ISI NKE 11
Ihe Ị Ga-eme Ka Baịbụl Baara Gị Ezigbo Uru
Ò nwetụla ihe ị chọrọ ime, ma ịmalite ime ya esiere gị ike n’ihi otú o si buo ibu? Ka ihe ahụ dịrị gị mfe ime, i nwere ike ikeri ya ekeri. Ụdị ihe a ka anyị nwere ike ime gbasara ịgụ Baịbụl. I nwere ike ịna-ajụ, sị, ‘Olee ebe m ga-ebido ebido?’ N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụmụ obere ihe ndị ị ga-eme ka ịgụ Baịbụl na ịmụ ya na-atọ gị ụtọ.
1. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agụ Baịbụl mgbe niile?
Ọ bụrụ na mmadụ ana-agụ Baịbụl ma ọ bụ “Iwu Jehova” mgbe niile, obi ga na-atọ ya ụtọ, ihe ana-agakwara ya nke ọma. (Gụọ Abụ Ọma 1:1-3.) Iji malite, jiri nkeji ole na ole na-agụ ya kwa ụbọchị. Ịgụ ya ga-abịa tọwa gị ụtọ ma ị hụ na ị na-amụta ihe.
2. Olee ihe ị ga-eme ka ịgụ Baịbụl baara gị uru?
Anyị chọọ ka ịgụ Baịbụl baara anyị uru, anyị kwesịrị ịna-eme anyị gụtụ, anyị akwụsị, chebara ihe anyị na-agụ echiche. Anyị kwesịrị ịna-agụ ya “ma na-atụgharị uche na ya.” (Joshụa 1:8) Ị na-agụ Baịbụl, na-ajụ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘Gịnị ka ihe a na-akụziri m gbasara Jehova Chineke? Olee otú m ga-esi na-eme ihe a m gụrụ? Olee otú m ga-esi jiri amaokwu a nyere ndị ọzọ aka?’
3. Olee otú ị ga-esi ewepụta ohere ị ga-eji na-agụ Baịbụl?
Ọ̀ na-esiri gị ike iwepụta ohere ị ga-eji na-agụ Baịbụl? Ọ na-esiri ọtụtụ n’ime anyị ike. Gbalịa ‘na-eji oge gị eme ihe kacha mkpa.’ (Ndị Efesọs 5:16) Otú ị ga-esi eme ya bụ iwepụta oge a kapịrị ọnụ ị ga-eji na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ụfọdụ na-agụ Baịbụl n’isi ụtụtụ. Ndị ọzọ na-agụ ya n’oge ọzọ n’ụbọchị, dị ka n’oge ha kwụsitụrụ ọrụ n’ehihie. E nwekwara ndị na-agụ nke ha n’abalị tupu ha alakpuo. Olee oge nke ga-akara gịnwa mma?
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọkwu gị ụtọ. Chọpụtakwa otú ị ga-esi akwadebe nke ọma ka iji akwụkwọ a amụ Baịbụl na-atọ gị ụto.
Otú ahụ anyị nwere ike malite iri nri anyị na-eritụbeghị, ya atọwazie anyị ụtọ ka anyị nwere ike isi malite ịgụ Baịbụl, ya atọwazie anyị ụtọ
4. Mụta ịgụ Baịbụl otú ọ ga na-atọ gị ụtọ
Ịmalite ịgụ Baịbụl nwere ike isiri gị ike. Ma, anyị nwere ike ime ka ịgụ ya na-atọ anyị ụtọ otú ahụ mmadụ nwere ike malite iri nri ọ na-eritụbeghị, ya atọwazie ya ụtọ. Gụọnụ 1 Pita 2:2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Ọ bụrụ na ị na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, ì chere na e nwere mgbe ọ ga-eru ịgụ ya ana-atọzi gị ụtọ, ya ana-adịkwa gị ka oge i ji agụ ya ruwe eruwe?
Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ otú ịgụ Baịbụl si bido tọwa ụfọdụ ndị ụtọ. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Olee ihe ndị mere ka ịgụ Baịbụl na-esiri ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa anyị hụrụ na vidio a ike?
-
Gịnị nyeere ha aka ịna-agụ Baịbụl n’oge ha wepụtara maka ya?
-
Olee otú ha si mee ka ịgụ Baịbụl na-atọkwu ha ụtọ?
Ihe ndị ị ga-eme ná mmalite:
-
Na-agụ Baịbụl a sụgharịrị otú ndị mmadụ si asụ asụsụ unu ugbu a. I nwere ike na-agụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ma ọ bụrụ na ọ dị n’asụsụ ị na-asụ.
-
Buru ụzọ gụwa ebe ndị na-akacha amasị gị na Baịbụl. Ị chọọ ịmatakwu otú ị ga-esi eme ya, gụọ chaatị isiokwu ya bụ “Malite Ịgụ Baịbụl.”
-
Na-edetu otú i si na-agụ. Jiri chaatị isiokwu ya bụ “Katụ Ihe n’Ebe Ị Kwụsịrị n’Ọgụgụ Baịbụl Gị” na-eme ya. Ọ dị n’akwụkwọ a.
-
Na-eji JW Library® agụ Baịbụl. Ihe ị ga-eji na-aga na ya bụ ekwentị na-aga n’Ịntanet ma ọ bụkwanụ ihe ọzọ dị ka ya. I nwere ike ịnọ ebe ahụ gụọ Baịbụl ma ọ bụ gere ya egere n’agbanyeghị ebe ị nọ.
-
Na-agụ ebe a kpọrọ Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Ihe ị ga-ahụ ebe ahụ bụ map, chaatị, na ebe a kọwara okwu ndị dị na Baịbụl. Ha ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ.
5. Na-akwadebe akwadebe maka ọmụmụ ihe unu
Gụọnụ Abụ Ọma 119:34. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Gịnị mere o ji dị mma ka ị na-ekpe ekpere tupu gị agụwa Baịbụl ma ọ bụkwanụ tupu gị akwadebewe maka ọmụmụ ihe unu?
Olee ihe ị ga-eme ka ọmụmụ ihe unu na-abara gị ezigbo uru? Ị na-akwadebe ihe unu ga-amụ, gbalịa mee ihe ndị a:
-
A. Gụọ paragraf niile dị tupu ebe a kpọrọ “Mụtakwuo Ihe.”
-
B. Chọta amaokwu Baịbụl ndị e dere na ha ma gụọ ha. Gbalịakwa ka ị mata otú ha si akọwa ihe a na-ekwu n’isiokwu ahụ.
-
CH. Kanye ihe n’okpuru okwu ma ọ bụ n’ahịrịokwu zara ajụjụ nke ọ bụla. Ọ ga-eme ka ọ dịrị gị mfe ịza ajụjụ mgbe unu ga-amụwa ya.
Ị̀ ma ihe a?
Ndịàmà Jehova na-agụ Baịbụl dị iche iche. Ma, nke kacha amasị anyị bụ Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, n’ihi na a sụgharịrị ya nke ọma, ọ dị mfe ọgụgụ, aha Chineke dịkwa na ya n’ebe niile o kwesịrị ịdị.—Gụọ isiokwu gbara n’Ịntanet bụ́ “Ndịàmà Jehova Hà Nwere Baịbụl nke Ha?”
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ịmụ Baịbụl abụghị obere ọrụ, na ike ya adịghị ha, nakwa na ha enweghị ohere ya.
-
Gịnị ka i chere gbasara ihe a ha na-ekwu?
NCHỊKỌTA
Ị chọọ ka Baịbụl baara gị ezigbo uru, wepụta oge ị ga-eji na-agụ ya, na-ekpe ekpere ka ị ghọta ihe ị na-agụ, na-akwadebekwa akwadebe maka ọmụmụ ihe unu.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
-
Olee ihe ị ga-eme ka Baịbụl baara gị ezigbo uru?
-
Olee oge i nwere ike iwepụta n’ụbọchị ị ga-eji na-agụ ma na-amụ Baịbụl?
-
Gịnị mere o ji dị mma ịkwado akwado maka ọmụmụ ihe unu?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka ka ịgụ Baịbụl na-atọ gị ezigbo ụtọ.
“Olee Ihe Ị Ga-eme Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọ Gị Ụtọ?” (Ụlọ Nche Nke 1 2017)
Chọpụta ụzọ atọ i nwere ike isi na-agụ Baịbụl.
“Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka? —Nke 1: Na-agụ Baịbụl Gị” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)
Chọpụta ihe ị ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ.
Chọpụta ihe ndị gụrụla Baịbụl ọtụtụ afọ kwuru ga-enyere gị aka ka ịmụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ.