Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Maremagnum/Corbis Documentary via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Amagedọn Ọ̀ Ga-amalite n’Izrel?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Amagedọn Ọ̀ Ga-amalite n’Izrel?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Baịbụl kwuru na Amagedọn abụghị agha a ga-alụ n’ebe ụfọdụ n’ụwa, kama ọ bụ agha zuru ụwa ọnụ ndị ọchịchị niile na Chineke ga-alụ.

  •   “Okwu ndị a si n’aka ndị mmụọ ọjọọ, ndị eze niile nọ n’ụwa nụkwara ha. Okwu ndị a mekwara ihe ndị dị ịtụnanya iji kpọkọta ndị eze ahụ maka agha a ga-alụ n’oké ụbọchị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Okwu ndị ahụ si n’aka ndị mmụọ ọjọọ kpọkọtakwara ndị eze ahụ n’ebe a na-akpọ Amagedọn n’asụsụ Hibru.”​—Mkpughe 16:14, 16.

 “Amagedọn” si n’okwu Hibru bụ́ Har Meghid·dohnʹ. Ọ pụtara “Ugwu Megido.” Megido bụ obodo dị n’Izrel oge ochie. N’ihi ya, ụfọdụ chere na ọ bụ n’Izrel ka a ga-alụ agha Amagedọn. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ma Megido ma ebe ndị ọzọ dị n’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu agaghị aba “ndị eze niile nọ n’ụwa” na ndị agha ha niile.

 Ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe nwere “ihe ndị ha nọchiri anya ha.” (Mkpughe 1:1) N’ihi ya, Amagedọn apụtaghị otu ebe dị adị, kama ọ nọchiri anya oge mba niile ga-agbakọ aka ka ha megide ọchịchị Chineke, ọ ga-abụkwa nke ikpeazụ.​—Mkpughe 19:11-16, 19-21.