Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ànyị Kwesịrị Ikpegara Jizọs Ekpere?

Ànyị Kwesịrị Ikpegara Jizọs Ekpere?

N’OGE na-adịbeghị anya, otu onye na-eme nchọpụta jụrụ ihe karịrị narị ndị na-eto eto asatọ si na chọọchị dị iche iche ajụjụ. Ihe o dere n’akwụkwọ o ji jụọ ha ajụjụ bụ: “Jizọs na-aza ekpere.” Ọ jụziri ha ma hà kwetara ihe ahụ o dere ka ọ̀ bụ na ha ekwetaghị. E kee ndị na-eto eto ahụ ụzọ iri, ụzọ isii n’ime ha sịrị na ha kwetasiri ike na Jizọs na-aza ekpere. Ma, otu n’ime ha kagburu Jizọs, dee ya “Chineke.”

Olee ihe gịnwa chere? Ọ̀ bụ Jizọs ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere ka ọ̀ bụ Chineke? * Ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ na-akụziri ha otú ha ga-esi na-ekpe ekpere, n’ihi na ọ ga-eme ka anyị mata azịza ajụjụ a.

ÒNYE KA JIZỌS KỤZIIRI ANYỊ KA ANYỊ NA-EKPEGARA EKPERE?

Jizọs kụziiri anyị ma sikwa n’ekpere ya gosi anyị onye anyị kwesịrị ịna-ekpegara ekpere.

Ebe Jizọs kpegaara Nna ya nke eluigwe ekpere, ọ chọkwara ka mmadụ niile na-ekpegara Nna ya ekpere

IHE JIZỌS KỤZIRI: E nwere mgbe otu onye na-eso ụzọ Jizọs gwara ya, sị: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere.” Jizọs sịrị: “Mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere, sịnụ, ‘Nna.’” (Luk 11:1, 2) Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, ọ gwakwara ndị na-ege ya ntị ka ha na-ekpe ekpere. Ọ sịrị ha: “Kpekuo Nna gị nke nọ na nzuzo ekpere.” Jizọs gwakwara ha ihe mere ka obi sie ha ike. Ọ sịrị ha: “Nna unu maara ihe ndị na-akpa unu tupu unu arịọ ya.” (Matiu 6:6, 8) N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọ bụla, ọ ga-enye ya unu n’aha m.” (Jọn 16:23) N’eziokwu, Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpegara Jehova Chineke, bụ́ Nna ya na Nna anyị, ekpere.—Jọn 20:17.

IHE EKPERE YA GOSIRI ANYỊ: Jizọs kpekwara ekpere otú ahụ ọ gwara ndị ọzọ ka ha si na-ekpe. O kpere ekpere, sị: “Nna, Onyenwe eluigwe n’ụwa, ana m enye gị otutu n’ihu ọha.” (Luk 10:21) N’oge ọzọ Jizọs kpere ekpere, o “leliri anya n’eluigwe wee sị: ‘Nna, ana m ekele gị na ị nụwo olu m.’” (Jọn 11:41) Mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs nwụọ, o kpere ekpere, sị: “Nna, n’aka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” (Luk 23:46) Ebe Jizọs kpegaara Nna ya nke eluigwe bụ́ “Onyenwe eluigwe na ụwa” ekpere, ọ chọkwara ka mmadụ niile na-ekpegara Nna ya ekpere. (Matiu 11:25; 26:41, 42; 1 Jọn 2:6) Ma, ndị mbụ soro ụzọ Jizọs hà ghọtara na ọ bụ Chineke ka e kwesịrị ikpegara ekpere?

ÒNYE KA NDỊ MBỤ SORO ỤZỌ JIZỌS KPEGAARA EKPERE?

Izu ole na ole Jizọs laghachichara n’eluigwe, ndị na-achọghị iji ntị anụ gbasara Jizọs yiri ndị na-eso ụzọ ya egwu ma kpagbuo ha. (Ọrụ Ndịozi 4:18) Ndị na-eso ụzọ Jizọs kpere ekpere ozugbo. Ma, ònye ka ha kpegaara ya? Baịbụl kwuru na “ha ji otu obi gwa Chineke” okwu n’ekpere, rịọ ya ka o nyere ha aka ‘n’aha ohu ya dị nsọ bụ́ Jizọs.’ (Ọrụ Ndịozi 4:24, 30) N’eziokwu, ndị na-eso ụzọ Jizọs kpere ekpere otú ọ gwara ha ka ha si na-ekpe ya. Ha kpegaara Chineke ekpere, ọ bụghị Jizọs.

Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Pọl onyeozi kwuru otú ya na Ndị Kraịst ibe ya si kpee ekpere. N’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst ibe ya, ọ sịrị: “Anyị na-ekele Chineke bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst oge niile mgbe anyị na-ekpe ekpere maka unu.” (Ndị Kọlọsi 1:3) Pọl degakwaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ ozi, gwa ha ka ha “na-ekele Chineke bụ́ Nna anyị mgbe niile maka ihe niile n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.” (Ndị Efesọs 5:20) Ihe ndị a Pọl dere gosiri na ọ gbara ndị ọzọ ume ka ha na-ekpegara “Chineke bụ́ Nna anyị” ekpere “mgbe niile” maka ihe niile. Ma, o doro anya na ọ bụ n’aha Jizọs ka o kpere ekpere niile ahụ.—Ndị Kọlọsi 3:17.

Anyị ga-egosi na anyị hụrụ Jizọs n’anya ma anyị na-ekpe ekpere otú ahụ o kwuru ka anyị si na-ekpe. Ọ bụ ihe Ndị Kraịst oge ochie mere. (Jọn 14:15) Ọ bụrụ na anyị ana-ekpegara naanị Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova ekpere, obi ga-esikwu anyị ike na ọ ga na-aza ekpere anyị otú obi siri otu ọbụ abụ ike. Ọbụ ọbụ ahụ kwuru n’Abụ Ọma 116:1, 2, sị: “Ịhụnanya juru m obi n’ihi na Jehova na-anụ olu m . . . M ga-akpọku ya ụbọchị ndụ m niile.” *

^ para. 3 Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na Chineke na Jizọs ahaghị. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe dị iche na Chineke na Jizọs, gụọ isi nke 4 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ para. 11 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-anụ ekpere anyị, anyị ga-ejirịrị obi anyị niile na-eme ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere ekpere, gụọ isi nke 17 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?