Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova
Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.
Spen
Maka Ịgwa Anyị Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya
Mmadụ ò kwesịrị ịgwa anyị mgbe ọ ga-achọ ịbịa legharịa anya? Ee. Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, anyị ga-achọ ka ndị ọ bụla ga-abịa ilegharị anya gwa anyị agwa tupu ha abịa n’agbanyeghị ole ha ga-adị. Ọ ga-adị mma ma unu gwa anyị ọ dịkarịa ala otu izu tupu oge unu ga-achọ ịbịa eruo. Ya bụrụ n’oge ezumike ka unu ga-achọ ịbịa, biko gwanụ anyị n’ezigbo oge.
Ọ bụrụ na ị gwaghị anyị agwa tupu gị abịa, ị̀ ka nwere ike ịga legharịa anya? O nwere ike anyị agaghị ekwe ka ị gaa legharịa anya. Anyị enweghị ebe ga-aba ọtụtụ mmadụ, n’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka anyị nwere ike ịkpọgharị n’ụbọchị.
Olee oge i kwesịrị irute n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Iji hụ na ị malitere n’oge legharịwa anya, biko gbaa mbọ rute ọ dịkarịa ala nkeji iri tupu oge i kwuru na ị ga-achọ ịmalite ilegharị anya eruo.
Olee otú ị ga-esi agwa anyị na ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Pịa ebe e dere “Kwuo Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya.”
Ì nwere ike ịkagbu oge ị chọrọ ịbịa legharịa anya ma ọ bụ gbanwee ya? Ee. Pịa ebe e dere “Lee Oge I Tinyere ma ọ bụ Gbanwee Ya.”
Ọ bụrụkwanụ na mmadụ ole anyị chọrọ ịkpọgharị n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya ezuola? Nọgide na-ele n’adres Ịntanet anyị n’ihi na anyị nwere ike ikwe ka ị bịa legharịa anya n’ụbọchị ahụ ma ọ bụrụ na ndị tinyeburu ụbọchị ahụ akagbuo ma ọ bụ yigharịa ya.
Adres Ya
Testigos Cristianos de Jehová
Ctra. M-108 Torrejón-Ajalvir, km. 5
28864 AJALVIR (MADRID)
SPAIN
+34 918-879-700
Ihe A Na-eme
Ha na-ahazi ọrụ ikwusa ozi ọma na Spen, Andọra, na Jibrọlta. Ha na-asụgharị akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Baskue, Katalan, Galishian, Spanish, Asụsụ Ndị Ogbi nke Spen, na asụsụ Valenshian. Ha na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì n’asụsụ Spen. Ndị mmadụ bịa ilegharị anya n’alaka ụlọ ọrụ anyị, a na-akọrọ ha gbasara otú Ndịàmà Jehova si malite ikwusa ozi ọma na Spen.