Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị bụ “oche ikpe” e du Pọl gaa n’ihu ya?

Ọrụ Ndịozi 18:12, 13 kwuru na ndị Juu nọ na Kọrịnt boro Pọl ebubo na ọ na-ekwusa ozi ọma iwu na-akwadoghị. O kwukwara na ha duuru ya gaa “n’ihu oche ikpe,” ma ọ bụ beʹma. N’asụsụ Grik, beʹma pụtara “steepụ.” Na Kọrịnt oge ochie, e nwere ebe ikpo okwu a rụrụ n’èzí, nke dịkwa nso n’ọma ahịa. Ọ ga-abụ na ebe a a na-anọ agwa ọhaneze okwu dị ezigbo nso n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ebe a rụrụ ikpo okwu a mere ka ọ dị mfe ịnọ na ya na-agwa ọhaneze okwu. Ọ bụ nkume mabụl na-acha ọcha na nke na-acha anụnụ anụnụ ka e ji rụọ ya, jirikwa ihe dị iche iche a tụrụ atụ chọọ ya mma. O nwere ọnụ ụlọ abụọ ebe ndị mmadụ nwere ike ịnọ cheretụ ruo mgbe ha ga-apụta ikwu okwu, a chọkwara ala ha ezigbo mma, debekwa oche ndị e ji mabụl rụọ na ha.

Ọ ga-abụ na ebe ikpo okwu a bụ oche ikpe ahụ ndị Juu duuru Pọl gaa n’ihu ya ka Galio, bụ́ onye Rom na-achị ógbè Akeya, kpee ya ikpe. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ndị ọchịchị na-anọ anụrụ okwu e wetaara ha, ha na-anọkwa ebe ahụ agwa ìgwè mmadụ zukọrọnụ ihe ha kpebiri.

N’obodo ndị dị na Gris oge ochie, ndị ọchịchị na-ezukọkarị n’ihu oche ikpe a ekpe ikpe ma ọ bụ na-arụ ọrụ ndị ọzọ ha na-arụrụ ndị mmadụ. Ihe e dere na Matiu 27:19 nakwa na Jọn 19:13 n’asụsụ Grik, bụ́ ndị kọrọ otú e si kpee Jizọs ikpe, kwuru na Pọntiọs Paịlet nọ na beʹma ma ọ bụ n’ihu oche ikpe na-agwa ìgwè mmadụ gbakọrọnụ okwu.Ọrụ 12:21.

Gịnị mere ụfọdụ ndị Juu ji sụọ ngọngọ n’ihi otú e si gbuo Jizọs?

Pọl onyeozi kwuru banyere Ndị Kraịst oge mbụ, sị: “Anyị na-ekwusa Kraịst a kpọgidere n’osisi, ọ bụụrụ ndị Juu ihe ịsụ ngọngọ, ma bụụrụ ndị mba ọzọ ihe nzuzu.” (1 Ndị Kọrịnt 1:23) Ma gịnị mere ụfọdụ ndị Juu ga-eji sụọ ngọngọ n’ihi otú e si gbuo Jizọs?

Onye na-akọwa Baịbụl aha ya bụ Ben Witherington nke Atọ kwuru banyere otú e si gbuo Jizọs nakwa omenala mba Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu. Ọ sịrị na otú ahụ e si gbuo Jizọs bụ “ụzọ kacha eme ihere e nwere ike isi gbuo mmadụ. Ọ bụghị ụzọ mmadụ kwesịrị isi anwụ n’ihi okwukwe ya.” Nwoke ahụ kwukwara, sị: “Ndị mmadụ n’oge ahụ kweere na otú mmadụ si nwụọ na-egosi ụdị onye ọ bụ. N’ihi ya, ha weere Jizọs ka onye wayo, onye gbara ọchịchị mgba okpuru, na onye e kwesịrị igbu otú ahụ e si egbu ohu nupụrụ isi.” Otú a e si ewere onye a kwụgburu n’osisi n’oge ahụ na-egosi anyị na ihe ahụ Ndị Kraịst oge mbụ dere banyere otú e si gbuo Jizọs na otú e si kpọlite ya n’ọnwụ abụghị akụkọ ifo.