Ònye Nwere Ike Ịkọwa Amụma?
Ònye Nwere Ike Ịkọwa Amụma?
N’oge Alegzanda Onye Ukwu nọ ndụ, e nwere otu eriri a mara akpụ nke a sịrị na ịtọghe ya bụ ihe kacha sie ike mmadụ nwere ike ime. E kwuru na onye ga-atọgheli eriri ahụ ga-abụ onye maara ihe na onye ga-emeri ọtụtụ ndị n’agha. * Akụkọ ahụ kwuru na Alegzanda mechara mee ihe ahụ ọ na-enweghị onye meliri ya, o ji mma agha ya gbubie eriri ahụ.
KEMGBE ụwa, ọ bụ ndị amamihe na-agbalị ịtọghe eriri a mara akpụ. Ma, ọ bụghị naanị ịtọghe eriri ka ha na-eme, ha na-agbalịkwa ịkọwa amụma, ịkọwa ihe ndị dị mgbagwoju anya, na ịkọ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.
Ma ọtụtụ mgbe, ọ na-esiri ha ike ime ihe ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, ndị amamihe ndị Babịlọn akọwalighị ihe otu mkpịsị aka dere n’ahụ́ ájá n’obí eze Babịlọn, bụ́ Belshaza, mgbe ya na ndị obodo ya nọ na-eri oriri. Ọ bụ naanị Daniel, bụ́ onye amụma Jehova Chineke, onye a ma ama na ọ ‘na-atọghe ihe ndị mara akpụ,’ kọwara ihe ahụ e dere n’ahụ́ ájá. (Daniel 5:12) Ihe ahụ e dere n’ahụ́ ájá, bụ́ nke kwuru na a ga-ebibi Alaeze Babịlọn, mezuru n’abalị ụbọchị ahụ.—Daniel 5:1, 4-8, 25-30.
Gịnị Bụ Amụma?
Ndị mmadụ na-ekwu na amụma bụ ihe ga-eme n’ọdịnihu nke e kwuru tupu ya emee ma ọ bụ nke e dere tupu ya emee. Ma, ezigbo amụma bụ ozi si n’aka Chineke nke Chineke ji mee ka a mara ihe bụ́ uche ya ma ọ bụ ihe ọ chọrọ ime, ma è dere ya ede ma è kwuru ya n’ọnụ. Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ amụma ndị gosiri mgbe Mesaya ahụ ga-abịa na otú a ga-esi amata ya, na amụma ndị kwuru banyere “ọgwụgwụ usoro ihe a,” nakwa ndị nke kwuru banyere ikpe Chineke mara ndị mmadụ.—Matiu 24:3; Daniel 9:25.
“Ndị amamihe” nke oge a, ya bụ, ndị ọkà mmụta sayensị, ndị ọkachamara n’ihe banyere akụnụba, ahụ́ ike, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nakwa n’ihe ndị ọzọ, na-agbalị ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọ bụ eziokwu na ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-akọsakarị ihe ndi ahụ ha na-ekwu, ndị mmadụ ana-ekwerekwa ha, ma nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ndị ahụ ha na-ekwu bụ ihe ndị ha chepụtara n’onwe ha n’ihi ihe ndị ha hụrụ na-emenụ. Ihe ọzọ bụ na ha anaghị enwe otu olu n’ihe ndị ahụ ha na-ekwu. N’eziokwu, mmadụ ekwesịghị ịnwa anwa kwuwe ihe ga-eme n’ọdịnihu.
Onye Ezigbo Amụma Si n’Aka
Ònyezi ka ezigbo amụma si n’aka, ònyekwa ga-akọwali amụma? Pita onyeozi dere, sị: “Ọ dịghị amụma Akwụkwọ Nsọ nke si ná nkọwa mmadụ pụta.” (2 Pita 1:20) Okwu Grik a sụgharịrị “nkọwa” pụtara “ime ka a mata ihe ma ọ bụ ikpughe ihe.” Ihe ọ na-egosi bụ na “ihe e kpughere ma ọ bụ ihe a tọghere bụbu ihe e kpuchiri ekpuchi ma ọ bụ ihe e kechiri ekechi.” N’otu Baịbụl, otú e si sụgharịa ihe ahụ Pita kwuru bụ: ‘Ọ dịghị amụma Akwụkwọ Nsọ nke mmadụ ji aka ya tọghee.’
Weregodị ya na ị na-ahụ ka onye ma eke eriri nke ọma nọ na-eke eriri tara akpụ ịtọghe. Onye na-amaghị otú e si eke eriri nwere ike ịhụ ebe eriri nke ọ bụla banyere, ma ọ gaghị ama otú
ọ ga-esi atọghe ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị mmadụ taa, ha nwere ike ịhụ ihe ụfọdụ na-emenụ, bụ́ ndị nwere ike ịkpata nsogbu n’ọdịnihu, ma ha agaghị ama kpọmkwem ihe ga-emecha mee.Daniel na ndị ọzọ Chineke nyere ikike ibu amụma n’oge ochie ebughị ụzọ kirichaa ihe ndị na-eme n’oge ha tupu ha ekwuwe ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. A sị na ha mere otú ahụ, ihe ọ pụtara bụ na ihe ha buru n’amụma bụ ihe ha chepụtara n’onwe ha. Ọ gaara abụ amụma si n’aka mmadụ na-ezughị okè. Kama nke ahụ, Pita kwuru, sị: “Ọ dịghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma ọ bụla, kama ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.”—2 Pita 1:21.
‘Ọ Bụ Chineke Nwe Ịkọwa Ihe’
Ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ asaa gara aga, e nwere ụmụ nwoke abụọ a kpọchiri n’ụlọ mkpọrọ dị n’Ijipt. N’otu abalị, ha abụọ rọrọ nrọ gbagwojuru ha anya. Ebe ha na-enweghị ike ịhụ ndị amamihe e nwere n’Ijipt, ha kọọrọ ya Josef bụ́ onye ha na ya nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ha gwara ya, sị: “Anyị rọrọ nrọ, ọ dịghịkwa ọkọwa nrọ anyị na ya nọ.” Josef, bụ́ onye na-ejere Chineke ozi, gwara ha ka ha kọọrọ ya nrọ ha. Ọ gwara ha, sị: “Ọ́ bụghị Chineke nwe ịkọwa ihe?” (Jenesis 40:8) Ọ bụ naanị Jehova Chineke nwere ikike ịkọwa amụma, otú ahụ onye ma eke eriri nwere ike ịtọghe eriri e kere maa akpụ. A sị kwuwe, ọ bụ Chineke kechiri amụma ndị ahụ ma ọ bụ mee ka e buo ha. N’ihi ya, ọ bụ ya ka anyị ga-agakwuru ka ọ tọghee ma ọ bụ kọwaa ha. N’eziokwu, Josef kwutere ya mgbe o kwuru na ọ bụ Chineke nwe ịkọwa ihe.
Ma olee otú o si bụrụ na “Chineke nwe ịkọwa ihe”? E nwere ọtụtụ ihe mere o ji bụrụ na ọ bụ ya nwe ịkọwa ihe. Mgbe e dere ụfọdụ amụma ndị dị na Baịbụl, e dekwara otú ha ga-esi emezu. Amụma ndị ahụ anaghị esi ike nghọta, otú ahụ ụfọdụ eriri na-anaghị esi ike ịtọghe ma ọ bụrụ na onye kere ha kọwara otú e si atọghe ha.—Jenesis 18:14; 21:2.
E nwere ike ịghọta amụma ụfọdụ dị na Baịbụl ma a gụọ amaokwu ndị gbara ha gburugburu. N’otu ọhụụ e gosiri Daniel onye amụma, ọ hụrụ otu ‘mkpi gbajuru ajị n’ahụ́ nke nwere otu mpi a na-ahụ nke ọma nke dị n’agbata anya ya abụọ.’ Mkpi ahụ ji mpi ya sọtuo otu ‘ebule nwere mpi abụọ.’ Ihe ndị e kwuru n’amaokwu ndị ọzọ gosiri na ebule ahụ nke nwere mpi abụọ nọchiri anya “ndị eze Midia na Peshia,” mkpi ahụ anọchiekwa anya “eze Gris.” (Daniel 8:3-8, 20-22) Ọ bụ Alegzanda Onye Ukwu bụ “nnukwu mpi ahụ,” ya bụ, ‘mpi ahụ a na-ahụ nke ọma.’ Ihe karịrị narị afọ abụọ e buchara amụma ahụ, o bidoro meriwe Peshia. Onye Juu, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, nke aha ya bụ Josephus, kwuru na mgbe Alegzanda bịara agha n’ebe dị nso na Jeruselem, e gosiri ya ebe e dere amụma ahụ, ya ekwetakwa na ọ bụ ya ka amụma ahụ na-ekwu okwu ya.
E nwere ihe ọzọ mere o ji bụrụ na “Chineke nwe ịkọwa ihe.” Jehova Chineke nyere Josef, bụ́ onye na-efe ya, mmụọ nsọ ya, nke mere o ji nwee ike ịghọta nrọ ahụ dị mgbagwoju anya ndị mkpọrọ ibe ya rọrọ ma kọwaara ha ihe ọ pụtara. (Jenesis 41:38) Ọ bụrụkwa na e nwere amụma na-edoghị ndị na-efe Chineke n’oge a anya, ha na-arịọ Chineke ka o nye ha mmụọ nsọ ya, ha amụsiekwa Okwu Chineke ike. Chineke na-enyere ha aka ịhụ ihe ndị ọzọ e dere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị ga-eme ka ha ghọta amụma ahụ. Ọ bụghị mmadụ nkịtị na-eji ike aka ya akọwa ihe e buru n’amụma, kama ọ bụ Chineke na-eme ka ha mata ya n’ihi na ọ bụ mmụọ nsọ ya na Okwu ya na-eme ka a ghọta ihe e buru n’amụma. Mmadụ enweghị ike isi ebe ọzọ na-abụghị Baịbụl kọwaa amụma dị na Baịbụl.—Ọrụ 15:12-21.
Ọ bụkwa “Chineke nwe ịkọwa ihe” n’ihi na ọ bụ ya na-ekpebi mgbe ndị ya nọ n’ụwa ga-aghọta amụma ya. E nwere ike ịghọta amụma Baịbụl tupu ya emezuo, mgbe ọ na-emezu, ma ọ bụkwanụ mgbe o mezucharala. Ebe ọ bụ na amụma ndị ahụ si n’aka Chineke, ọ na-eme ka a ghọta nke ọ bụla n’ime ha mgbe ọ chọrọ ka a ghọta ya.
Jenesis 40:13, 19) Mgbe a kpọtara Josef n’ihu Fero, bụ́ eze Ijipt, ka ọ kọwaara Fero nrọ ya, Josef kwuru na a na-aga inwe afọ asaa mgbe ala ga-eme nri nke ọma. Ọ bụ mmụọ nsọ Chineke mere ka Josef kọwaa ihe nrọ ahụ Fero rọrọ pụtara. Nke a mere ka e nwee ike ịchịkọta ọtụtụ ihe oriri n’afọ ndị ahụ ala mere nri nke ọma.—Jenesis 41:29, 39, 40.
Baịbụl kwuru na Josef kọwaara ndị mkpọrọ abụọ ahụ nrọ ha abalị atọ tupu ihe ha rọrọ ná nrọ emezuo. (Amụma ndị ọzọ na-edo ndị Chineke anya mgbe ha mezucharala. Ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Jizọs, e buru ọtụtụ ihe ndị ga-eme ná ndụ ya n’amụma, ma, ọ bụ mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ ka ndị na-eso ụzọ ya ghọtara amụma ndị ahụ. (Abụ Ọma 22:18; 34:20; Jọn 19:24, 36) E kwukwara na Daniel 12:4, na e nwere amụma ndị nke e ‘mechiri ruo n’oge ikpeazụ,’ bụ́ mgbe Daniel kwuru na ‘ezi ihe ọmụma ga-aba ụba.’ Amụma ndị ahụ na-emezu n’oge anyị a. *
Otú Amụma Ndị Dị na Baịbụl Si Gbasa Gị
Josef na Daniel gachara n’ihu ndị eze e nwere n’oge ha ma kwuo ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, bụ́ ndị gbasara mba dị iche iche na Alaeze dị iche iche. Ndị Kraịst oge mbụ kwuchitere ọnụ Jehova, bụ́ Chineke nke amụma, ihe ndị ha kwuru bakwaara ndị gere ha ntị uru.
Taakwa, Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-ekwusara ndị mmadụ ihe ga-eme n’ọdịnihu, ya bụ, ozi ọma Alaeze Chineke. Ha na-agwa ha na ihe Jizọs buru n’amụma banyere “ọgwụgwụ usoro ihe a” na-emezu ugbu a. (Matiu 24:3, 14) Ị̀ maara ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma na otú ha si gbasa gị? Obi ga-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ịghọta amụma ndị ahụ dị ezigbo mkpa na otú ha ga-esi baara gị uru.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 Otu akụkọ ifo ndị Gris kwuru na n’obodo Gọdịọm, bụ́ isi obodo Frijia, Gordius, bụ́ onye wuru Gordium, ji eriri kegide ụgbọ ịnyịnya ya n’otu poolu ma maa ya akpụ. A sịrị na naanị onye ga-atọgheli eriri ahụ a mara akpụ bụ onye ga-emeri Eshia.
^ par. 19 Gụọ isiokwu ndị bidoro Ụlọ Nche Mee 1, 2011. Isiokwu Ụlọ Nche ahụ bụ “Amụma Baịbụl Isii Ndị Ị Na-ahụ Ka Ha Na-emezu.”
[Foto ndị dị na peeji nke 12, 13]
Josef na Daniel kwuchara na ọ bụ Chineke nyeere ha aka ịkọwa amụma