Olee Otú Ndị Nna na Ụmụ Ha Ndị Nwoke Ga-esi Na-adị n’Ezigbo Mma?
Olee Otú Ndị Nna na Ụmụ Ha Ndị Nwoke Ga-esi Na-adị n’Ezigbo Mma?
“PAPA, olee otú i si mara ihe niile a ị ma?” Ò nwetụla mgbe obere nwa gị nwoke jụrụ gị ụdị ajụjụ a? Ọ bụrụ na o nwetụla, o nwere ike ịbụ na obi tọrọ gị ezigbo ụtọ mgbe ahụ. Ma, obi ga-akadị atọ gị ụtọ ma ọ bụrụ na nwa gị ahụ ṅara ntị n’ezigbo ndụmọdụ i nyere ya, ya emechaakwa baara ya uru ná ndụ. *—Ilu 23:15, 24.
Ma ugbu a nwa gị nwoke towere okorobịa, ọ̀ ka na-ewere gị otú ahụ o si were gị ná mbụ? Ka ọ̀ dị gị ka o jikwaghị gị kpọrọ ihe otú o jibu gị kpọrọ? Olee ihe ị ga-eme ka gị na nwa gị nwoke na-adị ná mma ka ọ na-aghọ dimkpa? Ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe ụfọdụ ndị na-eme ka o siere ndị nna na ụmụ ha ndị nwoke ike ịdị ná mma.
Ihe Atọ Ndị Na-emekarị Ka O Siere Ndị Nna na Ụmụ Ha Ndị Nwoke Ike Ịdị ná Mma
1. ENWEGHỊ OHERE: N’ọtụtụ mba, ọ bụ ndị nna na-akpa afọ ezinụlọ ha. Ọrụ ha na-emekarị ka ha ghara ịna-anọkarị n’ụlọ. N’ebe ụfọdụ, ndị nna anaghị enwecha oge ha na ụmụ ha ji anọ. Dị ka ihe atụ, otu nchọpụta e mere na Frans na nso nso a gosiri na oge ndị nna na ụmụ ha ji anọrị n’ụbọchị anaghị eru nkeji iri na abụọ.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee otú oge gị na nwa gị nwoke ji anọrị na-aha? Malite ugbu a ruo otu izu ma ọ bụ izu abụọ, gbalịa detuo oge niile gị na nwa gị nwoke ji nọrịa n’ụbọchị ọ bụla. O nwere ike iju gị anya na oge gị na ya nọrịrị ebughị ibu.
2. OTÚ NNA NKE HA SI ZỤỌ HA: Ụfọdụ ndị bụ́ nna ugbu a enwechaghị ihe jikọrọ ha na nna nke ha mgbe ha na-eto. Jean-Marie, bụ́ otu nwoke bi na Frans, sịrị: “Mgbe m na-eto, anaghị m ahụkarị papa m anya ka mụ na ya kparịa.” Olee ihe nke a kpataara Jean-Marie? Ọ sịrị: “Nke a kpataara m nsogbu ndị m na-atụghịdị anya ha. Dị ka ihe atụ, ọ na-esiri m ike ịma ihe mụ na ụmụ m ndị nwoke ga na-akparịta ma mụ na ha nọrọ.” Ma e nwekwara ndị bụ́ nna ugbu a, bụ́ ndị ha na papa nke ha na-ahụ mgbe niile n’oge ha na-eto, n’agbanyeghị nke ahụ, ha na papa ha adịghị ná mma. Philippe, bụ́ onye dị afọ iri anọ na atọ, sịrị: “O siiri papa m ike igosi m na ya hụrụ m n’anya. N’ihi ya, ọ naghị adịchara m mfe igosi nwa m nwoke na m hụrụ ya n’anya.”
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ì chere na ọ bụ otú nna gị si mesoo gị mgbe ị na-eto ka i sikwa na-emeso nwa gị nwoke ugbu a? Ò nwere ihe ụfọdụ na-adịghị mma ma ọ bụ ihe ụfọdụ dị mma papa gị mere mgbe ọ na-azụ gị bụ́ ndị ị na-eme ugbu a? Gịnị mere o ji dị otú ahụ?
3. IME IHE NDỊ ỌZỌ KWURU: N’obodo ụfọdụ, a na-ewere ya na ọ bụghị nna kwesịrị ịzụ ụmụ ya. Luca, bụ́ onye toro n’otu mba dị na Yurop, sịrị:
“N’ebe m nọ too, ndị mmadụ weere ya na ịzụ ụmụaka bụ ọrụ nwaanyị.” N’obodo ndị ọzọ, a na-agwa ndị nna ka ha jiri aka ike na-azụ ụmụ ha. Dị ka ihe atụ, George, bụ́ onye toro n’otu mba dị n’Afrịka, sịrị: “N’obodo anyị, ndị nna na ụmụ ha anaghị egwuri egwu ka ụmụ ha ghara iledawa ha anya. N’ihi ya, ọ na-esiri m ike mụ na nwa m nwoke ịnọrị.”IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: N’obodo unu, olee otú e si ele ndị nna anya? À na-agwa ha na ịzụ ụmụaka bụ ọrụ nwaanyị? À na-achọ ka ha na-egwusa ụmụ ha ndị nwoke egwuregwu ma na-egosi ha na ha hụrụ ha n’anya, ka à na-ewere ya na ọ dịghị mma ma ha mee otú ahụ?
Ọ bụrụ na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a e kwuru okwu ha na-eme ka o siere gị ike gị na nwa gị nwoke ịdị ná mma, olee ihe ndị ga-enyere gị aka? Megodị ihe ndị na-esonụ.
Malite Mgbe Nwa Gị Nwoke Ka Dị Obere
Ụmụaka ndị nwoke na-achọkarị ịdị ka nna ha. N’ihi ya, bido mgbe nwa gị nwoke ka dị obere mee ka ọ na-akpa gị nso. Olee otú i nwere ike isi mee ya? Oleekwa mgbe i nwere ike iwepụta oge ka gị na ya nọrịa?
Mgbe ọ bụla o kwere omume, gwa nwa gị nwoke ka o soro gị mee ihe ndị ị na-eme n’ụbọchị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ ụlọ, gwa ya ka o nyere gị aka. Ọ bụrụ na ị na-aza ụlọ, nye ya obere ázị́zà, ọ bụrụkwa na ị na-abọ ahịhịa, nye ya obere ọ́gụ̀. O doro anya na obi ga-atọ ya ụtọ iso nna ya, bụ́ onye ọ chọrọ ịdị ka ya, na-arụ ọrụ. Ọrụ ahụ nwere ike iwekwu gị oge maka na gị na nwatakịrị so na-arụ ya; ma ọrụ ahụ gị na ya na-arụkọ ga-eme ka gị na ya na-adịkwu ná mma, ị ga-esikwa otú ahụ kụziere ya otú e si arụ ọrụ. O teela Baịbụl gwara ndị nna ka ha na ụmụ ha soro na-eme ihe ndị ha na-eme n’ụbọchị, nakwa ka ha jiri ohere ahụ na-agwa ụmụ ha okwu ma na-akụziri ha ihe. (Diuterọnọmi 6:6-9) Ihe ahụ Baịbụl kwuru ka bakwara uru taa.
E wezụga gị na nwa gị ịrụkọ ọrụ, i kwesịkwara iwepụta oge ka gị na ya na-egwuri egwu. Uru unu ga-erite ma unu na-egwuri egwu abụghị naanị na obi ga na-atọ unu ụtọ. A chọpụtala na ndị nna na ụmụ ha igwuri egwu na-eme ka obi na-esikwu ụmụ ha ike n’ihe ọ bụla ha na-eme.
Nna na nwa ya nwoke igwuri egwu nwedịrị uru ọzọ ka mkpa ọ na-aba. Otu onye na-eme nchọpụta, nke aha ya bụ Michel Fize, kwuru, sị: “Ọ bụ mgbe nwata nwoke na papa ya na-egwuri egwu ka ọ na-akacha agwa papa ya ihe dị ya n’obi.” Mgbe nna na nwa ya nwoke na-egwuri egwu, nna nwere ike ịgwa nwa ya na ya hụrụ ya n’anya, gosikwa ya n’omume ya. Ọ ga-esi otú a na-akụziri nwa ya otú mmadụ si egosi ndị ọzọ na ọ hụrụ ha n’anya. Otu nwoke nke bi na Jamanị, onye aha ya bụ André, sịrị: “Mgbe nwa m nwoke bụ nwata, mụ na ya na-egwurikarị egwu. M na-amakụ ya iji gosi ya na m hụrụ ya n’anya, ọ mụtakwara igosi m na ya hụrụ m n’anya.”
Oge ọzọ nna nwere ike iji mee ka ya na obere nwa ya nwoke na-adịkwu ná mma bụ oge e ji alakpu ụra. N’abalị ọ bụla, gụọrọ ya otu akụkọ, geekwa ya ntị mgbe ọ na-akọrọ gị ihe ndị mere ya obi ụtọ na nsogbu ndị o nwere n’ụbọchị. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a, ị ga-eme ka ọ dịrị ya mfe ịna-akọrọ gị ihe dị ya n’obi ka ọ na-eto.
Gbalịa Chọta Ihe Na-amasị Nwa Gị nke Unu Ga Na-emekọ Ọnụ
Ụfọdụ ụmụ okoro ndị na-eto eto anaghị enwecha mmasị ma nna ha kwusawara ha okwu. Ọ bụrụ na ọ dị gị ka nwa gị nwoke achọghị ịza ajụjụ ndị ị na-ajụ ya, e werela ya na ọ chọghị ka gị na ya kparịta ụka. O nwere ike inwe mmasị ka gị na ya kwurịta okwu ma ọ bụrụ na ị chọta ụzọ ọzọ gị na ya ga-esi na-akparịta ụka.
E nwere otu nwoke bi na Frans nke aha ya bụ Jack. O nwere mgbe ọ na-esiri ya ike ya na nwa ya nwoke, bụ́ Jérôme, ikwurịta okwu. Ma, kama ịmanye nwa ya ka o kwuo okwu, ọ chọtara ụzọ ọzọ ya na ya ga-esi na-ekwurịta okwu. Ihe o mere bụ iwepụta oge ya na ya ga na-agba bọl. Jack sịrị: “Anyị gbachaa bọl, anyị na-anọrọ ala n’ebe ahụ anyị nọ gbaa bọl zurutụ ike. Nwa m nwoke na-ejikarị oge ahụ agwa m otú obi dị ya. Echere m na ihe mere mụ na ya ji dịwa n’ezigbo mma bụ na naanị mụ na ya na-anọ mgbe ahụ, ọ makwa na o nwere ike ịkọrọ m ihe dị ya n’obi n’oge ndị ahụ.”
Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ịgba bọl ma ọ bụ egwuregwu ndị yiri ya anaghị amasị nwa gị nwoke? André na-echeta mgbe ya na nwa ya nwoke na-apụta n’abalị na-ekiri kpakpando. André sịrị: Aịzaya 40:25, 26.
“Anyị na-ebupụta oche n’èzí n’abalị mgbe oyi na-atụ, nọrọ na ya ma jiri ákwà kpuchie onwe anyị, na-aṅụ tii ọkụ ma na-ekiri kpakpando. Anyị na-eji oge ahụ ekwu banyere Onye kere kpakpando. Anyị na-akpakwa ihe ndị dịịrị anyị. O nweghị ihe anyị na-anaghị akparịta.”—Ọ bụrụkwanụ na ihe ụfọdụ na-amasị nwa gị nwoke anaghị amasị gị, gịnị ka ị ga-eme? Gbalịa ka ihe ndị na-amasị nwa gị masịwa gị. (Ndị Filipaị 2:4) Otu nwoke bi na Saụt Afrịka, onye aha ya bụ Isaac, sịrị: “Egwuregwu dị ka ịgba bọl na-amasị m karịa ka ọ na-amasị nwa m nwoke bụ́ Victor. Ihe na-amasịkarị ya bụ ụgbọelu na kọmputa. N’ihi ya, agbalịrị m ka ihe ndị na-amasị ya masịwakwa m. M na-akpọ ya aga n’ebe a na-egosi ndị na-anya ụgbọelu nakwa ebe a na-eji kọmputa egosi otú e si anya ụgbọelu. Echere m na ihe mere ahụ́ ji ruo Victor ala ịkọrọ m ihe dị ya n’obi bụ na mụ na ya na-eso eme ihe ndị na-amasị ya.”
Nyere Ya Aka Ka Obi Na-esi Ya Ike n’Ihe Ndị Ọ Na-eme
“Papa, legodị, legodị!” N’oge nwa gị nwoke dị obere, ò nwere oge ọ gwara gị ụdị ihe a mgbe ọ mụtara ime ihe ọ na-emetụbeghị mbụ? Ugbu a ọ ghọwara okorobịa, ọ̀ ka na-agwa gị ụdị ihe a? O nwere ike ọ naghịzi eme otú ahụ. Ma, o kwesịrị ịna-agwa gị ihe ndị ọ na-eme n’ihi na nke a ga-enyere ya aka ịghọ dimkpa na-eche echiche nke ọma ma o too.
Ka anyị lebagodị anya n’otú Jehova Chineke si mesoo otu n’ime ụmụ ya. Mgbe Jizọs chọrọ ịmalite ọrụ dị mkpa mere o ji bịa n’ụwa, Chineke kwuru na ya hụrụ ya n’anya otú ndị ọzọ ga-anụ ya. Ọ sịrị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” (Matiu 3:17; 5:48) N’eziokwu, i kwesịrị ịna-adọ nwa gị aka ná ntị ma na-akụziri ya ihe. (Ndị Efesọs 6:4) Ma, i kwesịkwara ịna-aja ya mma maka ihe ndị dị mma ọ na-ekwu ma na-eme.
Ma, ọ na-esiri ụfọdụ ndị nna ike ịja ụmụ ha mma na ịgwa ha na ha hụrụ ha n’anya. O nwere ike ịbụ na mgbe hanwa na-eto, ndị mụrụ ha na-abakarịrị ha mba ma ha mee ihe ọjọọ, ha anaghịkwanụ aja ha mma ma ha mee nke ọma. Ọ bụrụ otú ahụ ka ndị mụrụ gị mere gị, ọ ga-adị mkpa ka ị gbalịsie ike na-aja nwa gị mma bụ́ nke ga-eme ka obi na-esi ya ike n’ihe ndị ọ na-eme. Olee otú ị ga-esi eme nke a? Luca, bụ́ onye e kwurula okwu ya, na Manuel nwa ya nwoke, onye dị afọ iri na ise na-eso arụ ọrụ ụlọ. Luca sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ana m enye Manuel ọrụ ọ ga-arụ, gwakwa ya ka ọ kpọọ m ma o siwere ya ike. Ọtụtụ mgbe, ọ na-arụcha ọrụ ahụ naanị ya. Oge ọ bụla naanị ya rụchara ọrụ m nyere ya, ọ na-enwe obi ụtọ, obi na-esikwukwa ya ike. O meta ya, m na-aja ya mma. Ọ bụrụ na o metachaghị ya otú ọ tụrụ anya ya, m na-ajakwa ya ike maka nke o mere eme.”
I nwekwara ike ime ka obi na-esikwu nwa gị nwoke ike ma ọ bụrụ na ị na-enyere ya aka inwe nnukwu ihe ndị ọzọ ọ na-eme ná ndụ. Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na o meghị ihe ndị ahụ mgbe ị chọrọ ka o mee ha, ma ọ bụkwanụ na ihe ndị ị chọrọ ka o mee abụghị ihe ndị yanwa chọrọ ime? Ya bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịdị mkpa ka i lebagharịa anya n’ihe ndị ahụ ị chọrọ ka o mee iji mara ma ọ̀ ga-emelikwa ha. Jack, bụ́ onye e kwuburu okwu ya, sịrị: “M na-agbalị inyere nwa m nwoke aka ka o nwee ihe ndị ọ ga-eme ná ndụ. Ma, m na-agbalịkwa ka ihe ndị ahụ bụrụ ihe ndị ọ ga-emeli nakwa ihe ndị yanwa chọrọ ime, ọ bụghị ihe ndị m chọrọ ka o mee. M na-ahapụ ya ka o mee ihe ndị ahụ mgbe ọ ga-enwe ike ime ha.” Ọ bụrụ na ị na-ege nwa gị nwoke ntị mgbe ọ na-ekwu ihe o chere, na-aja ya mma n’ebe ndị ọ na-emeta, na-agba ya ume ma na-enyere ya aka mgbe ọ na-emeghị nke ọma, ị ga-enyere ya aka ime ihe ndị ọ chọrọ ime ná ndụ.
O doro anya na gị na nwa gị nwoke ga na-enwe nsogbu mgbe ụfọdụ. Ma mee elu mee ala, nwa gị nwoke ga-achọ ka gị na ya dịrị ná mma. A sị kwuwe, ò nwere onye na-agaghị achọ ka ya na onye bu ọdịmma ya n’obi dịrị ná mma?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 Ọ bụ eziokwu na ihe e kwuru n’isiokwu a bụ otú ndị nna na ụmụ ha ndị nwoke ga-esi na-adị ná mma, ma ọ ga-enyekwara ndị nna aka ka ha na ụmụ ha ndị nwaanyị na-adịkwa ná mma.