Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 AKỤKỌ NDỤ

Ọrịa M Na-arịa Emeghị Ka Ike Gwụ M

Ọrịa M Na-arịa Emeghị Ka Ike Gwụ M

Onye ọ bụla hụrụ m ebe m nọ n’oche ndị ngwọrọ agaghị ekweta na ume dị m n’ahụ́ n’ihi otú m si dị gịrịgịrị. N’agbanyeghị na ike na-agwụ m mgbe niile, o nwere ihe na-enye m ume. Ka m kọwaa otú ọrịa si kpaa m aka ọjọọ na ihe na-enyere m aka idi nsogbu m.

Mgbe m dị afọ anọ

Obi na-atọ m ụtọ mgbe ọ bụla m chetara oge m dị obere. N’oge ahụ, mụ na papa m na mama m bi n’obere ụlọ dị n’otu ime obodo dị na Frans. Papa m rụụrụ m janglova m na-anya, obi na-atọkwa m ụtọ ịgbagharị n’ubi dị n’ebe ahụ anyị bi. N’afọ 1966, Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị, ha na papa m akpaa ezigbo nkata. Ọnwa asaa ha kpachara nkata ahụ, papa m kpebiri na ya ga-abụ Onyeàmà Jehova. N’oge na-adịghị anya, mama m kpebikwara ịbụ Onyeàmà Jehova. Ọ bụ n’ezinụlọ obi ụtọ a ka a zụlitere m.

Papa m na mama m bụ ndị Spen. Anyị mechakwara laghachi Spen. Obere oge anyị laghachiri, aka m na ụkwụ m malitere igbusi m mgbu ike. Anyị gara hụ ndị dọkịta dị iche iche ka a mara ma hà ga-agwọ m. Mgbe afọ abụọ gafere, anyị hụrụ otu dọkịta a ma ama. Dọkịta a gwara anyị hoo haa na a gaghịzi agwọtali ọrịa ahụ m na-arịa. Ozugbo mama m nụrụ ihe o kwuru, o bidoro ibe ákwá. Ihe m nọ na-anụ n’oge ahụ bụ okpookpo aha dị iche iche dọkịta ahụ kpọrọ ọrịa ahụ m na-arịa. N’agbanyeghị na aghọtachaghị m ihe o kwuru n’ihi na adị m naanị afọ iri mgbe ahụ, o doro m anya na ọ na-ekwu na ọrịa ahụ bụ ọrịa ọjọọ.

Dọkịta ahụ gwara papa m na mama m na ọ ga-aka mma ka ha kpọga m n’ebe a na-agwọ ụmụaka ndị rịaterela ọrịa aka. Mgbe anyị ruru ebe ahụ, ihe m hụrụ kụdara m obi. Iwu dị ebe ahụ karịrị akarị. Ndị sista nọ ebe ahụ kpụrụ m isi, yiwekwa m uwe na-amaghị mma. Anya mmiri juru m anya, mụ ajụwa onwe m ma m̀ ga-anọlikwa ebe a.

JEHOVA NYEERE M AKA

Ndị nọ ebe ahụ a kpọgara m na-ekpe Katọlik. Ma, ekweghị m eso ha n’ihi na papa m na mama m kụziiri m na ọ bụ Jehova ka m kwesịrị ife. O siiri ndị sista ahụ ike ịghọta ihe ndị m kọwaara ha mere na anaghị m eso ha eme ihe ndị ha na-eme. Arịọrọ m Jehova ka o nyere m aka. N’oge na-adịghị anya, ahụ́ dara m jụụ, ya adị m ka Jehova ọ̀ bịakwutere m jide m aka ka ihe ọ bụla ghara ime m.

Ọ bụ naanị n’ụbọchị Satọdee ka a na-ekwe ka papa m na mama m na-abịa eleta m. Ha bịawa, ha na-ewetara m akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl m ga na-agụ ka okwukwe m sie ike. A naghị ekwe ka ụmụaka ndị nọ ebe ahụ nwee akwụkwọ nke ha. Ma, ndị sista ahụ kwere ka m dowe akwụkwọ ndị ahụ,  m na-agụkwa Baịbụl m kwa ụbọchị. Ana m agwakwa ụmụ agbọghọ ndị ọzọ nọ ebe ahụ na enwere m olileanya ịdị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs nakwa na o nweghị onye ga-arịa ọrịa n’oge ahụ. (Mkpughe 21:3, 4) N’agbanyeghị na e nwere mgbe obi na-ajọ m njọ, owu ana-amakwa m, obi dị m ụtọ na okwukwe m nwere na Jehova sikwuru ike.

Mgbe ọnwa isii gachara, ndị dọkịta nọ n’ebe ahụ hapụrụ m ka m laa. N’agbanyeghị na agbakebeghị m, obi dị m ụtọ na alọtala m n’ụlọ anyị. Ụkwụ na aka ahụ na-egbu m mgbu bịara kakwuo njọ. Mgbe m na-etopụta agbọghọ, ọrịa ahụ ekweghị m ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Ma, ekpebiri m na aga m eji ndụ m jeere Nna m nke eluigwe ozi otú ike kwere m. E mere m baptizim n’oge m dị afọ iri na anọ. Ma, e nwere oge ọ na-adị m ka Chineke ọ̀ gbakụtara m azụ. M na-agwa ya n’ekpere, sị: ‘Gịnị mere i ji kwe ka m na-ata ahụhụ niile a? Biko, gwọọ m. Ọ̀ bụ na ị naghị ahụ ahụhụ m na-ata?’

Ihe adịrịghị m mfe n’oge m na-eto eto. Ọ bịara doo m anya na agaghị m agbake n’ọrịa ahụ. Amalitere m iji onwe m atụnyere ndị enyi m ahụ́ gbasiri ike, ya emee ka m chewe na o nweghị uru m bara. M malitekwara ịnọrọ onwe m. N’agbanyeghị nsogbu niile a, papa m na mama m na ndị enyi m nyeere m aka. E nwere otu enyi m nwaanyị aha ya bụ Alicia. Mgbe ọ bụla m chetara ya, obi na-atọ m ezigbo ụtọ. O ji afọ iri abụọ tọọ m. O nyeere m aka ka m wepụtụ obi m n’ọrịa ahụ m na-arịa ma kpawa ndị ọzọ nso.

IHE NDỊ M MERE KA NDỤ TỌWA M ỤTỌ

Mgbe m dị afọ iri na asatọ, ọrịa ahụ nyesiri m nsogbu ike nke na mgbe ọ bụla m gara ọmụmụ ihe lọta, ahụ́ na-agwụ m. Ma, ana m eji ohere ọ bụla dapụtaara m amụ Baịbụl nke ọma. Akwụkwọ Job na akwụkwọ Abụ Ọma mere ka m ghọta na ọ bụghị oge niile ka Jehova na-eme ka ihe ọjọọ ghara ime anyị. Kama, ọ na-enyere anyị aka ka anyị die nsogbu ọ bụla bịaara anyị. Arịrịọ m na-arịọ Jehova mgbe niile mere ka m nwee “ike karịrị ike nkịtị” na “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.”—2 Ndị Kọrịnt 4:7; Ndị Filipaị 4:6, 7.

Mgbe m dị afọ iri abụọ na abụọ, amalitere m ịnọ n’oche ndị ngwọrọ. Ịnọ n’oche ahụ adịghị m mma n’ihi na echere m na ọ ga-eme ka ndị mmadụ chee na abụ m akpa ọrịa. Ma, oche ahụ mechaziri baara m uru n’ihi na o mere ka m nwee ike ịna-eme ihe ụfọdụ m na-anabughị eme. Enyi m nwaanyị aha ya bụ Isabel gwara m ka m gbalịa soro ya kwusaa ozi ọma ruo awa iri isii n’otu ọnwa.

Mgbe ọ gwara m ihe a, echere m na ọ gaghị ekwe omume. Ma, arịọrọ m Jehova ka o nyere m aka. Ndị enyi m na ndị ezinụlọ m nyekwaara m aka ka m nwee ike ime ya. Mgbe m na-ama ihe na-emenụ, ọnwa ahụ agwụla, ụjọ ahụ na-atụ m na ihere ahụ na-eme m kwụsịkwara. Ozi ọma ahụ m kwusara tọrọ m ezigbo ụtọ. N’ihi ya, n’afọ 1996, ekpebiri m ikwusa ozi ọma oge niile. Ihe ọ pụtara bụ na m ga na-ezi ozi ọma awa iri itoolu kwa ọnwa. Obi dị m ụtọ na ekpebiri m ime otú ahụ. O meela ka m bịaruo Chineke nso, meekwa ka ahụ́ na-agbasitụ m ike. Ikwusa ozi ọma emeela ka m na-akọrọ ọtụtụ ndị ihe m kweere, meekwa ka m nyere ụfọdụ ndị aka ka ha na Chineke dịrị ná mma.

JEHOVA AHAPỤBEGHỊ M

N’afọ 2001, ụkwụ m abụọ gbajiri n’oge m nwere ihe mberede okporo ụzọ. Ka m dina n’ụlọ ọgwụ, ahụ́ niile ana-afụ m ezigbo ụfụ, ekpere m ekpere n’obi m, sị: “Jehova, biko, ahapụla m.” Otu nwaanyị nọ n’akụkụ m jụrụ m, sị, “Ị̀ bụ Onyeàmà Jehova?” Ebe ọ bụ na ike ikwu okwu adịghị m, ekwere m n’isi. Nwaanyị ahụ kwuziri, sị: “Ama m unu nke ọma. Ana m agụkarị magazin unu.” Ihe ahụ o kwuru kasiri m obi. Obi tọrọ m ụtọ na m ziri mmadụ ozi ọma n’agbanyeghị na ahụ́ gwụrụ m agwụ.

Mgbe ahụ́ dịtụwara m mma, amalitere m izi ndị ọzọ nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ ozi ọma n’agbanyeghị na m ka bu bandeeji n’ụkwụ. Kwa ụbọchị, mama m na-akwara m n’oche ndị ngwọrọ m aga eleta ndị ọzọ ahụ́ na-adịghị ka anyị mara otú ha mere. Anyị kelechaa ha, anyị na-enye ha akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ha ga-agụ. Ike na-agwụ m ma anyị gagharịchaa, ma Jehova na-enye m ume.

Mụ na papa m na mama m n’afọ 2003

Kemgbe afọ ole na ole gara aga, ahụ́ na-egbu m mgbu karịa otú ọ na-egbubu m. Ọnwụ papa m kpakwara  m aka ọjọọ. Ma, ana m agbalị ka m na-enwe obi ụtọ. Ihe na-enyere m aka bụ na m na-akpa ndị enyi m na ndị ikwu m nso. Mgbe ọ bụla mụ na ha nọ, m na-echefu nsogbu m. Ma, ọ bụrụ na o nweghị onye mụ na ya nọ, ihe m na-eme bụ ịgụ akwụkwọ ma ọ bụ ịmụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ mụ ejiri fon na-ezi ndị mmadụ ozi ọma.

Ihe m na-echetakarị bụ otú ihe ga-adị ma ụwa ghọọ paradaịs otú Chineke kwere ná nkwa

Ana m agbalịkwa ka ụmụ obere ihe ndị mmadụ na-ejighị akpọrọ ihe na-eme m obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ikuku ekusa m n’ihu ma ọ bụ mụ anụ ísì okooko osisi, obi na-atọ m ụtọ, mụ ekelee Chineke. Achọpụtakwara m na ime ihe ga-atọ ndị ọzọ ọchị na-enyere m aka. E nwere ihe mere otu ụbọchị mgbe enyi m kwa m n’oche ndị ngwọrọ na-aga ozi ọma. Ka anyị na-aga, ọ hapụrụ m ka o dee ihe n’akwụkwọ. Tupu anyị amata ihe na-emenụ, oche m ahụ eburula m gaa kụọ n’ụgbọala a dọwara otu ebe. Ihe ahụ merenụ juru anyị anya. Ma, mgbe anyị chọpụtara na o nweghị oké ihe mebirinụ, anyị dapụrụ n’ọchị.

E nwere ọtụtụ ihe m na-enweghị ike ime ugbu a, anaghịkwa m echegbu onwe m maka ha n’ihi na ha so n’ihe ndị m ga-eme n’ọdịnihu. Ihe m na-echetakarị bụ otú ihe ga-adị ma ụwa ghọọ paradaịs otú Chineke kwere ná nkwa. (2 Pita 3:13) Ihe na-agbata m n’obi bụ otú m ga-adị mgbe ahụ́ ga-agbasi m ike, mụ ejiri ụkwụ m abụọ na-awụgharị ma na-enwe obi ụtọ. Anaghị m eji ihe Eze Devid kwuru egwuri egwu. Ọ sịrị: “Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ; nwee obi ike, ka obi siekwa gị ike.” (Abụ Ọma 27:14) N’agbanyeghị na ahụ́ m akala njọ ugbu a, Jehova ka na-enye m ike. Ọ na-eme ka ike ghara ịgwụ m.