza. 40:26) Ha na-amalite ịtụkwasị Jehova obi n’ihi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. (Diut. 32:4) Ha na-amụta ọtụtụ ihe n’ihi amamihe ya dị ukwuu. (Aịza. 55:9; Rom 11:33) Obi na-adịkwa ha ụtọ ma ha ghọta na Chineke bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Ha na-abịarukwu Jehova nso, obi ana-esikwa ha ike na ha ga-adị ndụ ebighị ebi ka ụmụ Chineke. Ọ bụ ihe na-eme ezigbo obi ụtọ na anyị so na-enyere ndị mmadụ aka ịbịaru Nna ha nso. Anyị mee otú ahụ, Jehova na-ewere anyị ka ndị ha na ya “na-arụkọ ọrụ.”​—1 Kọr. 3:5, 9.

16. Olee otú ndụ ụfọdụ ndị si agbanwe ma ha mụta aha Chineke? Nye ihe atụ.

16 Ná mmalite, anyị nwere ike ịkụziri ndị mmadụ naanị na aha Chineke bụ Jehova. Ihe a nwere ike ịgbanwe ndụ ndị nwere ezi obi. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Aaliyah. b Ndị mụrụ ya abụghị Ndị Kraịst. Ma, obi esichaghị ya ike n’okpukpe ọ nọ na ya. Ọ dịghịkwa ya ka ọ̀ nọ Jehova nso. Ihe a gbanwere mgbe Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ ya Baịbụl. Ọ malitere ịhụ Jehova ka enyi ya. Ọ tụkwara ya n’anya mgbe ọ matara na e wepụrụ aha Chineke n’ọtụtụ Baịbụl, were utu aha ndị dị ka Onyenwe anyị dochie ya. Ndụ ya gbanwere mgbe ọ mụtara aha Jehova. O tiri mkpu, sị: “Enyi kachanụ m nwere nwere aha!” Olee uru ọ baara ya? Ọ sịrị: “Obi na-eru m ezigbo ala ugbu a. Ọ dịkwa m ka m̀ bụ ọgaranya.” Otu nwoke aha ya bụ Steve na-akụ egwú. Nne na nna ya bu okpukpe ndị Juu n’isi. Ma, o kweghị anọ n’okpukpe ọ bụla n’ihi na ọ hụrụ otú ọtụtụ ndị okpukpe si eme ihu abụọ. Ma, mgbe mama ya nwụrụ, o kwetara ịnọnyere otu onye Ndịàmà Jehova na-amụrụ Baịbụl. O metụrụ ya nnọọ n’obi mgbe ọ mụtara aha Chineke. Ọ sịrị: “Amabughị m aha Chineke.” Ọ sịkwara: “Nke a bụ nke mbụ m na-aghọta na Chineke dị adị n’eziokwu. Ewerela m ya ugbu a ka Onye dị adị. Amakwa m na achọtala m ezigbo Enyi.”

17. Gịnị mere i ji kpebisie ike na ị gaghị akwụsị ito aha Jehova? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

17 Ị na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma ma na-amụrụ ha Baịbụl, ị̀ na-agwa ha aha Jehova bụ́ aha dị nsọ? Ị̀ na-enyere ha aka ịghọta ụdị onye Chineke bụ? Ị na-eme otú ahụ, ị na-eto aha Chineke. Akwụsịla inyere ndị mmadụ aka ịmara ụdị onye Jehova bụ, si otú ahụ na-eto aha ya dị nsọ. I mee otú ahụ, ị ga-azọ ndị mmadụ ndụ. Ọ na-egosikwa na ị na-eme ka Eze gị, bụ́ Jizọs Kraịst. Nke kachanụ bụ na ị ga-eme Nna gị hụrụ gị n’anya bụ́ Jehova obi ụtọ. ‘Na-eto aha ya ruo mgbe niile ebighị ebi.’​—Ọma 145:2.

Anyị na-eto aha Jehova ma anyị na-akụziri ndị mmadụ aha Chineke ma na-egosi ha ụdị onye ọ bụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

OLEE OTÚ ITO AHA CHINEKE . . .

  • si eme Jehova obi ụtọ?

  • si eme Jizọs obi ụtọ?

  • si azọ ndị mmadụ ndụ?

ABỤ NKE 2 Jehova Bụ Aha Gị

a E nwere ọtụtụ ezigbo ihe mere anyị ji kwere na Mak dere aha Jehova mgbe ọ na-ede ihe Jizọs kwuru. Ọ bụ ya mere e ji dee ya na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

b Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.