BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ
‘Anaghịzi M Echi Nwunye M Ọnụ n’Ala’
A Mụrụ M n’Afọ: 1973
Abụ M Onye: Yuganda
Ndụ M Biri: Abụ m onye tigbuo zọgbuo, na-aṅụ oké mmanya, na-akwakwa iko
NDỤ M BIRI NA MBỤ
Amụrụ m na Gomba dị na Yuganda. Ọtụtụ ndị obodo anyị dara ezigbo ogbenye. Ọkụ eletrik adịghị n’obodo anyị, n’ihi ya, ihe anyị na-eji ahụ ụzọ n’abalị bụ lampụ.
Papa m na mama m bụ ndị ọrụ ugbo. Ha si Rụwanda kwaga Yuganda. Ihe ha na-akọ bụ kọfị na unere. Ha na-ejizi unere ahụ emepụta mmanya a ma ama a na-akpọ waragi. Papa m na mama m na-azụkwa ọkụkọ, ewu, ézì, na ehi. Omenala obodo anyị na otú e si zulite m mere ka m chee na nwaanyị ga na-erubere di ya isi n’ihe niile, ọ gaghịkwa anwa anwa kwuo ihe o chere.
Mgbe m dị afọ iri abụọ na atọ, m kwagara Rụwanda. N’ebe ahụ, mụ na ndị ọgbọ m na-agakarị agba egwú n’ụlọ oriri na nkwari dị iche iche. E nwere otu nke m gagidere, ndị na-elekọta ya enyezie m ikike ịna-abịa ya n’akwụghị ụgwọ. Ile fim a na-alụ ọgụ ma na-eme tigbuo zọgbuo na-atọ m ezigbo ụtọ. Ụdị fim a m na-ele na ndị mụ na ha na-akpa mere ka m bụrụ onye tigbuo zọgbuo, na-aṅụ oké mmanya, na-akwakwa iko.
N’afọ 2000, mụ na otu nwa agbọghọ malitere ibi, aha ya bụ Skolastique Kabagwira. Anyị mụrụ ụmụ atọ. N’ihi ihe m chere kemgbe m dị obere, m na-achọkarị ka ọ na-egburu m ikpere n’ala mgbe ọ na-ekele m ma ọ bụ mgbe ọ na-agwa m ihe ọ chọrọ ka m meere ya. M chekwara na ihe niile anyị nwere bụ nke m nakwa na m nwere ike iji ha eme ihe ọ bụla masịrị m. M na-apụkarị n’abalị, ṅụraakwa anya tupu mụ alọta n’elekere atọ nke isi ụtụtụ. Ọ bụrụ na m lọta kụọ aka n’ụzọ, Skolastique egbuo oge ịbịa mepeere m ụzọ, m na-akụtara ya isi aba okpu.
N’oge ahụ, ọ bụ m na-elekọta otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka iche nche. A na-akwụkwa m ezigbo ụgwọ. Ọ na-abụ, anyị nọrọ n’ụlọ, Skolastique na-agwa m ka m soro ya kpewe chọọchị pentikọstal. O chere na ọ ga-eme ka m gbanwee. Ma, ekwetaghị m iso ya kpewe chọọchị ahụ. Kama iso ya kpewe chọọchị ahụ, mụ na nwaanyị ọzọ malitere ịkpa. N’ihi otú a m si echi Skolastique ọnụ n’ala nakwa iko m na-akwa, ọ kpọọrọ ụmụ atọ anyị laa na nke papa ya na mama ya.
Otu enyi anyị katatụrụla ahụ́ bịara dụọ m ọdụ maka otú m si ebi ndụ. Ọ gwara m ka m gaa kpọlata Skolastique, gwakwa m na ọmarịcha ụmụ m ekwesịghị ịnọ iche, mụnwa anọrọ iche. N’ihi ya n’afọ 2005, m kwụsịrị ịṅụ oké mmanya, hapụ nwaanyị nke ọzọ ahụ mụ na ya na-akpa, kpọlatakwa Skolastique. Anyị mechara lụọ n’afọ 2006. Ma, m ka na-agwa ya okwu ọjọọ, na-etikwa ya ihe.
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M
N’afọ 2008, otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Joël bịara na nke anyị ka o zie anyị ozi ọma, m gekwara ya ntị. Ya na Onyeàmà Jehova ọzọ aha ya bụ Bonaventure na-eso achọta m mgbe niile ka anyị kwurịta ihe dị na Baịbụl. Ha bịara ugboro ugboro ruo ọtụtụ ọnwa. M jụrụ ha ọtụtụ ajụjụ, karịchaa gbasara ihe dị n’akwụkwọ Mkpughe. Ihe m bu n’obi ajụ ha ajụjụ ndị ahụ bụ iji gosi ha na ha amaghị ihe ha na-akọ. Dị ka ihe atụ, m jụrụ ha ihe mere ha ji ekwu na “oké ìgwè mmadụ” e kwuru gbasara ha ná Mkpughe 7:9 ga-ebi n’ụwa ebe ọ bụkwanụ na amaokwu ahụ kwuru na ha “guzo n’ihu ocheeze [Chineke] nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ,” bụ́ Jịzọs Kraịst. Joël weturu obi zaa m ajụjụ m niile. Dị ka ihe atụ, ọ gụụrụ m Aịzaya 66:1, ebe kwuru na Chineke kpọrọ ụwa ‘ihe o ji agbakwasị ụkwụ.’ Ihe a ebe a kwuru gosiri na oké ìgwè mmadụ ahụ nọ n’ihu Chineke n’eziokwu n’agbanyeghị na ha nọ n’ụwa. M gụkwara Abụ Ọma 37:29, ebe kwuru na ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.
M mechara kweta ka anyị na ha na-amụ Baịbụl. N’ihi ya, Bonaventure malitere ịmụrụ mụ na Skolastique ihe. Ka anyị na-amụ Baịbụl, ọ bịara gụwa m agụụ ịgbanwe otú m si ebi ndụ. M mụtara otú m ga-esi na-akwanyere nwunye m ùgwù. Anaghịzi m achọ ka ọ na-egburu m ikpere n’ala mgbe ọ na-ekele m ma ọ bụ mgbe ọ na-agwa m ihe ọ chọrọ ka m meere ya. M kwụsịkwara iche na ihe niile anyị nwere bụ nke m, kwụsịkwa ile fim a na-eme tigbuo zọgbuo na ya. Ịgbanwe ihe ndị a ná ndụ m adịrịghị m mfe. Ihe nyeere m aka bụ ịgba mbọ na-ejide onwe m nakwa ịdị umeala n’obi.
Afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, m kpọgara ọkpara m aha ya bụ Christian na nke ndị ikwu anyị bi na Yuganda ka ya na ha biri. Ma mgbe m gụchara Diuterọnọmi 6:4-7, m chọpụtara na ọ bụ ọrụ dịịrị mụ na nwunye m ilekọta ụmụ anyị, otu n’ime ụzọ anyị sikwanụ elekọta ha bụ ịna-akụziri ha ihe ndị Baịbụl kwuru. Obi tọgburu anyị na Christian atọgbu mgbe anyị gara kpọlata ya.
URU NDỊ M RITERELA
Amụtala m na Jehova bụ Chineke na-eme ebere, obi sikwara m ike na ọ gbagharala m maka otú m si bie ndụ n’oge gara aga. Obi dị m ụtọ na Skolastique sooro m mụwa Baịbụl. Anyị abụọ nyefere Jehova onwe anyị, meekwa baptizim n’abalị anọ n’ọnwa Disemba afọ 2010. E nweghịzi onye n’ime anyị na-enyo ibe ya enyo ugbu a, ime ihe Baịbụl kwuru n’ezinụlọ anyị na-atọkwa anyị ụtọ. Obi dị nwunye m ezigbo ụtọ na m na-alọtazi ụlọ ozugbo ọrụ gbasara. Obi dịkwa ya ụtọ na m na-akwanyeziri ya ùgwù, nakwa na m na-ejizi obiọma emeso ya ihe. Ihe ọzọ na-eme ya obi ụtọ bụ na ekpebiela m na agaghịzi m na-aṅụ mmanya na-aba n’anya nakwa na anaghịzi m echi ya ọnụ n’ala. N’afọ 2015, a họpụtara m ịbụ okenye n’ọgbakọ anyị ka m nwee ike nye aka na-elekọta ụmụnna anyị. N’ime ụmụ ise anyị mụrụ, atọ n’ime ha emeela baptizim.
Mgbe Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ m Baịbụl, ekwetaghị m n’ihe ndị ha na-akụzi n’ebughị ụzọ chọpụta ma hà bụkwa eziokwu. Ma, otú ha si jiri Baịbụl zaa ajụjụ ndị m jụrụ ha masịrị m. Mụ na Skolastique kwetara na ndị na-ekwu na ha na-efe ezi Chineke kwesịrị ịna-erubere ya isi n’ihe niile, ọ bụghị ịhọrọ ndị ha ga-erubere isi na ndị ha na-agaghị erubere isi. M na-ekele Jehova na o kwere ka mụ na ya na ndị ọzọ na-efe ya dịrị ná mma. Icheta otú m si bie ndụ n’oge gara aga na-eme ka obi sie m ike na Chineke ga-enyeliri onye ọ bụla ji obi ya chọọ ịgbanwe otú o si ebi ndụ aka ịgbanwe mewe ihe dị ya mma.