Ikwusa Ozi Ọma n’Ebe Dị Nso n’Ugwu Na-agbọpụta Ọkụ
Akwụkwọ Ozi Si Kọngo (Kinshasa)
Ikwusa Ozi Ọma n’Ebe Dị Nso n’Ugwu Na-agbọpụta Ọkụ
N’OBODO Goma, anyanwụ wahaala n’ụtụtụ, eluigwe na-achawa edo edo. Anyị na-ahụ ọmarịcha Ugwu Nyiragongo, nke bụ́ otu n’ime ugwu kacha agbọpụta ọkụ e nwere n’ụwa. Anwụrụ ọkụ na-esi n’elu ugwu ahụ apụta mgbe niile. O ruo n’abalị, anwụrụ ọkụ ahụ na-acha ka ọkụ, n’ihi na ugwu ahụ na-agbọpụta ọkụ.
N’asụsụ Swahili, ihe a na-akpọ ugwu ahụ bụ Mulima ya Moto, nke pụtara Ugwu Na-agbọpụta Ọkụ. Afọ 2002 bụ mgbe ikpeazụ ugwu Nyiragongo gbọpụtara nnukwu ọkụ ma mebisịa ihe. Ihe niile ọtụtụ ndị agbata obi anyị na ndị enyi anyị bi na Goma nwere lara n’iyi. N’ebe ụfọdụ mụ na di m na-aga ozi ọma, anyị na-aga n’elu ihe dị ka apịtị kpọrọla nkụ nke bụ́ ihe ugwu ahụ gbọpụtara. Anyị gafewa ebe ahụ, ihe na-agbata m n’obi bụ otú ọ ga-adị ma mmadụ na-aga ije n’ọnwa. Ma, obi ndị obodo ahụ akpọghị nkụ ka ihe ahụ ugwu ahụ gbọpụtara. Ihu na-atọ ha ọchị, ọ na-atọkwa ha ụtọ ịnụ Okwu Chineke anyị na-ekwusara ha. Ọ bụ nke a mere o ji atọgbu anyị atọgbu ikwusa ozi ọma n’ebe a dị nso n’Ugwu Na-agbọpụta Ọkụ.
Eji m obi ụtọ teta ụra n’ụtụtụ otu ụbọchị Satọdee, n’ihi na o nwere ebe anyị na-aga n’ụbọchị ahụ. Mụ na di m na ụfọdụ ndị enyi anyị ndị bịara ileta anyị na ndị ọzọ sikwa mba ọzọ bịa ikwusa ozi ọma n’obodo a na-aga ikwusa ozi ọma n’ebe ndị gbara ọsọ ndụ bi, n’ebe a na-akpọ Mugunga. Mugunga dị n’ebe ọwụwa anyanwụ obodo a anyị na-ekwusa ozi ọma. Ọtụtụ n’ime ndị ahụ gbatara ọsọ ndụ na Mugunga gbara ọsọ ndụ n’ihi ọgụ a na-alụ n’obodo ha.
Anyị kwajuru akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, bụ́ ndị e dere n’asụsụ French, asụsụ Kiswahili, nakwa n’asụsụ Kinyarwanda, n’ụgbọala anyị ma buru ha gawa. Ka anyị na-aga n’okpuru ụzọ obodo Route Sake, ebe niile malitere ikwo ekwo. Anyị hụrụ ụmụ okorobịa ndị kwajuru ngwongwo na trọk ma kwara ha na-aga. Anyị hụkwara ụmụ nwaanyị ndị yi sket a na-ama ka ákwà, buru nnukwu ibu n’isi na-aga n’okporo ụzọ. Ndị na-anya ụgbọala ji ụgbọala ha na-ebuga ndị ọrụ na ndị ahịa ebe ha na-aga. Ebe ọ bụla i lere anya, ihe ị ga-ahụ bụ ụlọ ndị e ji osisi rụọ, bụ́ ndị na-acha nchara nchara, ma e ji ágbá na-acha anụnụ anụnụ tee n’ibo ụzọ na windo ha.
Mgbe anyị rutere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Ndosho, anyị hụrụ ụfọdụ Ndịàmà Jehova ibe anyị, bụ́ ndị anyị na ha ga-eso aga ikwusa ozi ọma. Obi tọrọ m ụtọ mgbe m hụrụ obere ụmụaka, ụmụ nwaanyị ndị di ha nwụrụ, ụmụ mgbei na ụfọdụ ndị nwere nkwarụ. Ọtụtụ n’ime ha ataala nnukwu ahụhụ ná ndụ ha, ma kemgbe
ha bidoro ịmụ Baịbụl, ndụ ha akakwuola mma. Ihe ndị ha na-amụta na Baịbụl emeela ka ha nwee olileanya ná ndụ, ọ dịkwa ha ọkụ n’obi ịkọrọ ya ndị ọzọ. Anyị niile nwere obere nnọkọ nke a nọ na ya gwa anyị ebe ndị anyị nwere ike ịgụrụ ndị mmadụ na Baịbụl ma anyị ziwe ha ozi ọma. Anyị dị otu narị mmadụ na iri atọ. Anyị niile banyeziri bọs ise na otu ụgbọala ọzọ.Mgbe ihe dị ka nkeji iri atọ gara, anyị rutere n’ebe ahụ ndị gbara ọsọ ndụ bi. E nwere ọtụtụ narị obere obere ụlọikwuu a mara n’ebe ahụ. Ala ebe ahụ dị ka apịtị kpọrọ nkụ. Ọ bụ ugwu gbọpụtara ihe ahụ dị ka apịtị. N’etiti ebe ahụ ha bi, e nwere ebe mmadụ niile na-aga mposi na ebe a na-anọ asa ákwà. Mmadụ juru ebe niile, ị ga-ahụ ndị na-asa ihe, ndị na-esi nri, ndị na-agbawasị akịdị, na ndị na-aza ihu ebe ha bi.
Anyị hụrụ otu nwoke a na-akpọ Papa Jacques. Ọ bụ ya na-elekọta ebe ụfọdụ n’ebe ahụ ndị gbara ọsọ ndụ bi. Ihe na-echegbu ya bụ otú ọ ga-esi zụọ ụmụ ya n’oge ọjọọ a. Obi tọrọ ya ụtọ mgbe anyị nyere ya akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. O kwuru na ya ga-agụ ya, nakwa na ya ga-akpọkọta ndị mmadụ kọwaara ha ihe ya gụtara.
Ka anyị nọ na-aga, anyị hụrụ otu nwaanyị a na-akpọ Mama Beatrice. Ọ jụrụ m ihe mere Chineke ji kwere ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. O kwuru na ọ ga-abụrịrị na Chineke na-ata ya ahụhụ. E gburu di ya n’agha, nwa ya nwaanyị atụrụ ime ọkwa mụọ ya, ndị ntọrọ atọrọkwa nwa ya nwoke kemgbe ọnwa ole na ole. O nwebeghịkwa ihe ọ nụrụ banyere ya.
Ihe ndị a Mama Beatrice kọrọ mere ka m cheta otú ọ ga-abụ na obi dị Job mgbe a kọọrọ ya ihe ọjọọ niile mere ya. Anyị si na Baịbụl gosi ya ihe mere ahụhụ ji dịrị n’ụwa ma mee ka o doo ya anya na ọ bụghị Chineke na-ata ya ahụhụ. (Job 34:10-12; Jems 1:14, 15) Anyị gwakwara ya ihe ndị Chineke ga-eme n’oge na-adịghị anya mgbe Alaeze ya ga-achịwa ụwa. Ka anyị na ya na-ekwu ihe ndị a, o bidoro mụmụwa ọnụ ọchị, o kwukwara na ya ekpebiela na ya ga-amụ Baịbụl nakwa na ya ga na-ekpe ekpere ka Chineke nyere ya aka.
Ndị niile bịara ozi ọma n’ụbọchị ahụ nwere obi ụtọ, ọ dịkwa anyị niile ka Jehova ò si n’aka anyị gbaa ndị anyị ziri ozi ọma n’ụbọchị ahụ ume. Mgbe anyị na-ala, ọtụtụ n’ime ndị bi n’ebe ahụ ji akwụkwọ dị iche iche anyị nyere ha n’aka pụta ifere anyị aka, sị anyị gaa nke ọma.
Mgbe anyị na-ala, eji m ohere ahụ chebara ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ echiche. Obi tọrọ m ụtọ maka ozi ọma anyị gara n’ụbọchị ahụ. Echetara m otú Papa Jacques si kelee anyị, otú Mama Beatrice si bido ịmụmụ ọnụ ọchị, na otú otu agadi nwaanyị si kwee m n’aka. Echetara m ụmụaka ndị anyị hụrụ n’ebe ahụ, bụ́ ndị jụrụ anyị ajụjụ ka ndị torola eto. Obi tọrọ m ụtọ ịhụ otú ndị ahụ bi ebe ahụ si na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ahụhụ niile ha na-ata.
N’ebe ndị a e nwere nsogbu n’ụwa, anyị na-ahụ mgbalị ọtụtụ ndị na-eme ka ha nyere ndị nọ n’ahụhụ aka. Ebe ahụ anyị gara taa mere ka m nwee ohere iji Baịbụl gosi ndị mmadụ ihe ga-akwụsị nsogbu ha kpamkpam. Enwere m nnukwu obi ụtọ na eso m ná ndị na-enyere ndị mmadụ aka ka ha mụta Okwu Chineke.