Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ihe A gba N’aka E Jighị Enyo Ele ya”

“Ihe A gba N’aka E Jighị Enyo Ele ya”

“Ihe A gba N’aka E Jighị Enyo Ele ya”

N’abalị iri na anọ n’ọnwa Jun n’afọ 2007, ụlọ ọrụ na-ezipụ akwụkwọ ozi nke mba Estonia wepụtara stampụ ọhụrụ a ga na-eji ezipụ akwụkwọ ozi. (E sere ya n’aka nri.) N’oge e wepụtara stampụ a, a mara ọkwa ná mba ahụ, sị: “E wepụtara stampụ a ka e jiri ya na-echeta ndị nwụrụ n’oge a chọrọ igbuchapụ ụfọdụ ndị n’Estonia n’oge Stalin na-achị.” N’agbata afọ 1941 na afọ 1951, a chụpụrụ ọtụtụ puku mmadụ n’Estonia.

ỤFỌDỤ ndị na-atụ ilu sị na “ihe a gba n’aka, e jighị enyo ele ya.” Ihe ilu a na-ekwu bụ na a naghị agbagha eziokwu agbagha. Anyị enweghị ike ịgbanwe ihe merela eme, naanị ihe anyị nwere ike ime bụ isi na ya mụta ihe. Sọlọmọn, bụ́ eze maara ihe nke chịrị Izrel n’oge ochie, kwuru, sị: ‘Ihe ndị a niile ka m chọpụtara mgbe m na-atụgharị uche banyere ọrụ niile a na-arụ n’ụwa, ebe mmadụ ụfọdụ ji ike ha na-emegbu ndị ọzọ imejọ ha.’—Ekliziastis 8:9, Bible Nsọ Ọhụụ.

Ihe ndị mere n’Estonia nakwa n’ọtụtụ mba ndị ọzọ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Yurop n’ihe dị ka afọ iri isii gara aga gosiri na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ọchịchị na-achị mba ndị ahụ n’oge ahụ kpataara ọtụtụ ndị ọ na-enweghị ihe ha mere ahụhụ dị ukwuu mgbe ha buuru ha n’ike buga ha n’ebe ndị dị anya n’obodo ha, tụọkwa ụfọdụ n’ime ha mkpọrọ n’ebe ha ga-anọ na-arụgbu onwe ha n’ọrụ.

Ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme n’Estonia kwuru na n’agbata afọ 1941 na afọ 1951, e buuru ụmụ amaala Estonia karịrị iri puku mmadụ anọ na puku isii n’ike buga ebe ọzọ. E bugara ọtụtụ n’ime ha ebe ọzọ n’ihi na ha nọ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche na nke na-achịnụ, ndị ọzọ abụrụ n’ihi mba ha si ma ọ bụkwanụ n’ihi ọnọdụ ha n’obodo. Ma ihe mere e ji kpara Ndịàmà Jehova aka bụ n’ihi okpukpe ha.

Otú E Si Kpagbuo Ndị Aka Ha Dị Ọcha

Ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Aigi Rahi-Tamm kwuru n’otu akwụkwọ e bipụtara n’afọ 2004, sị: “Malite n’afọ 1948 ruo n’afọ 1951, Ndịàmà Jehova na ndị ha na ha dị ná mma a kpọchiri dị mmadụ iri asaa na abụọ. Ma nke ka njọ mere n’abalị mbụ n’ọnwa Eprel n’afọ 1951. N’abalị ụbọchị ahụ, e si ná mba Estonia, Latvia, Lituenia, Moldova, ọdịda anyanwụ Yukren, nakwa Belorọshịa bukọrọ ọtụtụ mmadụ gawa ebe ha ga-anọ hụsie anya.”

Tupu afọ 1951, a kpọchiri ọtụtụ Ndịàmà Jehova bi na Estonia, menye ha ụjọ, gbaa ha ajụjụ ọnụ, ma tụọ ha mkpọrọ. O doro anya na ihe mere e ji malitezie ịchụpụ ha n’Estonia bụ ka a ghara inwekwa otu mkpụrụ Onyeàmà Jehova na ya.

Ọ bụrụ na i lee stampụ ahụ dị n’elu, ị ga-ahụ ebe e dere abalị mbụ n’ọnwa Eprel n’afọ 1951. Ị ga-ahụkwa ebe e dere 382 (narị atọ na iri asatọ na abụọ). Nke ahụ bụ Ndịàmà Jehova ole e si n’Estonia buga ebe ọzọ n’ụbọchị ahụ. Ndị ọzọ so na narị mmadụ atọ na iri asatọ na abụọ ahụ bụ ụmụ Ndịàmà Jehova ahụ, ụfọdụ ndị ikwu ha, nakwa ndị agbata obi ha na-abụghị Ndịàmà Jehova. N’ụbọchị ahụ, a nwụchiri ndị mmadụ n’ebe niile n’obodo ahụ. Mgbe o ruru n’abalị, a nwụbara ha niile, ma ndị agadi ma ụmụntakịrị, n’ụgbọ okporo ígwè e ji ebu ụmụ anụmanụ. A chọrọ ibu ha gawa Saịberịa.

N’oge ahụ, otu nwa agbọghọ Onyeàmà Jehova, nke aha ya bụ Ella Toom, * dị afọ iri abụọ na ise. O kwuru otú e si gbaa ya ajụjụ ọnụ n’oge ahụ. Ọ sịrị: “Otu onye uwe ojii gbalịrị ka o yie m egwu ma gwa m ka m kwụsị ikwusa ozi ọma. O nwere mgbe ọ jụrụ m, sị: ‘Ndụ ọ̀ na-atọkwadị gị ụtọ? Ka ị̀ chọrọ ka gị na Chi gị gaa nwụọ n’ime ọhịa na Saịberịa?’” Ma Ella atụghị egwu. Ọ nọgidere na-ekwusa ozi ọma. A kpọgara ya Saịberịa. Na Saịberịa, ọ na-abụ ya nọtụ n’ụlọ mkpọrọ nke a, a kpọfee ya n’ụlọ mkpọrọ ọzọ. Ihe a ka e megidere ya ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ isii.

E nwere nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Hiisi Lember. Nwa agbọghọ a bụ Onyeàmà Jehova. O so n’ọtụtụ narị mmadụ a na-ekpeghị ikpe n’ụlọikpe tupu e si n’Estonia buga ha ebe ọzọ. O chetara ihe mere n’abalị mbụ n’ọnwa Eprel n’afọ 1951. O kwuru, sị: “Ha bịakwutere anyị na mberede n’abalị ma nye anyị iwu, sị: ‘Anyị nyere unu naanị minit iri atọ ka unu kwakọta ngwongwo unu!’” N’abalị ahụ, a kpọọrọ Hiisi na nwa ya nwaanyị dị afọ isii gaa n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Ụgbọ okporo ígwè ahụ nọ na-aga n’ọdụ okporo ígwè dị iche iche na-ebutekwu Ndịàmà Jehova. Hiisi kwukwara, sị: “Ụgbọ okporo ígwè ahụ a kpọbara anyị na ya bụ nke e ji ebu anụmanụ. Ihe ọma meere anyị bụ na nsị anụmanụ ndị ahụ akpọọla. Ma ọ́ bụghị ya, ọ gaara esiri anyị ike ịnọ n’ebe ahụ. A fajuru anyị n’ụgbọ ahụ ka ànyị bụ ụmụ anụmanụ.”

Ha nọrọ izu abụọ n’ụgbọ okporo ígwè ahụ tupu ha eruo ebe a kpọ ha aga. Ma ha tagburu onwe ha n’ahụhụ na njem ahụ. Ụgbọ ahụ ruru unyi, ndị nọ n’ime ya karịkwara akarị. A kparịrị ha, ma ụmụaka ma ndị agadi, menyekwa ha ihere. Ụfọdụ n’ime ha bere ákwá ma jụ iri ihe oriri. Ma, Ndịàmà Jehova nyeere ibe ha aka ma gbaa ibe ha ume. Otú ha si mee ya bụ na ha nyere ibe ha nri ha nwere ma bụọ abụ ha ji efe Chineke. E bu ha gaa n’ebe a sị na ha ga-anọ ruo ebighị ebi, a gwakwara ha na ha agaghị alọta alọta.

Hiisi kwuru otú Ndịàmà Jehova ibe ya si nyere ya aka na njem ahụ. Ọ sịrị: “O nwere mgbe ụgbọ anyị kwụsịrị n’otu ọdụ ụgbọ okporo ígwè ebe ụgbọ ọzọ si Moldova kwụsịkwara. Anyị si n’otu oghere dị n’ụgbọ ahụ nụ ka otu nwoke na-ajụ anyị ndị anyị bụ na ebe anyị na-aga. Anyị gwara ya na anyị bụ Ndịàmà Jehova si Estonia, gwakwa ya na anyị amaghị ebe anyị na-aga. Ndịàmà Jehova nọ n’ụgbọ ahụ si Moldova nụkwara ihe ahụ anyị na ya na-ekwu. Ha si n’oghere dị n’okporo ígwè nke ha tụbatara anyị otu nnukwu ogbe achịcha na ụfọdụ mkpụrụ osisi.” Hiisi kwukwara, sị: “Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ bịara doo anyị anya na e si ná mba niile dị na Sọviet Yunion bute Ndịàmà Jehova na-ebuga ha ebe ọzọ.”

E nwere obere ụmụ agbọghọ abụọ na-ahụghị mama ha anya ruo ihe karịrị afọ isii. Nne ji ha abụọ. Aha ha bụ Corinna na Ene. Mama ha bụ Onyeàmà Jehova. E bu ụzọ jide mama ha ma kpọga ya n’ụlọ mkpọrọ ebe ọ ga-anọ na-arụgbu onwe ya n’ọrụ. Mgbe o ruziri n’abalị mbụ n’ọnwa Eprel ahụ, a kpụụrụ ha abụọ n’ebe ha nọ n’ụlọ ha kpụga ha n’ụgbọ okporo ígwè. Corinna ji obi ụtọ kwuo, sị, “N’ụgbọ ahụ, otu Onyeàmà Jehova nke nwere ụmụ abụọ gwara anyị na ya ga-elekọta anyị, gwakwa anyị na anyị na ya na ụmụ ya ga-ebikọta ọnụ.”

Gịnị meziri mgbe ha rutere n’ebe e bu ha gaa n’ala ịkpa Saịberịa? N’echi ya, a kpọpụtara ha ka ebe a kpọpụtara ndị ohu a chọrọ ire ere. Ụfọdụ ụmụ nwoke si n’ubi ha bịa ka ha kpọrọ ndị ga-arụrụ ha ọrụ n’ime ha. Corinna kwuru, sị: “Anyị nụrụ ka ha na-eserịta okwu, na-agwa ibe ha, sị: ‘Ị kpọtala onye ga-anyara gị traktọ. Onye nke a bụ nke m,’ ma ọ bụkwanụ, ‘Akpọrọla m ndị agadi abụọ. Gịnwa kpọrọtụkwanụ ndị agadi.’”

Corinna na Ene gbasiri ike. Ha mechara kwuo, sị: “O wutere anyị na anyị na mama anyị anọghị, ọ na-agụsikwa anyị agụụ ike ịhụ ya ọzọ!” N’agbanyeghị nke ahụ, ha tụkwasịrị Jehova obi, ihu na-abụkwa ha ọchị ọchị. Corinna kwukwara, sị: “Ọ dịkwa mma na mama anyị ahụghị anyị maka na mgbe ụfọdụ, anyị na-anọ n’èzí n’oyi na-arụ ọrụ, anyị anakwanụghị eyi uwe na-achụ oyi.”

O doro anya na ọtụtụ ndị ọ na-enweghị ihe ha mere tara nnọọ ahụhụ n’Estonia nakwa n’ebe ndị ọzọ. Ndịàmà Jehova sokwa ná ndị ahụ ji anya ha hụ ntị ha. (Gụọ igbe bụ́ “‘Ụdị Ihe Ọjọọ’ Ọnụ Na-enweghị Ike Ịkọ.”) N’agbanyeghị ahụhụ Ndịàmà Jehova nọ n’Estonia tara n’oge gara aga, ha ka ji obi ụtọ na-efesi Chineke ike.

Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu

Baịbụl gwara anyị na Jehova Chineke kpọrọ mmegbu asị. O kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a, onye ọ bụla nke na-ekpe ikpe na-ezighị ezi, bụ ihe arụ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị.” (Diuterọnọmi 25:16) Ọ bụ eziokwu na Chineke kwere ka ihe ọjọọ na-eme n’oge ndị garala aga, ma ọ ga-eme ka mmegbu na ajọ omume kwụsị n’oge na-adịghị anya. Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ; ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:10, 11.

N’eziokwu, ihe ga-adịrị anyị mma n’ọdịnihu! Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị agbanweli ihe ndị merela eme, anyị nwere ike ime ka ihe dịrị anyị mma n’ọdịnihu. Gbalịa ka gị na Chineke dịrị ná mma, ị ga-amụta ihe i nwere ike ime ka i soro ná ndị ihe ga-adịrị mma n’ọdịnihu n’oge mmadụ niile ga na-eme ezi omume.—Aịzaya 11:9

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Akụkọ ndụ Ella Toom gbara na Teta! (Bekee) April 2006, peeji nke 20-24.

[Igbe ndị dị na peeji nke 28]

“Ụdị Ihe Ọjọọ” Ọnụ Na-enweghị Ike Ịkọ

“Ọnụ enweghị ike ịkọ . . . ụdị ihe ọjọọ e mere ndị mmadụ ná mba anyị n’oge ahụ . . . , ọtụtụ nde mmadụ nwụrụ. E gburu ndị mmadụ n’ekpeghị ha ikpe, o nwekwanụghị ebe e dere ihe ọjọọ a e mere ha; a chụpụrụ ndị mmadụ ma kpọga ha n’ụlọ mkpọrọ ebe ha ga-anọ na-arụgbu onwe ha n’ọrụ. E nyeghị ha ihe ndị ruuru ha n’obodo n’ihi na a sịrị na ọrụ ha na-arụ adịghị mma ma ọ bụ na agbụrụ ha si abụghị ezigbo agbụrụ ma ọ bụ na o nweghị uru ha bara n’obodo. . . . Anyị kwesịrị ichebara ihe a echiche: E gburu ọtụtụ nde mmadụ n’ihi na e chere na ha bụ ndị ọjọọ nakwa n’ihi ebubo ụgha e boro ha.”—ONYEISI ALA RỌSHỊA NKE AHA YA BỤ MEDVEDEV. O KWURU IHE A N’ỌKTOBA 30, 2009.

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

1. Ella Toom

2. Hiisi Lember na ada ya bụ́ Maaja

3. Ene na nwanne ya Corinna