Otú E Si Emepụta Ákwà n’Oge Baịbụl na Otú Ákwà Ndị ahụ Na-acha
Otú E Si Emepụta Ákwà n’Oge Baịbụl na Otú Ákwà Ndị ahụ Na-acha
NA BAỊBỤL, e nwere ọtụtụ ebe e kwuru banyere ụdị uwe dị iche iche ndị mmadụ yiri n’oge ochie, otú uwe ndị ahụ na-acha, nakwa ihe ndị e ji mee ha.
N’eziokwu, Baịbụl abụghị akwụkwọ na-akọ banyere uwe na otú e si kwaa ha, ma, ihe mere e ji kwuo ihe ụfọdụ banyere uwe bụ iji nyere onye na-agụ Baịbụl aka ịghọta ihe ndị a na-ekwu okwu ha.
Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Adam na Iv dụkọtara akwụkwọ osisi fig ha ji kpuchie úkwù ha. Ma, Chineke mechara nye ha uwe ka mma. O meere ha “uwe akpụkpọ anụ gbadara agbada.”—Jenesis 3:7, 21.
N’Ọpụpụ isi nke 28 na nke 39, Baịbụl kwukwara ọtụtụ ihe banyere ihe dị iche iche nnukwu onye nchụàjà n’Izrel na-eyi. Ụfọdụ n’ime ha bụ ákwà linin a na-eyi n’ime, uwe mwụda ọcha, ákwà a kpara akpa a na-eke n’úkwù, uwe na-enweghị aka nke na-acha anụnụ anụnụ, efọd a kpara ihe mara mma n’elu ya, akpa obi, ákwà a na-eke n’isi, na mbadamba ihe na-egbuke egbuke nke e ji ọlaedo mee. Mgbe mmadụ na-agụ otú e si jiri ọtụtụ ihe ndị dị oké ọnụ ahịa kwaa uwe ndị ahụ nnukwu nchụàjà na-eyi, onye ahụ ga-aghọta na uwe ndị ahụ mara ezigbo mma.—Ọpụpụ 39:1-5, 22-29.
Uwe Ịlaịja onye amụma pụrụ nnọọ iche nke na e kwutehaala okwu ‘nwoke yi uwe e ji ajị anụ mee, nke kekwara ájị̀ akpụkpọ anụ n’úkwù ya,’ ndị mmadụ na-amata na ọ bụ Ịlaịja ka a na-ekwu okwu ya. Mgbe ọtụtụ narị afọ gafere, ụfọdụ ndị chere na Jọn Onye Na-eme Baptizim bụ Ịlaịja. Ọ ga-abụ na ihe mere ha ji chee otú ahụ bụ na uwe Ịlaịja na uwe Jọn yiri.—2 Ndị Eze 1:8; Matiu 3:4; Jọn 1:21.
* Ihe ndị a kacha kpọọ aha e ji emepụta ákwà bụ ajị anụ, nakwa okporo osisi flaks bụ́ nke e ji emepụta ákwà linin. Na Baịbụl, a kpọrọ Ebel “onye na-azụ atụrụ.” (Jenesis 4:2) Ma, Baịbụl agwaghị anyị ma Ebel ọ̀ na-azụ atụrụ ndị ahụ ka o si na ha na-enweta ajị anụ. Oge mbụ Baịbụl kwuru banyere uwe e ji ákwà linin ọma dụọ bụ mgbe Fero yiwere ya Josef. (Jenesis 41:42) O nweghị ebe Baịbụl kwuru na ndị Juu na-eji ogho eme uwe ndị ha na-eyi, ma mba ndị ha na Izrel oge ochie gbara agbata obi na-eji ogho eme ákwà ha na-eyi.
Ákwà Dị Iche Iche na Otú Ha Na-acha N’ọtụtụ ebe na Baịbụl, e kwuru ọtụtụ ihe ndị e ji mee uwe dị iche iche ndị mmadụ na-eyi, kwuokwa otú ha na-acha, na ihe ndị e ji esiji ha. E kwukwara otú e si emepụta eri, otú e si ekwe ákwà, na otú e si akwa ha.A na-eji okporo osisi flaks na ajị anụ emepụta eri dị iche iche, jirizie ha na-akpa ákwà. A na-esiji eri na ákwà ndị ahụ a kpara akpa ka ha chawa otú ọ bụla a chọrọ. A na-acha ákwà ahụ otú ọ ga-adị onye ga-eyi ya mma Ndị Ikpe 5:30.
n’ahụ́. A na-eji eri ndị na-acha ụdị ụcha dị iche iche akpa ihe n’ákwà ahụ ka ọ maa mma nakwa ka e nwee ike ire ya oké ọnụ.—N’ọtụtụ ebe na Baịbụl, e kwuru na a na-esiji ákwà ka ọ chawa anụnụ anụnụ, odo odo (pọpụl) ma ọ bụ ọbara ọbara. Jehova gwara ndị Izrel ka ha dụnye ‘eriri na-acha anụnụ anụnụ n’elu ebe ha dụnyere ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala’ uwe ha. Nke a ga na-echetara ha na ha bụ ndị dị nsọ na-efe ezi Chineke, bụ́ Jehova. (Ọnụ Ọgụgụ 15:38-40) Okwu Hibru bụ́ tekheʹleth pụtara ihe na-acha anụnụ anụnụ. Okwu Hibru ọzọ bụ́ ‘ar·ga·manʹ pụtakwara ihe na-acha pọpụl pọpụl. Ihe na-agbata ndị mmadụ n’obi ma ha nụ okwu Hibru ndị ahụ bụ otú uwe nnukwu onye nchụàjà na-acha nakwa otú ihe ndị e ji chọọ ụlọikwuu na ụlọ nsọ Chineke mma na-acha.
Ihe Ndị E Ji Chọọ Ụlọikwuu na Ụlọ Nsọ Chineke Mma Mgbe ụmụ Izrel nọ n’ala ịkpa, ha na-ezukọ n’ụlọikwuu efe Jehova. Ha mechaziri na-ezukọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem efe Jehova. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo ọtụtụ ihe banyere otú e si kwadebe ihe ndị e ji rụọ ụlọikwuu ahụ na ụlọ nsọ Sọlọmọn rụrụ, nakwa ákwà ndị e ji chọọ ha mma. Baịbụl kwukwara ọtụtụ ihe banyere ụdị ákwà e ji kpuchie ụlọikwuu ahụ na ndị e ji gebichie ọnụ ụzọ ya, kwuokwa otú ákwà ndị ahụ na-acha, otú e si kwee ha, sijie ha, dụọ ha, nakwa ihe ndị a kpara na ha iji chọọ ha mma.
Jehova nyere ndị omenkà abụọ aha ha bụ Bezalel na Oholiab nakwa ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ mmụọ ya ka ha nwee ike ịrụ ụlọikwuu mara mma bụ́ ebe ndị Izrel ga na-anọ efe ya. Ha rụkwara ya otú Jehova gwara ha. (Ọpụpụ 35:30-35) Ọpụpụ isi nke 26 kwuru ihe niile e ji rụọ ụlọikwuu ahụ na otú e si rụọ ha. Dị ka ihe atụ, e ji “eri linin a kpara akpa na eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo [pọpụl] na eri na-acha uhie uhie” kwee ákwà ụlọikwuu ahụ. Ákwà ndị ahụ sara mbara ma maa ezigbo mma. O nwere ike ịbụ n’Ijipt ka ụmụ Izrel wetara ọtụtụ n’ime ihe ndị e ji kwee ákwà ndị ahụ mgbe ha na-apụta n’Ijipt. A sara anya na mmiri kwee ákwà mgbochi siri ike nke kebiri “Ebe Nsọ na Ebe Kasị Nsọ” nke ụlọikwuu ahụ. A kpakwara ọtụtụ cherọb n’elu ákwà mgbochi ahụ iji chọọ ya mma. (Ọpụpụ 26:1, 31-33) Eze Sọlọmọn gwakwara ndị kwere ákwà ndị e ji chọọ ụlọ nsọ dị na Jeruselem mma ụdị ihe ahụ a gwara ndị kwere ákwà ndị e ji chọọ ụlọikwuu ahụ mma.—2 Ihe E Mere 2:1, 7.
Ihe ndị e dere na Baịbụl mere ka anyị ghọta na ndị Hibru oge ochie maara otú ha nwere ike isi jiri ihe ndị ha nwere mepụta uwe dị iche iche mara mma. Nke a na-egosi na ndị Izrel abụghị ndị ogbenye ọnụ ntụ na-eyi nkịrịka uwe, kama nke ahụ, ha nwere ọmarịcha uwe ndị ha na-eyi n’oge dị iche iche n’afọ. Ọ bụkwa otú ezinụlọ baruru ọgaranya na-ekpebi ụdị uwe ndị ha na-eyi.
Baịbụl gwara anyị na Chineke nyere ụmụ Izrel ala dị mma, “bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” (Ọpụpụ 3:8; Diuterọnọmi 26:9, 15) Jehova gọziri ha n’oge ha na-efe ya otú ọ chọrọ. Ihe na-agara ha nke ọma, obi dịkwa ha ụtọ, ihe niile zukwaara ha. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị, sị: “Juda na Izrel wee na-ebi n’obi iru ala, onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya, malite na Dan ruo Bia-shiba, n’ụbọchị niile nke [Eze] Sọlọmọn.”—1 Ndị Eze 4:25.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú e si eme ihe ndị a, gụọ igbe ndị dị n’isiokwu a.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 26, 27]
Ajị Anụ na Eri Linin
N’oge Baịbụl, ihe mere ndị mmadụ na-ejikarị azụ atụrụ bụ ka ha nweta ajị atụrụ na mmiri ara ya. Onye na-azụ atụrụ nwere ike isi n’atụrụ ole na ole nweta ajị anụ ga-ezu ịkpara ndị ezinụlọ ya niile ákwà. Ọ bụrụ na atụrụ ya dị ọtụtụ, o nwere ike iresi ndị na-akpa ákwà ajị anụ ndị fọrọ afọ. N’obodo ụfọdụ, e nwere ndị ọrụ ha bụ ịkpa ákwà na-ere. Kemgbe ụwa, ịkpacha ajị atụrụ so n’ọrụ ndị Izrel na-arụ kwa afọ.—Jenesis 31:19; 38:13; 1 Samuel 25:4, 11.
Ọ bụ okporo osisi flaks ka e ji eme ákwà linin bụ́ ákwà ọtụtụ ndị ma. (Ọpụpụ 9:31) A na-egbute okporo osisi a mgbe ọ fọrọ obere ka ọ kpọọ. A na-agba ya n’anwụ ka ọ kpọọ nke ọma, banyezie ya na mmiri ka o dee edee. Mgbe ọ kpọchara, a na-akụjasị ya, ma sepụta eri ndị dị na ya. A na-ahịkọta ha ka ha ghọọ eri e ji akpa ákwà. Ọ bụ ndị eze na ndị ukwu na-eyikarị uwe e ji eri linin mee.
[Foto]
Okporo osisi flaks kpọrọ akpọ tupu a banye ya na mmiri
[Igbe/Foto dị na peeji nke 27]
Otú E Si Enweta Eri E Ji Akpa Ákwà
Otu mkpụrụ eri nke si n’okporo osisi flaks ma ọ bụ n’ajị atụrụ ma ọ bụ n’ajị ewu anaghị esi ike, ọ naghịkwa eto ogologo. N’ihi ya, ọ bụrụ na a chọrọ inweta ajị anụ siri ike ma too ogologo, bụ́ nke a ga-eji kpaa ákwà, a na-atụkọta ajị anụ ahụ ọnụ. Baịbụl kwuru banyere onye bụ́ “ezigbo nwunye,” sị: “O setịpụwo aka ya were osisi e ji akpa ákwà, aka ya ejidewo mkpịsị e ji akpa ákwà.” (Ilu 31:10, 19) Amaokwu a na-akọwa otú e si emepụta eri e ji akpa ákwà. Ihe abụọ onye na-emepụta eri na-eji n’aka mgbe ọ na-emepụta eri bụ osisi e ji akpa ákwà na mkpịsị e ji akpa ákwà.
Nwaanyị na-emepụta eri na-eji otu aka jide osisi e ji akpa ákwà bụ́ nke a tụkọtara ajị anụ na ya. Ọ na-ejizi aka ya nke ọzọ ewere ụfọdụ ajị anụ ma hịkọta ha nke ọma ka ha ghọọ eri. Ihe ọ na-emezi bụ ịkụ eri ahụ n’isi mkpịsị ahụ e ji akpa ákwà. N’isi nke ọzọ nke mkpịsị ahụ, a na-enwe ihe dị okirikiri, nke dịkwa arọ na-ejide eri ahụ. Ọ na-akwụwa mkpịsị ahụ ọtọ ma na-atụgharị ya, si otú ahụ hịkọta eri ahụ ka ọ gbaa okpotokpo ma ọ bụ dị gịrịgịrị. Otú a ka ọ ga-emegide ya ruo mgbe ajị niile dị n’osisi e ji akpa ákwà ghọrọ otu ogologo eri a ga-ejizi kpaa ákwà ma ọ bụ nke a ga-esiji esiji.
[Okwu nkọwa dị na peeji nke 28, 29]
Isiji Ákwà
Mgbe e mepụtara eri ma ọ bụ kwechaa ákwà, a na-esiji ya ka ọ chawa otú ọ bụla a chọrọ ka ọ chawa. Ọ bụrụ na a chọrọ isiji ákwà nke ọma, a na-abịanye ya ọtụtụ ugboro na mmiri e tinyere ihe e ji esiji ákwà. Ebe ọ bụ na ihe e ji esiji ákwà na-adị oké ọnụ, a na-apịsị ákwà ahụ e sijiri mmiri ka e nwee ike iji mmiri ahụ a pịpụtara sijie ákwà ọzọ. A na-agbasazi eri ma ọ bụ ákwà ahụ e sijiri ka ọ kọọ.
Ebe ọ bụ na ndị oge ochie enweghị ihe ọgbara ọhụrụ e ji esiji ákwà, ha na-esi n’osisi ma ọ bụ n’anụmanụ enweta ihe ndị ha ji esiji ákwà. Dị ka ihe atụ, a na-esi n’akwụkwọ osisi almọnd nakwa ná mkpo mkpụrụ pọmigranet e gwere egwe enweta ihe na-acha odo odo e ji esiji ákwà. A na-esikwa n’ụgbụgbọ osisi pọmigranet enweta ihe ojii e ji esiji ákwà. Ebe e si enweta ihe na-acha uhie uhie e ji esiji ákwà bụ na mgbọrọgwụ osisi mada ma ọ bụ n’ahụhụ a na-akpọ kemis. A na-enweta ihe na-acha anụnụ anụnụ e ji esiji ákwà n’okooko osisi indigo. A na-esi n’eju dị iche iche na-ebi n’oké osimiri enweta ihe na-acha pọpụl pọpụl ma ọ bụ ọbara ọbara e ji esiji ákwà.
Eju ole ka e nwere ike iji ihe si na ya sijie otu uwe? Ihe e ji esiji ákwà a na-enweta n’otu eju na-adị ezigbo obere. Otu nchọpụta e mere gosiri na a ga-eweta eju ruru puku iri tupu e nwee ike inweta ihe a ga-eji sijie otu uwe mwụda ka ọ chawa ezigbo pọpụl pọpụl. A sịrị na n’oge Nabonidus na-achị Babịlọn, uwe e ji ajị anụ kwee, bụ́ nke e sijiri pọpụl pọpụl, na-adị oké ọnụ okpukpu iri anọ karịa nke e sijiri ka ọ chawa otú ọ bụla ọzọ. Ebe ọ bụ na mba Taya oge ochie bụ ndị a ma ama n’imepụta ihe ahụ dị oké ọnụ e ji esiji ákwà ka ọ chawa pọpụl pọpụl, ọ na-abụ e kwuwe okwu ihe na-acha pọpụl pọpụl e ji esiji ákwà, a na-asị na ọ bụ nke ndị Taya.
[Foto]
Mkpokoro eju a na-enweta n’oké osimiri
Ebe a na-esiji ákwà ka ọ chawa pọpụl pọpụl, n’obodo Tel Dọọ, n’Izrel. a rụrụ ya n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ abụọ gara aga
[Ebe E Si Nweta Foto]
The Tel Dor Project
[Igbe/Foto dị na peeji nke 29]
Ikwe Ákwà
Ọ bụ ihe e ji ekwe ákwà ka a na-eji ekwe eri ka ọ ghọọ ákwà a ga-eji kwaa uwe ma ọ bụ mee ihe ọzọ. E kwewe ákwà, a na-enwe eri ndị nke a na-edebe ogologo ogologo, nwee ndị nke a na-edebe uhiè uhiè. A na-ekwekọtazi eri ndị ahụ ka ha ghọọ ákwà.
N’oge Baịbụl, a na-akwụwa ihe e ji ekwe ákwà ọtọ ma ọ bụkwanụ e nyiwe ya enyiwe. Ọ bụrụ na a kwụwara ya ọtọ, a na-eji ihe dị arọ ejigide eri ndị nke gara ogologo ogologo. N’ọtụtụ ebe n’Izrel, a hụla ihe ndị dị arọ e ji ejigide ihe e ji ekwe ákwà n’oge ochie.
Ikwe ákwà so n’ọrụ a na-arụkarị n’ụlọ. Ma n’ebe ụfọdụ, ikwe ákwà bụ aka ọrụ mmadụ niile nọ n’obodo na-arụ. Dị ka ihe atụ, 1 Ihe E Mere 4:21 kwuru banyere “ezinụlọ dị iche iche nke ndị na-akpa ákwà ọma.” Ọ ga-abụ na ndị a bụ ndị ji ikwe ákwà mere aka ọrụ.
[Foto dị na peeji nke 27]
“Eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo [pọpụl].”—Ọpụpụ 26:1