Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị kọrịnt 16:1-24

  • Ịnakọta onyinye a ga-ezigara Ndị Kraịst nọ na Jeruselem (1-4)

  • Otú Pọl ga-esi gaa ebe ndị ọ chọrọ ịga (5-9)

  • Ebe a chọrọ ka Timoti na Apọlọs gaa (10-12)

  • Agbamume na ekele (13-24)

16  N’okwu gbasara ịnakọta onyinye a ga-enye ndị nsọ,+ na-emenụ ya otú ahụ m gwara ọgbakọ ndị dị na Galeshia ka ha na-eme.  N’ụbọchị mbụ n’izu ọ bụla,* ka onye ọ bụla wepụta ihe ọ ga-enye otú aka hà ya, ka unu ghara ịnakọta onyinye mgbe m rutere.  Ma mgbe m rutere, m ga-agwa ụfọdụ ndị ka ha gaa Jeruselem wega onyinye unu ji obi unu niile weta. Ndị m ga-eziga bụ ndị unu dere n’akwụkwọ ozi unu+ na unu tụkwasịrị obi.  Ma, ọ bụrụ na m kwesịkwara ịga ebe ahụ, mụ na ha ga-eso gaa.  Ma m ga-abịa hụ unu ma m gachaa Masedonia, n’ihi na m chọrọ isi Masedonia bịa.+  M bịa, mụ na unu nwere ike ịnọtụ. M nwedịrị ike ịnọ oge oyi agafee, ka unu wee dupụ m ma m gawa ebe ọzọ m ga-aga.  N’ihi na achọghị m ịhụ unu ugbu a m na-agafe agafe, ebe ọ bụ na m nwere olileanya na m ga-abịa ka mụ na unu nọtụ,+ ma Jehova* kwe.  Ma m ga-anọ n’Efesọs ebe a+ ruo ụbọchị Ememme Pentikọst,  n’ihi na e meela ka m nwee nnukwu ohere ịrụ ọrụ Onyenwe anyị.*+ Ma ọtụtụ ndị na-emegide m. 10  Ọ bụrụ na Timoti+ erute, gbaanụ mbọ mee ka ahụ́ ruo ya ala, n’ihi na ọ na-arụ ọrụ Jehova*+ otú m na-arụ. 11  N’ihi ya, ka onye ọ bụla ghara ileda ya anya. Dupụnụ ya n’udo, ka ọ bịakwute m, n’ihi na mụ na ụmụnna ndị ọzọ na-eche ya. 12  Agbasiri m Apọlọs+ nwanna anyị ume ike ka o soro ụmụnna ndị ga-abịakwute unu. Ma ọ chọghị ịbịa ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe o nwere ohere. 13  Mụrụnụ anya.+ Meenụ ka okwukwe unu sie ike.+ Nweenụ obi ike,+ siekwanụ ezigbo ike.+ 14  Jirinụ ịhụnanya+ na-eme ihe niile unu na-eme. 15  Unu ma na ezinụlọ Stefanas bụ ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs* n’Akeya, ha wepụtakwara onwe ha na-ejere ndị nsọ ozi. N’ihi ya, ụmụnna m, m na-agba unu ume ka unu na-eme ihe a: 16  Na-edonụ onwe unu n’okpuru ndị dị otú ahụ nakwa n’okpuru ndị niile so anyị na-arụ ọrụ ma na-arụsi ya ike.+ 17  Ma m na-aṅụrị ọṅụ na Stefanas+ na Fọtunetọs na Akeikọs nọ ebe a, n’ihi na ha enyerela m ezigbo aka unu gaara enyere m. 18  Ha agbaala mụ na unu ume. N’ihi ya, na-akwanyerenụ ndị dị otú ahụ ùgwù. 19  Ọgbakọ ndị dị n’Eshia na-ekele unu. Akwịla na Priska nakwa ọgbakọ dị n’ụlọ ha+ ji obi ha niile na-ekele unu, unu ndị ha na ha na-eso ụzọ Onyenwe anyị. 20  Ụmụnna niile na-ekele unu. Susuonụ ibe unu ọnụ mgbe unu na-ekele ibe unu.* 21  Mụnwa bụ́ Pọl na-ekele unu. Ọ bụ m ji aka m na-ede ekele a. 22  Ọ bụrụ na ọ dị onye na-ahụghị Onyenwe anyị n’anya, a ga-abụ ya ọnụ. Onyenwe anyị, biko, bịa. 23  Ka Onyenwe anyị Jizọs meere unu amara. 24  M hụrụ unu niile n’anya, unu ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ihe a na-akpọ ụbọchị a ugbu a bụ Sọnde. Ọ bụ ya bụ ụbọchị mbụ n’izu ndị Juu.
Gụọ A5.
Na Grik, “e megheerela m ọnụ ụzọ buru ibu nke m ga-abanye rụọ ọrụ.”
Gụọ A5.
Na Grik, “mkpụrụ mbụ.”
Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.