Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mgbe Agha Amagedọn Ga-esu?

Olee Mgbe Agha Amagedọn Ga-esu?

Olee Mgbe Agha Amagedọn Ga-esu?

“Ahụrụ m, ma, lee! oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile pụta. . . . Ndị a bụ ndị si n’oké mkpagbu ahụ pụta.”—MKPUGHE 7:9, 14.

AGHA Amagedọn ga-esu n’oge na-adịghị anya. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

Taa n’ụwa niile, e nweela ndị na-efe Jehova ma na-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru. Chineke achịkọtala ọtụtụ nde mmadụ ndị si ná mba niile, ebo niile, na asụsụ niile ma mee ka ha ghọọ ụmụnna dị n’otu, ndị hụkwara ibe ha n’anya. Ha bụ Ndịàmà Jehova.—Jọn 13:35.

N’oge na-adịghị anya, Setan ga-achịkọta ndị agha ya ma mee ka ha lụso ndị a na-efe Jehova ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ebe ọ bụ na ndị a na-efe Chineke abụghị ndị okwu na ụka, Setan na ndị òtù ya ga-eche na o nweghị onye ga-agbachitere ha. (Ezikiel 38:8-12; Mkpughe 16:13, 14, 16) Gịnị mere ị ga-eji kweta na ihe ndị a ga-eme n’oge na-adịghị anya? Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ ndị ga-enyere anyị aka ịmata mgbe agha Amagedọn ga-esu. Ọtụtụ n’ime ha na-emezu ugbu a.

Amụma Ndị I Ji Anya Gị Na-ahụ Ka Ha Na-emezu

Ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ Jizọs otú mmadụ ga-esi amata mgbe “ọgwụgwụ usoro ihe a” ga-amalite. (Matiu 24:3) Jizọs kwuru na oge ahụ ga-abụ mgbe ‘mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ebusookwa alaeze ọzọ agha, e nweekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche.’ O kwukwara na “ihe ndị a niile bụ mmalite ihe ụfụ nke nhụjuanya.” (Matiu 24:7, 8) Pọl onyeozi kpọkwara oge ahụ ‘oge ikpeazụ’ ma kwuo na ọ ga-abụ “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” (2 Timoti 3:1) Ì chere na ihe ndị ahụ Jizọs na Pọl kwuru na-eme n’oge anyị a?

Gịnị mere ihe ga-eji sie ezigbo ike n’oge ikpeazụ a? Jọn onyeozi kwuru ihe kpatara ya. O buru amụma na a ga-enwe “oge dị mkpirikpi” bụ́ mgbe Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ga-anọ n’ụwa na-akpa ike dị egwu. O kwukwara na Setan ga “na-ewe oké iwe” n’oge a. (Mkpughe 12:7-12) Ị̀ chọpụtala na ebe ọ bụla ị gara n’ụwa taa, ndị mmadụ na-akpa àgwà ka Setan, ha na-ewe oké iwe, na-emekwa ihe ike?

Jizọs kwukwara na n’oge a ihe ga-esi ezigbo ike, e nwere ọrụ pụrụ iche a ga na-arụ n’ụwa. Ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Taa, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ na ise. Ha na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị narị asụsụ ise. Ha na-ebipụtakwa magazin abụọ bụ́ Ụlọ Nche na Teta! Magazin abụọ a bụ magazin a kacha ekesa n’ụwa niile. Ndịàmà Jehova asụgharịakwala Baịbụl n’ihe dị ka otu narị asụsụ. A naghị akwụ ha ụgwọ maka ọrụ a ha na-arụ, ọ bụ onyinye ndị mmadụ ji obi ha niile nye ka ha ji arụ ya. Ọ̀ bụ na ozi ọma a ha na-ekwusa n’ụwa niile anaghị emezu amụma Jizọs buru?

Baịbụl kwukwara ihe ndị ọ ga-abụ ha mewehaala, ya abụrụ na oge eruola ka Jehova Chineke na ndị iro ya malite ịlụ agha. Ka anyị lebagodị anya n’atọ n’ime ihe ndị ahụ bụ́ ndị ị ga-ahụ mgbe ha ga na-eme.

Ihe Ndị Ị Ga-ahụ n’Oge Na-adịghị Anya Ka Ha Na-eme

Amụma nke Mbụ. Baịbụl sịrị na mba niile ga-akpọsa n’ebe niile na e nweela “udo na obi iru ala.” Ha nwere ike iche na ọ fọla obere ka ha kwụsịchaa nsogbu niile e nwere n’ụwa. Ma, Baịbụl gosiri na ozugbo ha kwuchara na e nweela “udo na obi iru ala,” ihe ha ga-ahụzi abụghị udo.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:1-3.

Amụma nke Abụọ. Ihe ọzọ ga-emenụ bụ na ọchịchị dị iche iche e nwere n’ụwa ga-ekpebizi ịlụso okpukpe dị iche iche e nwere n’ụwa agha. Na Baịbụl, a kpọrọ ọchịchị ndị ahụ anụ ọhịa, kpọọkwa okpukpe ụgha dị iche iche e nwere n’ụwa nwaanyị nke nọ n’elu anụ ọhịa ahụ. (Mkpughe 17:3, 15-18) Anụ ọhịa ahụ ga-ebibi okpukpe niile na-ekwu naanị n’ọnụ na ha na-efe Chineke. Ma ọ gaghị ama na ọ bụ uche Chineke ka ọ na-eme.

Jọn onyeozi ji ihe atụ kọọ otú ihe ahụ ga-esi eme. Ọ sịrị: “Mpi iri ahụ na anụ ọhịa ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwaanyị akwụna ahụ asị, laakwa ya n’iyi ma mee ka ọ gbara ọtọ, ha ga-erikwa anụ ya ma kpọọ ya ọkụ kpamkpam. N’ihi na Chineke tinyere ya n’obi ha imezu echiche ya.”—Mkpughe 17:16, 17.

Amụma nke Atọ. Mgbe ndị ọchịchị bibichara okpukpe ụgha, Setan ga-eme ka mba dị iche iche jikọọ aka lụso ndị na-efe Jehova Chineke ọgụ.—Mkpughe 7:14; Matiu 24:21.

Olee Otú Ihe Ndị A Ga-eme n’Ọdịnihu Si Gbasa Gị?

Ọ bụrụ na ị mụbeghị Baịbụl nke ọma, o nwere ike isiri gị ike ikweta na ihe ndị a anyị kwuru ga-eme eme. Ma e nwere ezigbo ihe mere obi ga-eji sie gị ike na ihe a niile Baịbụl kwuru ga-emezucha n’oge na-adịghị anya. Ihe ahụ ga-eme ka obi sie gị ike bụ otú amụma ndị e buru na Baịbụl sirila mezuo. *

Ọ́ gaghị adị mma ka i wepụtatụ oge chọpụta ihe mere obi ji sie Ndịàmà Jehova ike na “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” ga-esu n’oge na-adịghị anya, chọpụtakwa ihe mere na i kwesịghị ịtụ agha ahụ ụjọ? Gwa ha ka ha kọwaara gị ihe Baịbụl kwuru i kwesịrị ime ka i soro ná ndị Jehova Chineke na-agaghị egbu n’agha ahụ. (Mkpughe 16:14) Ihe ha ga-akụziri gị nwere ike ime ka ị ghọta ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ihe ndị gosiri na e nweela amụma ndị e buru na Baịbụl mezurulanụ, gụọ isi nke 2 na isi nke 9 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Ọ̀ bụ na ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ekwusa n’ụwa niile anaghị emezu amụma Baịbụl?