Ọpụpụ 40:1-38
40 Jehova gwaziri Mosis, sị:
2 “N’abalị mbụ n’ọnwa mbụ, ị ga-ama ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu nzute.+
3 Dọsa igbe ọgbụgba ndụ* ahụ n’ime ya,+ jirikwa ákwà mgbochi gechie Igbe ahụ.+
4 Ị ga-ebubata tebụl ahụ+ ma dowe ihe ndị ga-adị na ya otú ha kwesịrị ịdị. Ị ga-ebubatakwa ihe e ji adọsa ọkụ*+ ma mụnye ọkụ* ndị dị na ya.+
5 Dọsa ebe ịchụàjà insens+ ahụ e ji ọlaedo rụọ tupu ebe ahụ a dọsara igbe ọgbụgba ndụ* ahụ, konyekwa ákwà ngebichi* ahụ ga-adị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu ahụ.+
6 “Ị ga-adọsa ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ+ ná mpụga ihu ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu nzute.
7 Ị ga-adọsakwa nnukwu ite ahụ n’agbata ụlọikwuu nzute ahụ na ebe ịchụàjà ahụ ma gbanye ya mmiri.+
8 Gbaa ogige+ gburugburu ụlọikwuu ahụ ma konye ákwà ngebichi*+ n’ọnụ ụzọ ogige ahụ.
9 Ị ga-ewerezi mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ+ tee ụlọikwuu ahụ na ihe niile dị n’ime ya mmanụ+ ma mee ka ya na arịa ya niile dị nsọ, ka ọ bụrụ ihe dị nsọ.
10 Ị ga-ete ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ na arịa ya niile mmanụ ma mee ka ebe ịchụàjà ahụ dị nsọ, ka o wee bụrụ ebe ịchụàjà kacha nsọ.+
11 Ị ga-etekwa nnukwu ite ahụ na ihe e ji dọkwasị ya mmanụ ma mee ka ha dị nsọ.
12 “Kpọtazie Erọn na ụmụ ya ndị nwoke n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ma gwa ha ka ha jiri mmiri saa ahụ́.*+
13 Ị ga-eyiwe Erọn uwe nsọ ndị ahụ,+ tee ya mmanụ+ ma mee ka ọ dị nsọ. Ọ ga-abụzi onye nchụàjà m.
14 Ị ga-akpọtazi ụmụ ya ndị nwoke ma yiwe ha uwe mwụda.+
15 Ị ga-ete ha mmanụ otú i tere nna ha mmanụ,+ ka ha wee bụrụ ndị nchụàjà m. Mmanụ ị ga-ete ha ga-eme ka ha bụrụ ndị nchụàjà ga na-ejere m ozi mgbe niile n’ọgbọ ha niile.”+
16 Mosis mere ihe niile Jehova nyere ya n’iwu.+ O mere nnọọ otú ahụ.
17 N’abalị mbụ n’ọnwa mbụ, n’afọ nke abụọ, a mara ụlọikwuu ahụ.+
18 Mgbe Mosis na-ama ụlọikwuu ahụ, o dosara ntọala ya ndị nwere oghere+ n’ala, kwụnyechaa frem ya,+ tinyechaa okporo osisi ya,+ kwụwakwa ogidi ya niile.
19 Mosis gbasara ákwà ụlọikwuu ahụ+ n’elu frem ụlọikwuu ahụ ma were ákwà a ga-eji kpuchie+ ụlọikwuu ahụ kpuchie ya, otú Jehova nyere ya n’iwu.
20 Mosis wee were Ihe Àmà+ ahụ tinye n’Igbe ahụ,+ tinyekwa okporo osisi ndị ahụ+ n’Igbe ahụ ma were okwuchi Igbe ahụ kwuchie ya.+
21 O bubatara Igbe ahụ n’ụlọikwuu ahụ ma konye ákwà mgbochi ahụ,+ jiri ya gechie igbe ọgbụgba ndụ* ahụ,+ otú Jehova nyere ya n’iwu.
22 Mosis dọsaziri tebụl ahụ+ n’ụlọikwuu nzute, n’akụkụ ebe ugwu ụlọikwuu ahụ, tupu ebe ahụ e ji ákwà mgbochi gebichie.
23 O dosakwara achịcha+ n’usoro n’elu ya n’ihu Jehova, otú Jehova nyere ya n’iwu.
24 Mosis dọsara ihe e ji adọsa ọkụ*+ n’ụlọikwuu nzute, n’ihu tebụl ahụ, n’akụkụ ebe ndịda ụlọikwuu ahụ.
25 Ọ mụnyere ọkụ*+ ndị ahụ n’ihu Jehova, otú Jehova nyere ya n’iwu.
26 Mosis dọsaziri ebe ịchụàjà+ ahụ e ji ọlaedo rụọ n’ụlọikwuu nzute n’ihu ákwà mgbochi ahụ,
27 ka e wee na-amụ insens na-esi ísì ọma+ na ya,+ otú Jehova nyere ya n’iwu.
28 O wee konye ákwà ngebichi*+ n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu ahụ.
29 Mosis dọsara ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ+ n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu nzute, ka o wee na-achụ àjà a na-esu ọkụ+ na àjà ọka na ya, otú Jehova nyere ya n’iwu.
30 O wee dọsa nnukwu ite ahụ n’agbata ụlọikwuu nzute na ebe ịchụàjà ahụ ma gbanye ya mmiri.+
31 Mosis na Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ji mmiri si na ya saa aka ha na ụkwụ ha.
32 Mgbe ọ bụla ha na-abanye n’ụlọikwuu nzute ma ọ bụ mgbe ha bịara ebe ịchụàjà nso, ha na-asacha onwe ha,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.
33 N’ikpeazụ, Mosis gbara ụlọikwuu ahụ na ebe ịchụàjà ahụ ogige+ gburugburu ma konye ákwà ngebichi* n’ọnụ ụzọ ogige ahụ.+
Mosis wee rụchaa ọrụ ahụ.
34 Ígwé ojii malitere ikpuchi ụlọikwuu nzute ahụ. Ebube Jehova wee ju n’ụlọikwuu ahụ.+
35 Mosis enweghị ike ịbanye n’ụlọikwuu nzute ahụ n’ihi na ígwé ojii kwụ n’elu ya, ebube Jehova jukwara n’ụlọikwuu ahụ.+
36 Mgbe ọ bụla ígwé ojii ahụ si n’ụlọikwuu ahụ pụọ, ndị Izrel na-akwali. Ha mere otú ahụ n’oge niile ha si n’otu ebe kwaga ebe ọzọ n’ala ịkpa.+
37 Ma, ọ bụrụ na ígwé ojii ahụ apụghị, ha anaghị akwali ruo ụbọchị ọ pụrụ.+
38 N’ihi na ígwé ojii Jehova na-adị n’elu ụlọikwuu ahụ n’ehihie, ọkụ na-adịkwa n’elu ya n’abalị. Ndị Izrel niile na-ahụ ya n’oge niile ha si n’otu ebe kwaga ebe ọzọ.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”
^ Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
^ Ma ọ bụ “oriọna.”
^ Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”
^ Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”
^ Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”
^ Na Hibru, “ma jiri mmiri saa ha ahụ́.”
^ Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”
^ Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
^ Ma ọ bụ “oriọna.”
^ Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”
^ Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”