I Lehaala Mmadụ Anya—Ì Kwesịrị Ikwere Ihe Mbụ Obi Gị Gwara Gị Banyere Onye Ahụ?
I Lehaala Mmadụ Anya—Ì Kwesịrị Ikwere Ihe Mbụ Obi Gị Gwara Gị Banyere Onye Ahụ?
MGBE otu dọkịta nọ ọdụ n’ụlọ ya na-ekiri televishọn, ọ hụrụ ka a na-agba otu minista nke mba Aịland ajụjụ ọnụ. Mgbe dọkịta ahụ leruru minista ahụ anya n’ihu, ọ hụrụ ihe o chere gosiri na e nwere ihe ga-eto minista ahụ n’ihu. Ọ gwaziri minista ahụ ka ọ gaa hụ dọkịta ozugbo.
Mgbe e lechara minista ahụ ahụ́, a chọpụtara na ihe dọkịta ahụ kwuru bụ eziokwu. E nwere ike ikwu na anya dị dọkịta ahụ nkọ, ya bụ, na o lehaala onye ọrịa anya, ya amata ihe na-arịa ya. Ụfọdụ ndị sịrị na ọ na-abụ ha lehaala mmadụ anya, ha amata ụdị onye ọ bụ, matakwa ma ọ̀ bụ onye ha ga-atụkwasịli obi.
Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị na-eme nnyocha agbalịala ka ha mụta otú e nwere ike isi chọpụta ụdị onye mmadụ bụ ma e lee onye ahụ anya. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru na “ihe ọmụmụ sayensị nke ga-eme ka a mata ụdị onye mmadụ bụ ma e lehaala ya anya n’ihu ma ọ bụ n’ahụ́ bụ sayensị adịgboroja.” N’ihe dị ka otu narị afọ na iri ise gara aga, e nwere ụfọdụ ndị ọkachamara ndị kọwara otú e nwere ike isi mata ụdị onye mmadụ bụ ma e lehaala ya anya n’ihu ma ọ bụ n’ahụ́. Ụfọdụ n’ime ha bụ Francis Galton, bụ́ onye ikwu Charles Darwin, nakwa Cesare Lombroso, bụ́ onye Ịtali, na ndị ọzọ. Ma, e chefuola ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ ha kwuru.
Ọtụtụ ndị taa ka kweere na e nwere ike ịchọpụta ụdị onye mmadụ bụ ma e lehaala ya anya. Ihe a ha kweere ọ̀ bụ eziokwu?
Ịmata Ụdị Onye Mmadụ Bụ Ma E Lehaala Ya Anya
N’akwụkwọ Samuel nke Mbụ, Baịbụl kọrọ banyere mgbe Samuel onye amụma lere mmadụ anya ma chee na ya amatala ụdị mmadụ onye ahụ bụ. Jehova Chineke gwara Samuel ka ọ gaa tee otu n’ime ụmụ Jesi, nke ga-aghọ eze Izrel n’ọdịnihu, mmanụ. Baịbụl kwuru, sị: “O wee ruo na mgbe [ụmụ Jesi] batara o wee hụ Elayab, ọ sịrị ozugbo ahụ: ‘N’ezie, onye Jehova tere mmanụ guzo n’ihu ya.’ Ma Jehova sịrị Samuel: ‘Elela anya n’ọdịdị ya na ogo ya, n’ihi na ajụwo m ya. N’ihi na ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ, n’ihi na mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.’” Ọ bụkwa otú ahụ ka ụmụ Jesi isii ndị ọzọ si pụta n’ihu Samuel, ma o nweghị nke Chineke họọrọ. N’ikpeazụ, Chineke họọrọ onye Samuel na Jesi na-atụghị anya ya. Onye ọ họọrọ bụ Devid, bụ́ nwa nwoke nke asatọ Jesi mụrụ, onye ọ na-enweghị onye chetadịrị ka a kpọta ya n’ihu Samuel.—1 Samuel 16:6-12.
Ụdị ihe ahụ ka na-emekwa taa. Afọ ole na ole gara aga na Jamanị, otu prọfesọ na-akụzi otú e si achọpụta ndị na-eme mpụ mere otu nchọpụta. O ji narị ụmụ akwụkwọ ise ndị chọrọ ịghọ ndị ọkà iwu mee nchọpụta ahụ. Ọ kpọtara mmadụ iri na abụọ ndị ụmụ akwụkwọ ahụ na-amaghị ndị ha bụ ka e jiri ha mee nchọpụta ahụ. Ndị so na mmadụ iri na abụọ ahụ bụ otu onyeisi ndị uwe ojii, otu ọkàikpe nke na-agba ndị mmadụ akwụkwọ n’ụlọikpe, otu onye na-elekọta ego na mahadum, na otu onye na-ahụ maka mmekọrịta ndị mmadụ na ọhaneze. Ndị ọzọ so n’ime ha bụ ndị ọkàiwu, ndị na-arụ ọrụ n’ụlọikpe, nakwa ndị omekome atọ a mara ikpe. A gwara ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha chọpụta ndị a ga-atụ mkpọrọ n’ime ha nakwa ihe mere a ga-eji tụọ ha mkpọrọ. Ha ga-ekwukwa ihe ha chere bụ aka ọrụ onye ọ bụla n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ. Otú ha ga-esi achọpụta ihe ndị a bụ ụdị egwuregwu mmadụ iri na abụọ ahụ kwuru na-amasị ha nakwa ile ha anya.
Gịnị ka a chọpụtara? E kee ụmụ akwụkwọ
ahụ ụzọ iri, ihe dị ka ụzọ asatọ n’ime ha chọpụtara ndị omekome atọ ahụ. Ma, ihe dị ka mmadụ isii n’ime mmadụ iri ọ bụla n’ụmụ akwụkwọ ahụ kwuchara na mmadụ itoolu ndị ahụ aka ha dị ọcha bụ ndị omekome. Otu onye n’ime mmadụ asaa ọ bụla n’ụmụ akwụkwọ ahụ chere na ọkàikpe ahụ na-agba ndị mmadụ akwụkwọ n’ụlọikpe ga-abụ onye na-ere ọgwụ ike. Otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla n’ime ha chekwara na onyeisi ndị uwe ojii ahụ bụ onye ohi. Nke a gosiri na ihe mbụ obi anyị na-agwa anyị ma anyị hụhaala mmadụ anaghị abụkarị eziokwu. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?Otú Mmadụ Dị n’Anya Nwere Ike Imegharị Anyị Anya
Oge mbụ anyị hụrụ mmadụ, anyị nwere ike ilewe onye ahụ anya ọma ma ọ bụ anya ọjọọ n’ihi ihe ndị mere anyị n’oge gara aga. Ihe nwere ike ime ka anyị lee onye ahụ anya otú ahụ bụ otú ndị mmadụ si were onye ahụ. Ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị lewe onye ahụ anya ọma ma ọ bụ anya ọjọọ bụ otú onye ahụ dị, mba o si, agbụrụ ya, ọkwà ya, ma ọ bụ okpukpe ọ na-ekpe.
Ọ bụrụ na ihe anyị chere bụ eziokwu, obi na-atọ anyị ụtọ. Nke a nwekwara ike ime ka obi sikwuo anyị ike na ihe ọ bụla anyị chere banyere mmadụ ozugbo anyị hụrụ ya bụ eziokwu. Ma olee ihe anyị na-eme ma ọ bụrụ na anyị aghọta na ihe ahụ anyị cheburu banyere onye ahụ abụtụdịghị eziokwu? Ọ bụrụ na anyị agwa onwe anyị eziokwu, anyị kwesịrị ịhapụ ihe ahụ anyị cheburu banyere onye ahụ ma gbalịa ịmata nke bụ́ eziokwu. Ma ọ́ bụghị ya, anyị nwere ike ịna-emejọ ndị ọzọ maka na nganga emegharịala anyị anya, mee ka anyị chee na ihe anyị chere bụ eziokwu.
Ọ bụrụ na mmadụ elee onye ọzọ anya ọjọọ ozugbo ọ hụrụ onye ahụ, ọ bụghị naanị onye ahụ ka ọ na-emejọ, ọ na-emejọkwa onwe ya. Dị ka ihe atụ, n’oge Jizọs nọ ndụ n’ụwa, ọtụtụ ndị Juu echetụdịghị na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na naanị ihe ha hụrụ mgbe ha lechara Jizọs anya bụ na Jizọs bụ nwa kapịnta nkịtị. Ọ bụ eziokwu na otú Jizọs si kụzie ihe na ọrụ ebube ndị ọ rụrụ masịrị ha, ha achọghị ịgbanwe ihe ha chere banyere Jizọs. Otú a ha si were Jizọs mere ka Jizọs gaa kwusawara ndị ọzọ ozi ọma, ọ bụkwa ya mere Jizọs ji sị ha: “A na-enye onye amụma nsọpụrụ ma e wezụga n’obodo a mụrụ ya nakwa n’ụlọ ya.”—Matiu 13:54-58.
Ọ dịla anya ndị Juu ahụ tụwara anya Mesaya ahụ. Ma mgbe Mesaya ahụ bịaziri, otú ha si were ya ozugbo ha hụrụ ya mere ka ha ghara ịmata na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ, o mekwara ka ha na Chineke ghara ịdịkwa ná mma. (Matiu 23:37-39) Otú ahụ ha si leda Jizọs anya bụkwa otú ha si leda ndị na-eso ụzọ ya. Ebe ọ bụ na ndị Juu gụrụ oké akwụkwọ na ndị isi okpukpe ha ledara ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị ogbenye, anya, o siiri ọtụtụ ndị Juu ike ikweta na o nwere ihe ha nwere ike ịmụta n’aka ndị a na-akụ azụ̀. Ahịa ghọrọ ndị ahụ siri ọnwụ were Jizọs otú ha si were ya ozugbo ha hụrụ ya. Ha enwelighị ike ịghọ ndị na-eso ụzọ Ọkpara Chineke.—Jọn 1:10-12.
Ụfọdụ Ndị Kwụsịrị Ile Jizọs Anya Otú Ha Sibu Ele Ya
Mgbe ụfọdụ ndị ha na Jizọs dịkọrọ ndụ hụrụ ọrụ ndị Jizọs rụrụ, ha kwụsịrị ile Jizọs anya otú ha sibu ele ya. (Jọn 7:45-52) Ọtụtụ ndị ezinụlọ Jizọs so n’ụfọdụ ndị ahụ gbanwere otú ha sibu ele Jizọs anya. Ná mmalite, ha echetụdịghị na nwanne ha Jizọs nwere ike ịbụ Mesaya ahụ. (Jọn 7:5) Ma, ọ dị mma na ha mechara gbanwee obi ha ma nwee okwukwe na ya. (Ọrụ 1:14; 1 Ndị Kọrịnt 9:5; Ndị Galeshia 1:19) Mgbe ọtụtụ afọ gafere, ụfọdụ ndị Juu bi na Rom mekwara otu ihe ahụ. Ha gbanwere obi ha mgbe ha nụrụ nke bụ́ eziokwu n’ọnụ Pọl onyeozi kama igewe asịrị ndị na-emegide ndị na-eso ụzọ Jizọs na-akọsa ebe niile. Mgbe ha nụchara ihe Pọl kwuru, ụfọdụ n’ime ha ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Ọrụ 28:22-24.
Taa, ọtụtụ ndị na-ele Ndịàmà Jehova anya ọjọọ. Gịnị kpatara ya? Ihe na-akpatakarị ya abụghị na ndị ahụ achọpụtala na ihe Ndịàmà Jehova kweere ma ọ bụ ihe ha na-eme esighị n’Akwụkwọ Nsọ. Kama, ọ na-esiri ha ike ikweta na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu. Ì chetara na ọ bụ otu ihe ahụ mere ka ọtụtụ ndị Juu ghara ikweta na ọ bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst na-akụzi eziokwu?
O kwesịghị iju anyị anya na a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ndị na-agbalị ime ka Jizọs. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jizọs gwara ezigbo ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mmadụ niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” Ma, ọ gbakwara ha ume, sị: “Ma onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 10:22.
Taa, Ndịàmà Jehova na-eme ihe Jizọs nyere ha n’iwu. Ha na-agbalịsi ike na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. (Matiu 28:19, 20) Ahịa ga-aghọ ndị kpọrọ ekwo nkụ jụ ige ha ntị. Ha agaghị enweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Oleekwanụ maka gịnwa? Ị̀ ga-ekwe ka ihe i chere banyere Ndịàmà Jehova mgbe mbụ ị hụrụ ha ma ọ bụ ka asịrị ị nụrụ banyere ha mee ka ị ghara ige ha ntị, ka ị̀ ga-eji obi gị niile gbalịa ka ị mata nke bụ́ eziokwu banyere ha? Cheta na otú mmadụ dị ozugbo i lere ya anya nwere ike ime ka ị ghara ịmata ụdị onye ọ bụ n’eziokwu. Ma, ọ bụrụ na i weda obi ala mee nchọpụta banyere onye ahụ, i nwere ike ịmata ihe bụ́ eziokwu ị na-amabughị banyere onye ahụ.—Ọrụ 17:10-12.
[Foto dị na peeji nke 11]
Otú ọtụtụ ndị Juu si were Jizọs mgbe ha hụrụ ya mere ka ha ghara ikweta na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ
[Foto dị na peeji nke 12]
Otú i si were Ndịàmà Jehova ọ̀ bụ n’ihi ihe ị nụrụ banyere ha ka ọ̀ bụ n’ihi ihe ị chọpụtara bụ́ eziokwu?