Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị

To provide you with the best possible experience, we use cookies and similar technologies. Some cookies are necessary to make our website work and cannot be refused. You can accept or decline the use of additional cookies, which we use only to improve your experience. None of this data will ever be sold or used for marketing. To learn more, read the Global Policy on Use of Cookies and Similar Technologies. You can customize your settings at any time by going to Privacy Settings.

Gaa n'Isiokwu

Ebe Onyeàmà Jehova ji Baịbụl na-akọrọ mmadụ ihe ndị o kweere

Ndịàmà Jehova Hà Bụ Ndị Protestant?

Ndịàmà Jehova Hà Bụ Ndị Protestant?

 Mba. Ndịàmà Jehova bụ Ndị Kraịst. Anyị abụghị ndị Protestant. N’ihi gịnị?

 Ndị Protestant bụ “ndị okpukpe na-agba okpukpe Katọlik ụkwụ.” Ọ bụ eziokwu na anyị ekweghị n’ihe ndị Katọlik na-akụzi, ma e nwere ihe ụfọdụ mere anyị ji kwuo na anyị abụghị ndị Protestant. Ihe ndị ahụ bụ:

  1.   Ụfọdụ ihe ndị Protestant na-akụzi abụghị ihe Baịbụl na-akụzi. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na “e nwere otu Chineke,” ọ bụghị Atọ n’Ime Otu. (1 Timoti 2:5; Jọn 14:28) Baịbụl kwukwara hoo haa na ntaramahụhụ Chineke na-enye ndị ajọ omume bụ ịla ha n’iyi kpamkpam, ọ bụghị ịtụba ha n’ọkụ ala mmụọ.​—Abụ Ọma 37:9; 2 Tesalonaịka 1:9.

  2.   Anyị anaghị agba okpukpe Katọlik ụkwụ ma ọ bụ na-achọ otú anyị ga-esi mee ka ha gbanwee ihe ha na-akụzi. Ihe anyị na-eme bụ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke, na inyere ha aka ikwere n’ozi ọma ahụ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Mkpa anyị abụghị ime ka ndị okpukpe gbanwee ihe ha na-akụzi. Kama, mkpa anyị bụ ịkụziri ndị nwere mmasị eziokwu banyere Chineke na Okwu ya bụ́ Baịbụl.​—Ndị Kọlọsi 1:​9, 10; 2 Timoti 2:​24, 25.