Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A

Olee Otú Chineke Si Ele Ịlụ Agha Anya?

Olee Otú Chineke Si Ele Ịlụ Agha Anya?

Olee ihe ị ga-aza ma a jụọ gị ajụjụ ahụ? Ọtụtụ ndị chere na Chineke kwadoro ịlụ agha. Ha na-ekwu na Chineke nyere ụfọdụ ndị na-efe ya n’oge ochie iwu ka ha gaa agha. Baịbụl kwukwara ụdị ihe a. Ma, ndị ọzọ chọpụtara na Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ahụ ndị iro ha n’anya. (Matiu 5:43, 44) Ọ bụ ya mere ha ji were ya na Chineke mechara kwụsị ịkwado agha nakwa na ọ chọghịzi ka ndị mmadụ na-alụ agha taa.

Gịnị ka i chere? Chineke ọ̀ kwadoro ịlụ agha? Ọ bụrụ na ọ kwadoro ya, olee ndị ọ na-akwado n’agha ndị a na-alụ taa? Ọ bụrụ na ị mata azịza ajụjụ ndị a, ọ ga-enyere gị aka ịma otú i kwesịrị isi na-ele ịlụ agha anya. Ka e were ya na ị chọpụtara na Chineke kwadoro ka a na-alụ agha nakwa na ndị ị chọrọ ka ha merie n’agha ka Chineke kwadoro, obi ọ́ gaghị esi gị ike na ndị nke gị ga-emeri? Ma, oleekwanụ ihe ị ga-eme ma ị chọpụta na ndị ị chọrọ ka ha merie abụghị ndị Chineke chọrọ ka ha merie? I nwere ike ịgbanwe ebe ị kwụ.

Ma o nwere ihe ka mkpa. Ọ bụrụ na ị mata ma Chineke ọ̀ na-akwado agha, ọ ga-emetụta otú i si were Chineke. Ọ bụrụ na i so n’ọtụtụ ndị agha mewarala obi, ị ga-achọ ịma azịza ajụjụ ndị a, Chineke ọ̀ bụ onye ịlụ agha na-agụ agụụ, nke na-achọkwa ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ agha na-akpata? Ka ọ̀ ga-abụ na Chineke achọghị ịma ma à na-alụ agha ma ọ bụ na a naghị alụ nakwa na ọ chọghị ịma gbasara nsogbu ndị a na-emegbu emegbu na-enwe? Ihe ndị a ka ụfọdụ ndị na-eche.

O nwere ike iju gị anya ma ị mata na ihe Baịbụl kwuru dị iche n’ihe niile a ndị mmadụ na-eche. Ihe ọzọ bụ na kemgbe ụwa, Chineke agbanwebeghị otú o si ele ịlụ agha anya. Ka anyị lee ihe Baịbụl kwuru gbasara otú Chineke si lee ịlụ agha anya n’oge ochie nakwa n’oge Jizọs bịara n’ụwa. Ọ ga-enyeziri anyị aka ịma otú Chineke si ele ịlụ agha anya n’oge anyị a nakwa ma ụmụ mmadụ hà ga-anọgide na-alụ agha.