Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Biskiiti E Nyere Nkịta M

Biskiiti E Nyere Nkịta M

E NWERE otu nwoke aha ya bụ Nick. O bi n’Oregọn dị n’Amerịka. O dere, sị: “Ná mmalite afọ 2014, mụ na nkịta m abụọ nọ na-agagharị n’ebe na-ekwo ekwo n’obodo ebe m bi. M hụrụ Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ ka ha kwụ n’ebe ha na-anọkarị n’akụkụ ihe nkwagharị ha ji ekwusa ozi ọma. Ha jikeere nke ọma, na-amụmụkwara onye ọ bụla gafere ebe ahụ ọnụ ọchị.

“Ọ bụghị naanị ndị mmadụ ka Ndịàmà Jehova ahụ na-emere ihe ọma, ha mekwaara ụmụ nkịta m. Otu ụbọchị, otu nwaanyị aha ya bụ Elaine, onye guzo n’ebe ihe nkwagharị ahụ dị, nyere ụmụ nkịta m biskiiti. Kemgbe ahụ, mgbe ọ bụla anyị gawara nso ebe ahụ, ụmụ nkịta m na-agba lịka lịka ka ha gaa ebe ahụ ka o nyekwa ha biskiiti.

“Mgbe ọnwa ụfọdụ gara, ụmụ nkịta m na-agakwa ebe ahụ, Ndịàmà Jehova ahụ ana-enye ha biskiiti, mụ na ha ejirikwa obere oge na-akparịta. Achọbughị m ka mụ na ha na-akparịta karịa otú ahụ. Akarịala m afọ iri asaa n’oge ahụ. Amaghịkwa m ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi. Ebe ọ bụkwanụ na ihe ọtụtụ chọọchị na-eme anaghị amasị m, m chere na ọ ka mma ka m na-amụ Baịbụl n’onwe m.

“N’oge ahụ, m hụkwara Ndịàmà Jehova ndị ọzọ n’ebe ndị ọzọ n’obodo m bi ka ha kwụkwa n’akụkụ ihe nkwagharị ha ji ekwusa ozi ọma. Hanwa na-amụmụkwa ọnụ ọchị mgbe niile. Ha na-ejikwa Baịbụl aza ajụjụ ọ bụla m jụrụ ha. Ọ bụ ya mere m ji tụkwasịwa ha obi.

“Otu ụbọchị, Elaine jụrụ m, sị: ‘Ì kwetara na ụmụ anụmanụ bụ onyinye si n’aka Chineke?’ M sịrị ya: ‘Eheenụ. Ekwetara m.’ Elaine gụziiri m Aịzaya 11:​6-9. Ọ bụ mgbe ahụ ka m malitere ịchọ ịmụta ihe dị na Baịbụl, ma achọwabeghị m ịnata ha akwụkwọ Ndịàmà Jehova ọ bụla.

“N’ụbọchị ndị ọzọ, mụ na Elaine na di ya bụ́ Brent ji obere oge na-ekwurịta. Mana, ihe ndị anyị kwurịtara tọrọ m ezigbo ụtọ. Ha tụụrụ m aro ka m gụọ akwụkwọ Matiu ruo Ọrụ Ndịozi ka m ghọta ihe ịbụ ezigbo Onye Kraịst pụtara. M mere otú ahụ. Ọ dịghị anya, m kwetara ka Brent na Elaine nwunye ya mụwara m Baịbụl. Ihe a mere n’etiti afọ 2016.

“N’oge ahụ, ọ na-adị m ka oge a ga-amụrụ m ihe ruo eruo nakwa ka anyị gaa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Obi dị m ezigbo ụtọ na m na-amụta ihe Baịbụl na-akụzi n’eziokwu. Mgbe ihe karịrị otu afọ gachara, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova. Ugbu a m dịzi afọ iri asaa na itoolu, obi dị m ezigbo ụtọ na achọtala m nke bụ́ ezigbo okpukpe. Jehova agọziela m ma kpọbata m n’ezinụlọ ya zuru ụwa ọnụ.”