Ọ̀ Bụ Eziokwu na Ọrụ Ebube Na-eme Eme?—Ihe Atọ Ndị Mmadụ Na-ekwukarị
Ọ̀ Bụ Eziokwu na Ọrụ Ebube Na-eme Eme?—Ihe Atọ Ndị Mmadụ Na-ekwukarị
NKE MBỤ: Ọrụ ebube enweghị ike ime eme n’ihi na ọ dabaghị n’otú ihe ndị e kere eke si arụ ọrụ. Ọ bụ n’ihe ndị ọkà mmụta chọpụtarala banyere ihe ndị dị n’eluigwe na n’ụwa ka anyị si mata otú ihe ndị e kere eke si arụ ọrụ. Ma e nwere ike iji ihe anyị maara banyere otú ihe ndị e kere eke si arụ ọrụ tụnyere asụsụ a na-asụ n’obodo. Ọ bụ eziokwu na asụsụ ọ bụla nwere otú e si asụ ya, ma o nwere mgbe a na-agbanwetụ ihe n’otú e si asụ ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ma a bịa n’otú ihe ndị e kere eke si arụ ọrụ. Anyị enweghị ike ịmatacha otú ha si arụ ọrụ. (Job 38:4) Onye ọkà mmụta sayensị nwere ike iji ndụ ya niile mụọ otú otu ihe e kere eke si arụ ọrụ. Ma, ọ bụrụ na e nwee otu ihe merenụ nke dị iche n’ihe ọ mụtara, ọ na-aghọtazi na ọ bụghị otú ahụ o cheburu ihe ahụ si arụ ọrụ ka o si arụ mgbe niile. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ chere na ọbọgwụ mmiri niile na-acha ọcha, ọ hụhaala otu ọbọgwụ mmiri na-eji oji, ọ ga-edo ya anya na ọ bụghị ọbọgwụ mmiri niile na-acha ọcha.
E nwere otu akụkọ na-atọ ọchị nke gosiri na mmadụ nwere ike iche na ihe enweghị ike ime eme n’ihi na ọ maghị ihe niile banyere ihe ahụ. Otu nwoke aha ya bụ Jọn Lọk (onye dịrị ndụ malite n’afọ 1632 ruo n’afọ 1704) kọrọ ihe mere mgbe onye na-anọchite anya mba Holand na eze mba Taịland nọ na-akparịta ụka. Onye nnọchiteanya ahụ gwara eze Taịland na e nwere mgbe enyí na-aga ije n’elu mmiri na Holand. Eze ahụ ekwetaghị ihe nwoke ahụ gwara ya. O chere na ọ na-aghara ya ụgha. Ma ihe nwoke ahụ na-akọwara ya bụ ihe eze ahụ na-ahụtụbeghị ebe o mere. Eze ahụ amaghị na ọ bụrụ na mmiri akpụkọọ ma sie ezigbo ike, enyí nwere ike ịga ije n’elu ya. Eze ahụ chere na ihe ahụ enweghị ike ime eme n’ihi na ọ maghị ihe niile banyere ihe ahụ ha na-ekwu.
E nwere ihe ụfọdụ e mepụtarala n’oge a bụ́ ndị ọ na-enweghị onye ga-ekweta n’ihe dị ka afọ iri isii gara aga na ha ga-eme eme. Ka anyị hụ ụfọdụ n’ime ha:
● Otu ụgbọelu na-esi Niu Yọk buru ihe karịrị narị mmadụ asatọ gaa Sịngapọọ n’akwụsịghị
akwụsị. Ọ na-efe ezigbo ọsọ, na-agba ihe dị ka narị kilomita itoolu n’otu awa.● Ndị mmadụ na-anọ n’ebe dị iche iche n’ụwa na-ekwurịta okwu ma na-ahụ ibe ha n’otu mgbe ahụ.
● A na-etinye ọtụtụ puku egwú n’ihe na-aharughị ka otu mkpọ̀ mkpá ọkụ.
● Ndị dọkịta nwere ike isi n’ahụ́ mmadụ were obi ma ọ bụ akụkụ ahụ́ ọzọ tinye n’ahụ́ onye ọzọ.
Gịnị ka ihe niile a na-egosi anyị? Ha na-egosi anyị na ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ nwere ike ime ihe ndị e chere n’afọ ole na ole gara aga na ha agaghị emeli, o doro anya na Chineke onye kere eluigwe na ala na ihe niile dị n’ime ha nwere ike ime ihe ndị dị ịtụnanya bụ́ ndị anyị na-agaghị aghọtali ugbu a ma ọ bụ ndị anyị na-agaghị emeli ugbu a. *—Jenesis 18:14; Matiu 19:26.
NKE ABỤỌ: Ọ bụ ọrụ ebube ndị e dere na Baịbụl mere ndị mmadụ ji ekwere na ọrụ ebube na-eme eme. O nweghị ebe Baịbụl gwara anyị ka anyị kwere n’ọrụ ebube niile. Kama nke ahụ, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ikwere ọrụ ebube na ihe ịrịba ama ndị mmadụ na-eme. Ọ gwara anyị hoo haa, sị: “Ọnụnọ nke onye ahụ na-emebi iwu bụ dị ka ọrụ Setan si dị, nke ọ na-arụ site n’ịrụ ọrụ niile dị ike na ime ihe ịrịba ama ụgha na ịrụ ọrụ ebube ụgha, sitekwa n’iji ụdị ajọ omume niile na-eduhie ndị na-ala n’iyi.”—2 Tesalọnaịka 2:9, 10.
Jizọs Kraịst kwukwara na a ga-enwe ọtụtụ ndị ga-asị na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya, ma ha abụghị ezigbo ndị na-eso ụzọ ya. O kwuru na ụfọdụ ndị ga-asịdị ya: “Onyenweanyị, Onyenweanyị, Ọ bụ na anyị ebughị amụma n’aha gị, chụpụ ajọ mmụọ n’aha gị, ma rụkwaa ọtụtụ ọrụ ebube n’aha gị?” (Matiu 7:22, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Ma, Jizọs kwuru na ya agaghị anabata ndị ahụ n’ihi na ha abụghị ezigbo ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 7:23) N’ihi ya, o doro anya na Jizọs akụzirighị ndị na-eso ụzọ ya na ọrụ ebube niile si n’aka Chineke.
Chineke achọghị ka ndị na-efe ya kwere na ya naanị n’ihi ọrụ ebube ndị ha nụrụ na ya rụrụ. Kama nke ahụ, ha kwesịrị inwe ezigbo ihe mere ha ji kwere ihe ọ bụla ha kweere.—Ndị Hibru 11:1.
Ka anyị lebagodị anya n’otu n’ime ọrụ ebube a kacha mara amara a kọrọ na Baịbụl, ya bụ, mbilite n’ọnwụ Jizọs Kraịst. Ọ ga-enyere anyị aka ịghọta na ihe ọ bụla anyị kweere kwesịrị inwe ezigbo ihe mere anyị ji kwere ya. Ọtụtụ afọ a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ụfọdụ Ndị Kraịst bi na Kọrịnt malitere ikwu na a kpọliteghị Jizọs n’ọnwụ. Olee otú Pọl onyeozi si mee ka o doo Ndị Kraịst ahụ anya na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ? Ihe ọ gwara ha ọ̀ bụ naanị ka ha nwekwuo okwukwe? Mba. Legodị otú o si chetara ha ihe ndị mere eme nke gosiri na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ n’eziokwu. Ọ gwara ha na mgbe Jizọs nwụchara, e lie ya, “a kpọlitere ya n’ụbọchị nke atọ dị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru; na ọ pụtakwara n’ihu Sifas, e mesịa, ọ pụtara n’ihu ndị ozi iri na abụọ ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise n’otu mgbe, bụ́ ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha ka nọ ruo ugbu a.”—1 Ndị Kọrịnt 15:4-8.
Ọ̀ dị mkpa ka Ndị Kraịst ahụ kwere na ọrụ ebube ahụ mere eme? Pọl kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na a kpọliteghị Kraịst, ozi ọma anyị na-ekwusa bụ ihe efu n’ezie, okwukwe anyị bụkwa ihe efu.” (1 Ndị Kọrịnt 15:14) Pọl ma na okwu a dị ezigbo mkpa. Ọ ma na o nweghị otú ọ ga-esi bụrụ na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ya abụrụkwa na a kpọliteghị ya. O doro ya anya na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ n’ihi na ihe karịrị narị mmadụ ise ji anya ha hụ mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ọtụtụ n’ime ha ka dịkwa ndụ n’oge ahụ. N’eziokwu, ọ kaara ndị ahụ ji anya ha hụ mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ mma ịnwụ kama ikwu na a kpọliteghị Jizọs n’ọnwụ.—1 Ndị Kọrịnt 15:17-19.
NKE ATỌ: Ihe ahụ ndị na-agụghị akwụkwọ na-akpọ ọrụ ebube bụ ihe ndị na-emere onwe ha. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na ọrụ ebube ndị a kọrọ na Baịbụl bụ ihe ndị meere onwe ha, na ọ bụghị Chineke mere ka ha mee. Ha na-ekwu na ọ bụ ọrụ ebube ndị ahụ mere ka ndị mmadụ na-ekwere ihe ndị a kọrọ na Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na o nweela mgbe e ji ihe ndị na-emere onwe ha, dị ka ala ọma jijiji, ala mbize, na ọrịa rụọ ọrụ ebube ụfọdụ, ma e nwere ihe ndị na-ekwu na ọrụ ebube bụ ihe ndị na-emere onwe ha na-echefu. Ha na-echefu oge ọrụ ebube ndị ahụ e dere n’Akwụkwọ Nsọ mere.
Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ekwuola na ihe otiti mbụ e tiri ndị Ijipt, nke bụ́ ime ka Osimiri Naịl ghọọ ọbara, abụghị ọrụ ebube. Ha sịrị na ihe mere osimiri ahụ ji chawa ọbara ọbara bụ na mmiri sọọrọ ájá uhie na ụmụ irighiri ihe na-acha uhie uhie sọba n’osimiri ahụ. Ma Baịbụl kwuru na mmiri ahụ ghọrọ ọbara, ọ bụghị ájá uhie. Ọ bụrụ na mmadụ agụọ Ọpụpụ 7:14-21 ma leruo ya anya nke ọma, ọ ga-ahụ na ọ bụ mgbe Mozis gwara Erọn ka o jiri mkpara ya kụọ n’Osimiri Naịl ka osimiri ahụ ghọrọ ọbara. Ọ bụrụgodị na e nwere ihe ọzọ dị iche mere ka osimiri ahụ ghọọ ọbara, ọ ka bụkwa ọrụ ebube n’ihi na ọ bụ ozugbo Erọn kụrụ mkpara ya n’osimiri ahụ ka ọ ghọrọ ọbara!
O nwere ihe atụ ọzọ gosiri na ọ dị mkpa ka anyị chebara oge ọrụ ebube ji mee echiche. Mgbe mba Izrel na-achọ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, Osimiri Jọdan tojuru ejoju nke na ụmụ Izrel enweghị ike ịgafe. Baịbụl gwaziri anyị ihe merenụ. Ọ sịrị: “Ozugbo ndị bu Igbe ahụ bịarutere Jọdan, ụkwụ ndị nchụàjà bụ́ ndị bu Igbe ahụ azọnyekwa n’ọnụ ọnụ mmiri . . . , mmiri nke na-esi n’ebe mgbago asọdata wee guzoro otu ebe. O toro dị ka mmiri e gbochiri egbochi ruo n’Adam . . . bụ́ obodo dị n’akụkụ Zaretan.” (Jọshụa 3:15, 16) Ọ̀ bụ ala ọma jijiji ka ọ̀ bụ ala mbize mere ka osimiri a guzoro otu ebe? Baịbụl agwaghị anyị. Ma ihe mere o ji bụrụ ọrụ ebube bụ oge o mere. O mere kpọmkwem n’oge Jehova kwuru na ọ ga-eme.—Jọshụa 3:7, 8, 13.
N’ihi ihe ndị a anyị lebara anya na ha, ajụjụ bụ, Ọrụ ebube ọ̀ na-eme eme n’eziokwu? Ee, Baịbụl kwuru na ọ na-eme. Baịbụl gosikwara na ọrụ ebube abụghị ihe ndị na-emere onwe ha. Ebe ọ dị otú ahụ, mmadụ ò kwesịrị ikwu na ọrụ ebube enweghị ike ime eme maka na ọ naghị eme kwa ụbọchị?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Ọ bụrụ na ọ na-eme gị obi abụọ ma Chineke ọ̀ dị, gụọ akwụkwọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? ma ọ bụkwanụ gị agwa onye nyere gị magazin a ka o mee ka o doo gị anya.
[Foto dị na peeji nke 5]
N’ihe dị ka otu narị afọ gara aga, ọtụtụ ndị agaghị ekweta na e nwere ihe a na-akpọ ụgbọelu nke nwere ike ịgba ọtụtụ narị kilomita n’otu awa