Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Ihe Baịbụl kwuru

 Alaeze Chineke bụ ọchịchị Jehova hiwere. Ọ dị n’eluigwe, ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ ya “alaeze eluigwe.” (Mak 1:14, 15; Matiu 4:17) Ọ bụ eziokwu na Alaeze Chineke na ọchịchị ụmụ mmadụ yitụrụ, ọ ka ya mma okpukpu iri.

  •   Ole Ndị Na-achị na Ya? Chineke chiri Jizọs Kraịst Eze n’Alaeze ya. O nyekwara ya ikike karịrị ikike ndị ọchịchị ụwa a nwere. (Matiu 28:18) Jizọs anaghị eji ikike a Chineke nyere ya echi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala. Otú anyị si mara bụ na mgbe ọ bịara n’ụwa, o nweghị onye o megburu, kama o ji obi ebere mesoo ụmụ mmadụ ihe. (Matiu 4:23; Mak 1:40, 41; 6:31-34; Luk 7:11-17) Chineke nyere Jizọs ikike ka ọ họta ụmụ mmadụ ndị ha na ya ga-eso chịa ụwa, ndị ọ họtara esighịkwa n’otu mba.—Mkpughe 5:9, 10.

  •   Afọ Ole Ka Ọ Ga-achịru? Ọchịchị ụmụ mmadụ na-agbanwe agbanwe, a ga-emechakwa bibie ha niile. Ma, Alaeze Chineke ga-achị ruo mgbe ebighị ebi, a gaghịkwa ebibi ya ebibi.—Daniel 2:44.

  •   Ole Ndị Ọ Na-achị? Ọ na-achị onye ọ bụla na-eme uche Chineke n’agbanyeghị obodo onye ahụ bi, na agbụrụ o si.—Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.

  •   Olee Iwu Chineke Nyere Ndị Alaeze Ya Na-achị? Iwu Chineke nyere ndị Alaeze ya na-achị kwuru ihe bụ ihe ọma na ihe ọjọọ. Iwu ahụ na-enyekwara ha aka ka ha na-akpa ezigbo àgwà. Dị ka ihe atụ, Baịbụl sịrị: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ. Nke abụọ, nke dị ka ya, bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’” (Matiu 22:37-39) Ihe mere ndị Alaeze Chineke na-achị ji na-emere ndị ọzọ ihe ọma bụ maka na ha hụrụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya.

  •   Gịnị Ka Ọ Na-akụziri Ndị Ọ Na-achị? Ọ bụ eziokwu na Alaeze Chineke achọghị ka ndị ọ na-achị na-eme otú masịrị ha, ọ na-akụziri ha otú ha ga-esi na-eme ihe Chineke chọrọ ka ha mee.—Aịzaya 48:17, 18.

  •   Gịnị Ka Ọ Ga-emere Ndị Ọ Na-achị? Alaeze Chineke abụghị ọchịchị fọọ fọjuo akpa. Kama, ọ ga-emere ụmụ mmadụ ihe niile Chineke bu n’obi imere ha. Ọ ga-emekwa ka ndị hụrụ Chineke n’anya dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa a mgbe ọ ga-aghọ paradaịs.—Aịzaya 35:1, 5, 6; Matiu 6:10; Mkpughe 21:1-4.