Gaa n'Isiokwu

Jizọs Ọ̀ Bụ Naanị Ezigbo Mmadụ Ka È Nwere Ihe Ọzọ Ọ̀ Bụ?

Jizọs Ọ̀ Bụ Naanị Ezigbo Mmadụ Ka È Nwere Ihe Ọzọ Ọ̀ Bụ?

Ihe Baịbụl kwuru

 Jizọs abụghị naanị ezigbo mmadụ. Ọ bụ ya bụ onye a kacha anụ aha ya n’ime ndị niile birila n’ụwa. Legodị ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị na-ede akwụkwọ kwuru gbasara Jizọs:

 Ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ H. G. Wells kwuru na ‘o nweghị onye birila n’ụwa a a ga-eji tụnyere Jizọs onye Nazaret.’

 Kenneth Scott Latourette, bụ́ onye Amerịka na-ede akụkọ, kwuru, sị: “Ná ndị niile birila ndụ n’ụwa a, ọ bụ otú Jizọs si bie ndụ kacha agbanwe ndụ ndị mmadụ ruokwa echi.”

 E nweela ọtụtụ ndị ezigbo mmadụ birila ndụ n’ụwa a. Ma, Baịbụl kwuru ihe mere o ji bụrụ otú Jizọs si bie ndụ kacha agbanwe ndụ ndị mmadụ. Mgbe Jizọs jụrụ ụmụazụ ya onye hanwa chere na ya bụ, otu n’ime ha zara ya, sị: “Ị bụ Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.”—Matiu 16:16.