Ọpụpụ 6:1-30

  • Jehova kweghachiri nkwa na ndị Izrel ga-enwere onwe ha (1-13)

    • A matachaghị aha Jehova (2, 3)

  • Usoro ọmụmụ Mosis na Erọn (14-27)

  • A gwara Mosis ka ọ gakwuru Fero ọzọ (28-30)

6  Jehova wee gwa Mosis, sị: “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero.+ M ga-eji aka m dị ike manye ya ka ọ hapụ ha ka ha laa, jirikwa aka m dị ike manye ya ka ọ chụpụ ha n’ala ya.”+  Chineke wee gwa Mosis, sị: “Abụ m Jehova.  M na-adị apụta n’ihu Ebreham, Aịzik, na Jekọb ka Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ ma emeghị m ka ha matachaa aha m+ bụ́ Jehova.+  Mụ na ha gbakwara ndụ na m ga-enye ha ala Kenan, bụ́ ala ha biri na ya ka ndị ọbịa.+  Ugbu a, anụla m ude ndị Izrel na-asụ, bụ́ ndị ndị Ijipt ji mere ndị ohu, m na-echetakwa ọgbụgba ndụ m.+  “N’ihi ya, gwa ndị Izrel, sị: ‘Abụ m Jehova. M ga-akpọpụta unu n’aka ndị Ijipt ka unu kwụsị ịrụgbu onwe unu n’ọrụ, meekwa ka unu kwụsị ịgbara ha ohu.+ M ga-eji aka m siri ike napụta unu ma taa ndị Ijipt nnukwu ahụhụ.+  M ga-akpọrọ unu ka unu bụrụ ndị m, m ga-abụkwa Chineke unu.+ Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova bụ́ Chineke unu, onye na-akpọpụta unu n’Ijipt ka unu kwụsị ịrụgbu onwe unu n’ọrụ.  M ga-akpọbata unu n’ala m ṅụrụ iyi* na m ga-enye Ebreham, Aịzik, na Jekọb. M ga-enyekwa ya unu ka ọ bụrụ nke unu.+ Abụ m Jehova.’”+  Mosis mechara gwa ndị Izrel ihe ndị a. Ma ha egeghị Mosis ntị maka na obi dara ha mbà nakwa maka na e ji ha mere ndị ohu, na-echikwa ha ọnụ n’ala.+ 10  Jehova wee gwa Mosis, sị: 11  “Gaa gwa Fero, eze Ijipt, ka ọ hapụ ndị Izrel ka ha si n’ala ya pụọ.” 12  Ma Mosis sịrị Jehova: “Leenụ, ndị Izrel egeghị m ntị.+ Olee otú Fero ga-esi gee m ntị, ebe ọ bụ na ọ na-esiri m ike ikwu okwu?”*+ 13  Ma Jehova gwara Mosis na Erọn ihe ha ga-agwa ndị Izrel nakwa Fero, eze Ijipt, ka e wee kpọpụta ndị Izrel n’Ijipt. 14  Ndị a bụ ndị isi ezinụlọ dị iche iche nke ndị Izrel: Ụmụ nwoke Ruben, ọkpara Izrel,+ mụrụ bụ Henọk, Palu, Hezrọn, na Kamaị.+ Ha bụ ndị ezinụlọ Ruben. 15  Ụmụ nwoke Simiọn mụrụ bụ Jemuel, Jemin, Ohad, Jekin, Zoha, nakwa Sheọl, onye nwaanyị Kenan mụrụ.+ Ha bụ ndị ezinụlọ Simiọn. 16  Ihe a bụ aha ụmụ nwoke Livaị mụrụ,+ n’ọnụmara n’ọnụmara: Geshọn, Kohat, na Meraraị.+ Livaị dịrị ndụ otu narị afọ na iri atọ na asaa (137). 17  Ụmụ nwoke Geshọn mụrụ bụ Libnaị na Shimiaị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ 18  Ụmụ nwoke Kohat mụrụ bụ Amram, Izha, Hebrọn, na Ọziel.+ Kohat dịrị ndụ otu narị afọ na iri atọ na atọ (133). 19  Ụmụ nwoke Meraraị mụrụ bụ Malaị na Mushaị. Ha bụ ndị ezinụlọ ndị Livaị, n’ọnụmara n’ọnụmara.+ 20  Amram lụrụ Jokebed, nwanne nna ya.+ Ọ mụụrụ ya Erọn na Mosis.+ Amram dịrị ndụ otu narị afọ na iri atọ na asaa (137). 21  Ụmụ nwoke Izha mụrụ bụ Kora,+ Nefeg, na Zikraị. 22  Ụmụ nwoke Ọziel mụrụ bụ Mishel, Elzefan,+ na Sitraị. 23  Erọn lụrụ Elaịsheba nwa Aminadab, nwanne nwaanyị Nashọn.+ Ọ mụụrụ ya Nedab, Abaịhu, Elieza, na Ịtama.+ 24  Ụmụ nwoke Kora mụrụ bụ Asịa, Elkena, na Abayasaf.+ Ha bụ ezinụlọ ndị si n’ụlọ Kora.+ 25  Elieza,+ nwa Erọn, lụrụ otu n’ime ụmụ nwaanyị Putiel mụrụ. Ọ mụụrụ ya Finihas.+ Ha bụ ndị isi ọnụmara Livaị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ 26  Ọ bụ ha bụ Erọn na Mosis ahụ Jehova gwara, sị: “Sinụ n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel, n’ìgwè n’ìgwè.”*+ 27  Ọ bụ ha gwara Fero, eze Ijipt, okwu ka e si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel. Ọ bụ ha bụ Mosis na Erọn.+ 28  N’ụbọchị ahụ Jehova gwara Mosis okwu n’Ijipt, 29  Jehova gwara Mosis, sị: “Abụ m Jehova. Gwa Fero, eze Ijipt, ihe niile m na-agwa gị.” 30  Mosis wee kwuo n’ihu Jehova, sị: “Legodị, ọ na-esiri m ike ikwu okwu.* Olee otú Fero ga-esi gee m ntị?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “m weliri aka m.”
Na Hibru, “e bighị m úgwù n’egbugbere ọnụ.”
Na Hibru, “n’ụsụụ ndị agha ha dị iche iche.”
Na Hibru, “e bighị m úgwù n’egbugbere ọnụ.”