Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Aka ekpe: Foto Yasser Qudaih/Anadolu via Getty sere; aka nri: Foto RONALDO SCHEMIDT/AFP via Getty sere

NA-ECHENỤ NCHE!

Olee Mgbe A Ga-akwụsị Ịlụ Agha Ndị A Na-alụ Ugbu A?​—Gịnị Ka Baịbụl kwuru?

Olee Mgbe A Ga-akwụsị Ịlụ Agha Ndị A Na-alụ Ugbu A?​—Gịnị Ka Baịbụl kwuru?

 Mgbe ndị Ịran tụchara ndị Izrel bọmb n’abalị iri na atọ n’ọnwa Eprel afọ 2024, António Guterres, bụ́ odeakwụkwọ ukwu Òtù Mba Ụwa, kwuru, sị: “Ugbu a bụ oge ime udo na ime ka agha a ghara ịgbasa. Ugbu a bụ oge ndị ọ bụla ga-ahapụ imegwara ihe e mere ha.”

 Otú ahụ a na-alụ agha n’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu ka a na-alụkwa ya ebe dị iche iche n’ụwa.

 N’abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Jenụwarị afọ 2023, Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Udo kwuru, sị: “Kemgbe a lụchara agha ụwa nke abụọ, e nwetụbeghị mgbe ọzọ agha juru ebe niile n’ụwa otú o juru taa. Agha ndị a na-akpa ijeri mmadụ abụọ aka, ya bụ, ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla nọ n’ụwa.”

 Ebe ụfọdụ a na-alụ agha n’ụwa ugbu a bụ Izrel, Gaza, Siria, Azebaịjan, Yukren, Sudan, Etiopia, Nijie (Rịpọblik), Mianmaa, na Heiti. a

 Olee mgbe a ga-akwụsị ịlụ agha ndị a niile? Ndị ọchịchị ụwa hà ga-emeli ka udo dị? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Ụwa agha juru na ya

 Agha a na-alụ n’ebe dị iche iche n’ụwa taa na-egosi na oge a ga-akwụsị ịlụ agha ebe niile n’ụwa eruola eruo. Agha ndị a a na-alụ na-emezu amụma ndị Baịbụl buru gbasara ihe ndị ga na-eme n’oge a anyị bi na ya. Baịbụl kpọrọ oge a anyị bi na ya “ọgwụgwụ oge.”​—Matiu 24:3.

  •   “Unu ga-anụ mkpọtụ agha na akụkọ agha. . . . Mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha.”​—Matiu 24:6, 7.

 Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe Na-egosi na Anyị Nọ n’Oge Ikpeazụ?” ka ị hụ otú agha ndị a na-alụ taa si emezu amụma Baịbụl.

Agha nke ga-akwụsị agha niile

 Baịbụl kwuru na agha niile ụmụ mmadụ na-alụ ga-akwụsị. Gịnị ga-eme ka ha kwụsị? Ọ bụghị mbọ ụmụ mmadụ na-agba ga-eme ya, kama, ọ bụ Amagedọn, ya bụ, “agha a ga-alụ n’oké ụbọchị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpughe 16:14, 16) A lụchaa agha a, Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ biri n’udo ruo mgbe ebighị ebi otú o kwere ná nkwa.​—Abụ Ọma 37:10, 11, 29.

 Ị chọọ ịmatakwu gbasara agha Chineke ga-eji kwụsị agha ndị ọzọ niile, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Agha Amagedọn?

a Ebe e si nweta ihe a bụ n’isiokwu bụ́ “Ranking violent conflict levels across the world.” Ọ bụ ndị a kpọrọ ACLED Conflict Index bipụtara ya n’ọnwa Jenụwarị afọ 2024.