Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú e si emeso ndị ohu mgbe ndị Rom na-achị ụwa?

Ígwè ndị Rom na-anyawa ndị ohu n’olu

E nwere ọtụtụ ndị ghọrọ ndị ohu mgbe ndị Rom na-achị ụwa. E jidere ụfọdụ n’ime ha mgbe e meriri obodo ha n’agha, a tọkwaara ụfọdụ atọrọ. Ọ na-abụ e jide ha ma ọ bụ tọrọ ha, e ree ha. Ha agaghịkwa ahụ obodo ha ma ọ bụ ezinụlọ ha anya ọzọ.

A na-akpọga ọtụtụ ndị ohu n’ebe a na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala. Ụfọdụ n’ime ha na-arụgide ọrụ n’ebe ahụ nwụọ. Ma, e nwere ndị nke a na-akpọga n’ubi ma ọ bụ n’ụlọ ndị mmadụ ka ha rụwa ọrụ. Ihe na-akatụrụ hanwa mfe karịa ndị nke a na-akpọga n’ebe a na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala. A na-anyawa ndị ohu ígwè n’olu, a na-edekwa ihe n’ígwè ahụ. Ihe a na-ede na ya bụ na ọ bụrụ na ohu ahụ agbafuo, a ga-enye onye ọ bụla kpọlatara ya onyinye. Ọ bụrụ na ohu agbalịa ọtụtụ ugboro ka ọ gbafuo, a na-eji ígwè ọkụ nwere mkpụrụ akwụkwọ bụ́ F daa ya n’egedege ihu. Mkpụrụ akwụkwọ a nọchiri anya okwu Latịn bụ́ fugitivus. Ihe ọ pụtara bụ onye gbara ọsọ.

Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Faịlimọn kwuru na Pọl onyeozi zighachiiri Faịlimọn ohu ya a na-akpọ Onesịmọs. Ọ bụ eziokwu na Faịlimọn kwesịrị ịta Onesịmọs ezigbo ahụhụ maka na ọ gbapụrụ n’ụlọ ya, Pọl gwara Faịlimọn ka o “jiri obiọma nabata” Onesịmọs ebe ọ bụ na ha aghọọla Ndị Kraịst hụrụ ibe ha n’anya.—Faịlimọn 10, 11, 15-18.

Gịnị ka e ji mara mba Finishia n’oge ochie?

Ihe e ji mara mba Finishia n’oge ochie bụ ihe e ji esiji ákwà ka ọ chawa pọpụl pọpụl. Ihe a na-akpọzi ebe ahụ Finishia dị bụ Lebanọn. Taya bụ obodo a ma ama na Finishia, e jikwa aha ya mara ihe ahụ e ji esiji ákwà. Eze Izrel bụ́ Sọlọmọn ji “ajị anụ e sijiri odo odo” ma ọ bụ pọpụl pọpụl chọọ ụlọ Chineke mma. Ọ bụ otu nwoke si Taya mepụtara ajị anụ ahụ.2 Ihe E Mere 2:13, 14.

Ihe ndị Taya ji esiji ákwà ka ọ chawa pọpụl pọpụl kacha oké ọnụ n’oge ahụ n’ihi na ọrụ a na-arụ tupu e nweta ya adịghị mfe. Ọrụ mbụ a na-arụ bụ ịga n’osimiri tụtụọ ihe a yiri eju e sere n’aka ekpe. A na-atụtụ ya ebe o buru ibu n’ihi na e nwere ike iji ihe ruru puku iri na abụọ sijie naanị otu ákwà. A tụtụchaa ha, a na-ewepụta ha ná mkpokoro ha ka e nweta ihe e ji esiji ákwà dị n’ime ha. E wepụtachaa ha, a na-etinye ha nnu ma dowe ha ebe ikuku ga na-eku ha nakwa ebe anwụ ga na-acha ha ruo abalị atọ. A na-etinyezi ha n’ite, kunye mmiri si n’osimiri n’ite ahụ ma sinye ya n’ọkụ na-anaghị enwusi ike ruo abalị ole na ole.

Ndị Finishia nọ na-emepụta ihe e ji esiji ákwà ka ọ chawa pọpụl pọpụl ma na-ere ya ruo ọtụtụ narị afọ. Ihe mere ha ji nwee ike ime ya bụ na mba Finishia chịrị ọtụtụ mba ndị ọzọ, azụmahịa dokwara ha anya. Ihe a hụrụ n’ebe ndị dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian ruo n’ebe ọwụwa anyanwụ obodo Kadiz nke dị na Spen gosiri na ha mepụtara ihe e ji esiji ákwà n’oge ochie.