Chineke Ya Kasiri Ya Obi
Ṅomie Okwukwe Ha
Chineke Ya Kasiri Ya Obi
ỊLAỊJA bu mmiri na-ezonụ na-agba ọsọ. Ma, eluigwe ka na-agbajikwu. Ụzọ ka dịkwa ezigbo anya n’ihi na ọ bụ Jezril ka ọ na-aga, ọ bụghịzikwanụ nwa okorobịa. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nọ na-agba ọsọ n’ike n’ike n’ihi na “aka Jehova” dị n’ahụ́ ya. O nwetụbeghị mgbe ume dị ya n’ahụ́ otú ọ dị ya ugbu a. Ọ bụ ya mere o ji nwee ike ịgbafere ụgbọ ịnyịnya bu Eze Ehab!—1 Ndị Eze 18:46.
Ugbu a, Eze Ehab anakwaghị ahụ azụ ya anya, ma Ịlaịja agawabeghịdị aga. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Ịlaịja bu mmiri ahụ na-ezonụ na-agba ọsọ, ya ana-echetakwa njinji jiri n’ụbọchị ahụ. O doro anya na Jehova bụ́ Chineke Ịlaịja nwe mmeri, ọ bụ ya mere ezi ofufe ji merie ofufe Bel n’ụbọchị ahụ. Ịlaịja agateela aka. Ọ naghịzi ahụ Ugwu Kamel, bụ́ ebe Jehova nọ rụọ ọrụ ebube ahụ nke mere Ịlaịja ji merie ndị na-efe Bel. Ọ gbalịgodị ka ọ hụ ya, mmiri na-ezonụ agaghị ekwe ya n’ihi na ebe niile gbara itiri. Ihe mere n’ụbọchị ahụ gosiri na ndị amụma Bel bụ ndị amụma ụgha, e gbukwara ọtụtụ n’ime ha. Mgbe e gbuchara ha, Ịlaịja kpeziri ekpere ka Jehova mee ka mmiri na-ezubeghị kemgbe afọ atọ na ọkara zoo. Mmiri zokwara. *—1 Ndị Eze 18:18-45.
Ka Ịlaịja ji ọsọ na-aga Jezril, bụ́ ebe dị kilomita iri atọ ma e si n’Ugwu Kamel gawa ya, o nwere ike na-eche na ihe ga-agbanwezi ugbu a. Ehab ga-agbanwerịrị! Ugbu a ọ hụchara ihe mere ndị amụma Bel, o doro anya na ọ ga-akwụsị ife Bel ma nye nwunye ya, bụ́ Jezibel, iwu ka ọ kwụsị ịkpagbu ndị na-efe Jehova.
Ọ bụrụ na o yiri ka ihe ọ̀ gawala otú anyị chọrọ, obi na-adị anyị mma. Anyị nweziri ike ichewe na ihe ga-adịrị mma na-aga, ma ọ bụdị chewe na nsogbu anyị agwụla. Ọ bụrụ na Ịlaịja chere na nsogbu ya agwụla, o kwesịghị iju anyị anya n’ihi na o “nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe.” (Jems 5:17) Ma n’eziokwu, nsogbu Ịlaịja ka na-amalite amalite. N’ime awa ole na ole, oké ụjọ jidere Ịlaịja nke mere ka ike ụwa gwụ ya. Olee otú nke a si mee? Oleekwa otú Jehova si gbaa onye amụma a ume ma mee ka obi sie ya ike? Ka anyị hụ.
Ihe Agbanwee na Mberede
Mgbe Ehab ruru n’obí ya na Jezril, ò mere ihe gosiri na ọ gbanweela ma jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe? Baịbụl kwuru, sị: “Ehab wee kọọrọ Jezibel ihe niile Ịlaịja mere na ihe niile banyere otú o si jiri mma agha gbuo ndị amụma ahụ niile.” (1 Ndị Eze 19:1) Ị̀ hụrụ na mgbe Ehab na-akọrọ nwunye ya ihe merenụ n’ụbọchị ahụ, o kwuteghị okwu Jehova bụ́ Chineke Ịlaịja? Ebe ọ bụ na Ehab ejighị ofufe Chineke kpọrọ ihe, o weere ọrụ ebube niile Chineke rụrụ n’ụbọchị ahụ ka ihe mmadụ nkịtị mere. Ọ bụ ya mere o ji sị na ọ bụ ‘ihe Ịlaịja mere.’ O doro anya na ọ mụtabeghị na ya kwesịrị ịsọpụrụ Jehova Chineke. Gịnịzi ka Jezibel ọjọọ ahụ mere?
Iwe na ọnụma juru ya obi! Ọ bụ ya mere o ji zigara Ịlaịja ozi, sị: “Ka chi m mee otú ahụ, ka 1 Ndị Eze 19:2) Jezibel ejitụdịghị ya n’egwuregwu. Ihe a o kwuru pụtara na ọ ṅụrụ iyi na kama Ịlaịja na-agaghị anwụ echi n’ihi ndị amụma Bel ahụ e gburu, ka yanwa nwụọ. Weregodị ya na ị na-ahụ ka a kpọtere Ịlaịja n’ụlọ ebe ọ nọ na-arahụ ụra na Jezril n’abalị ahụ mmiri zoro ma zie ya ozi ahụ Jezibel ziri. Olee otú obi dị ya mgbe ọ nụrụ ozi ahụ?
ha tụkwasịkwa ihe na ya, ma ọ bụrụ na n’ụdị ugbu a echi emeghị m ka mkpụrụ obi gị dị ka mkpụrụ obi onye nke ọ bụla n’ime ha!” (Ụjọ Ejide Ya
Ọ bụrụ na Ịlaịja chere na ofufe Bel akwụsịla n’Izrel, ozi ahụ e ziri ya emeela ka ọ mara na ọ kwụsịbeghị. Ike agwụbeghị Jezibel. Tupu oge a, Jezibel egbuola ọtụtụ ndị amụma, ugbu a kwa, o yiri ka ò ruorola Ịlaịja. Baịbụl gwara anyị, sị: “Egwu wee tụwa [Ịlaịja].” Ịlaịja ọ̀ nọ na-eche otú Jezibel ga-esi gbuo ya? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụrịrị ya mere ụjọ ji tụwa ya. Nke ọ bụla ọ bụ, Ịlaịja ‘biliri gbapụ n’ihi mkpụrụ obi ya,’ ya bụ, ọ gbara ọsọ ndụ.—1 Ndị Eze 18:4; 19:3.
Ịlaịja abụghị onye mbụ nwere okwukwe nke ụjọ jidetụrụla. O nwere mgbe ụjọ jidere Pita onyeozi. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs mere ka Pita soro Ya gaa ije n’elu mmiri, onyeozi ahụ lere anya hụ “oké ifufe ahụ.” Ụjọ wee jide ya, ya amalitezie imikpu. (Matiu 14:30) Ihe a mere Pita na Ịlaịja na-akụziri anyị otu ihe dị mkpa. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka egwu ghara ịtụ anyị, anyị ekwesịghị ichewe ihe ndị ga-eme ka ụjọ tụọ anyị. Ọ dị mkpa ka anyị lekwasị anya n’Onye ahụ nke na-enye anyị ike ma na-agba anyị ume.
“O Zuwo!”
Ụjọ ahụ ji Ịlaịja mere ka ọ gbaga Bia-shiba, bụ́ obodo dị nso n’ebe ọdịda anyanwụ Juda. Isi Jezril ruo ebe ahụ dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise. Mgbe o ruru Bia-shiba, ọ hapụrụ onye na-ejere ya ozi ma gawa n’ala ịkpa naanị ya. Baịbụl kwuru na ọ gara “njem otu ụbọchị.” Weregodị ya na ị na-ahụ ka ọ malitere njem ahụ n’ụtụtụ. O nwere ike o jighị ihe ọ bụla ọ ga-eri gawa. Ụjọ ekweghị ya kwụsị, o jisiri ike na-abanye n’ime ime ala ịkpa ahụ n’agbanyeghị anwụ na-achanụ. Mgbe chi jiwere, ike ịga ije adịkwaghị Ịlaịja, ya anọdụzie ala n’okpuru otu osisi brum, bụ́ ebe dịtụ mma o nwere ike ịnọ n’ala ịkpa ahụ.—1 Ndị Eze 19:4.
Ịlaịja kpere ekpere onye ike ụwa gwụrụla. Ọ rịọrọ Chineke ka ya nwụọ. O kwuru, sị: “Akaghị m nna nna m hà mma.” Ọ maara na nna nna ya hà erekasịala ma ghọọ ájá n’ebe Ekliziastis 9:10) Ịlaịja weere na ya na ha bụzi otu. Ka a sịkwa ihe mere o ji sị: “O zuwo!” Nke a pụtara na o nweghịzi uru ndụ ọ dị baara ya.
e liri ha. Ọ makwa na ha enweghị ike inyere onye ọ bụla aka. (Ò kwesịrị iju anyị anya na ike ụwa gwụrụ onye nke Chineke otú ahụ? O kwesịghị. O nwere ọtụtụ ndị ezi omume, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, bụ́ ndị Baịbụl kwuru na o nwere mgbe obi jọrọ ha njọ nke na ọ dị ha ka hà nwụọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ribeka, Jekọb, Mozis, na Job.—Jenesis 25:22; 37:35; Ọnụ Ọgụgụ 11:13-15; Job 14:13.
Taa, anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ.’ N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na mgbe ụfọdụ ike ụwa na-agwụ ọtụtụ ndị, ma ndị na-efe Chineke. (2 Timoti 3:1) Ọ bụrụ na e nwee mgbe ọ dị gị otú ahụ, mee ihe ahụ Ịlaịja mere, ya bụ: Kọọrọ Chineke otú obi dị gị. A sị ka e kwuwe, Jehova bụ “Chineke nke nkasi obi niile.” (2 Ndị Kọrịnt 1:3) Chineke ọ̀ kasiri Ịlaịja obi?
Jehova Nyeere Onye Amụma Ya Aka
Olee otú i chere obi dị Jehova mgbe o si n’eluigwe lee anya hụ ka onye amụma ya ọ hụrụ n’anya tọgbọ n’okpuru osisi n’ala ịkpa na-arịọ ka ọnwụ bịa gburu ya? Anyị ekwesịghị ichewe ya echewe. Mgbe ezigbo ụra buuru Ịlaịja, Jehova zigaara ya otu mmụọ ozi. Mmụọ ozi ahụ ji nwayọọ metụ Ịlaịja aka, kpọtee ya ma sị ya: “Bilie rie ihe.” Ịlaịja biliri n’ihi na mmụọ ozi ahụ edeberela ya achịcha ka dị ọkụ na mmiri ọ ga-aṅụ. Ò keledịrị mmụọ ozi ahụ? Naanị ihe Baịbụl gwara anyị bụ na onye amụma ahụ riri nri, ṅụọ miri ahụ ma dinarakwa rahụwa ụra. Ọ̀ bụ ike ọgwụgwụ mere na o kwughị okwu? Nke ọ bụla ọ bụ, mmụọ ozi ahụ kpọtere ya nke ugboro abụọ, o nwekwara ike ịbụ na chi efoola mgbe ahụ. Ọ gwara Ịlaịja ọzọ, sị, “Bilie rie ihe,” ọ gwakwara ya ihe a dị mkpa: “N’ihi na njem ị ga-eme dị ukwuu.”—1 Ndị Eze 19:5-7.
Ọ bụ Chineke mere ka mmụọ ozi ahụ mara ebe Ịlaịja na-aga. Ọ maara na Ịlaịja agaghị agali ogologo ije ahụ n’ike onwe ya. Obi dị anyị ụtọ na Chineke anyị na-efe maara ihe anyị chọrọ ime ná ndụ, marakwa otú ike anyị hà karịa otú anyị ma! (Abụ Ọma 103:13, 14) Olee uru nri ahụ Ịlaịja riri baara ya?
Baịbụl kwuru, sị: “O wee bilie rie ihe, ṅụọkwa mmiri, o wee jiri ike ihe ahụ o riri na-aga ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị, ruo n’ugwu nke ezi Chineke, bụ́ Horeb.” (1 Ndị Eze 19:8) Ịlaịja buru ọnụ ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị, dị nnọọ ka Mozis mere ihe dị ka narị afọ isii tupu mgbe ahụ, dịkwa ka Jizọs mechara mee ihe dị ka otu puku afọ mgbe Ịlaịja nwụchara. (Ọpụpụ 34:28; Luk 4:1, 2) Nri ahụ Ịlaịja riri emeghị ka nsogbu ya niile gwụ, ma Chineke ji ya nye ya ike ịga ogologo ije ahụ ọ gara. Weregodị ya na ị na-ahụ ka agadi nwoke ahụ nọ na-aga kwa ụbọchị n’ala ịkpa ahụ ruo ụbọchị iri anọ!
Jehova na-enyekwara ndị na-efe ya taa aka. Otú o si eme nke a abụghị ibunye ha nri nkịtị. Kama ọ na-eme ya n’ụzọ ka nnọọ mkpa. Ọ na-enye ha nri ime mmụọ. (Matiu 4:4) Ịmụta banyere Chineke n’Akwụkwọ Nsọ nakwa n’akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl na-eme ka anyị nọgide na-efe Chineke. Iri nri ime mmụọ agaghị eme ka nsogbu niile anyị nwere gwụ, ma o nwere ike inyere anyị aka idi nsogbu anyị na-agaraghị edi. Ọ ga-emekwa ka anyị nweta “ndụ ebighị ebi.”—Jọn 17:3.
Ịlaịja gara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị kilomita atọ na iri abụọ. N’ikpeazụ, o ruru n’Ugwu Horeb, bụ́ ebe Jehova Chineke si n’aka otu mmụọ ozi pụta n’ihu Mozis ogologo oge gara aga n’otu osisi ogwu na-ere ọkụ. Ọ bụkwa n’ugwu a ka Jehova nọ nye Izrel Iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Ịlaịja banyere n’otu ọgba dị n’ebe ahụ nọrọ.
Otú Jehova Si Kasie Onye Amụma Ya Obi ma Gbaa Ya Ume
N’Ugwu Horeb, o yiri ka Jehova ò si n’ọnụ otu mmụọ ozi jụọ Ịlaịja ajụjụ a: “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme n’ebe a?” Ọ ga-abụ na mmụọ ozi ahụ ji olu ọma jụọ ya ajụjụ ahụ, nke mere ka Ịlaịja kọọrọ ya otú obi dị ya. Ịlaịja sịrị: “Anọwo m na-ekworo Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha ekworo nke ukwuu; n’ihi na ụmụ Izrel ahapụwo ọgbụgba ndụ gị, ha etidawo ebe ịchụàjà gị, ha ejiriwokwa mma agha gbuo ndị amụma gị, nke mere na ọ fọdụrụ naanị m; ha wee malite ịchọ mkpụrụ obi m ka ha wepụ ya.” (1 Ndị Eze 19:9, 10) Ihe a Ịlaịja kwuru gosiri na ọ dịkarịa ala, e nwere ụzọ ihe atọ mere ike ụwa ji gwụ ya.
Nke mbụ bụ na Ịlaịja chere na ọrụ ya niile bụ n’efu. N’agbanyeghị na Ịlaịja anọọla ọtụtụ afọ ‘na-ekworo ofufe Jehova ekworo nke ukwuu,’ ya bụ, na-ebute aha nsọ Chineke na ofufe ya ụzọ ná ndụ ya, ọ dị ya ka ihe ọ̀ na-aka njọ. Ụmụ Izrel enwebeghị okwukwe na Chineke, kama nke ahụ, ọtụtụ n’ime ha na-efezi arụsị. Nke abụọ bụ na Ịlaịja chere na ọ bụ naanị ya fọrọ. O kwuru, sị, “Ọ fọdụrụ naanị m.” Ọ dị ya ka ọ̀ bụ naanị ya bụ onye na-efe Jehova ná mba Izrel. Nke atọ bụ na ụjọ ji Ịlaịja. E gbuola ọtụtụ ndị amụma ibe ya, o dokwara ya anya na ọ bụ ya bụ onye ọzọ a ga-egbu. O nwere ike isiri Ịlaịja ike ịkọrọ mmadụ ihe ndị a, ma o kweghị ka nganga ma ọ bụ ihere mee ka ọ ghara ikwu ha. Ndị niile ji obi ha na-efe Chineke nwere ike ịmụta ihe n’ihe a Ịlaịja mere. Ha kwesịrị ịna-agwa Chineke otú obi dị ha.—Abụ Ọma 62:8.
Olee ihe Jehova mere maka ihe ndị ahụ na-echegbu Ịlaịja na ụjọ ahụ ji ya? Mmụọ ozi ahụ gwara Ịlaịja ka o guzoro n’ọnụ ọgba ahụ. O mere ihe a gwara ya n’agbanyeghị na ọ maghị ihe na-aga ime. Oké ifufe malitere ife! Ọ ga-abụrịrị na ifufe ahụ mere mkpọtụ dị egwu n’ihi na ọ gbawasịrị ugwu na nkume ndị dị ebe ahụ. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Ịlaịja ji otu aka kpuchie anya ya ma were aka nke ọzọ jide uwe ajị ajị o yi ka ifufe ahụ ghara iburu ya. Mgbe ifufe ahụ fechara, ala ọma jijiji malitere nke mere ka Ịlaịja chọwa ihe ọ ga-eme ka ọ ghara ịda. Mgbe ala ọma jijiji ahụ mechara, nnukwu ọkụ malitere ịgba nke mere ka Ịlaịja banye n’ime ọgba ahụ ka ọkụ ahụ ghara imerụ ya ahụ́.—1 Ndị Eze 19:11, 12.
1 Ndị Eze 8:27) Ma, oleezi otú ihe niile a merenụ si nyere Ịlaịja aka? Cheta na ụjọ ji ya. Ebe ọ bụ na Jehova, bụ́ onye nwere ike dị egwu, kwụ ya n’azụ, o kwesịghị ịtụwa Ehab na Jezibel ụjọ!—Abụ Ọma 118:6.
Baịbụl kwuru na Jehova anọghị ma n’oké ifufe ahụ ma n’ala ọma jijiji ahụ ma n’ọkụ ahụ. Ịlaịja maara na Jehova abụghị chi nkịtị, dị ka Bel, bụ́ chi ndị na-efe ya na-akpọ “Chi Na-achị Ígwé Ojii,” ma ọ bụ chi na-eweta mmiri ozuzo. Ọ bụ Jehova mere ka ihe ndị dị ka ifufe na mmiri na-akpa ike dị egwu, ma yanwa dị ike karịa ihe ọ bụla o kere eke. Eluigwe enweghịdị ike ịba ya! (Mgbe ọkụ ahụ nyụrụ, ebe niile dara jụụ, Ịlaịja wee nụ “olu dị ala, nke dịkwa nwayọọ.” Olu ahụ jụkwara Ịlaịja ajụjụ ahụ a jụrụ ya na mbụ. Nke a mere ka Ịlaịja kwuokwa otú obi dị ya ọzọ. * O nwere ike ịbụ na ohere nke ugboro abụọ a o nwetara ikwu otú obi dị ya mere ka ahụ́ rukwuo ya ala. Ma, o doro anya na ihe ka gbaa Ịlaịja ume bụ ihe ‘olu ahụ dị ala, nke dịkwa nwayọọ’ gwaziri ya. Jehova mere ka o doo Ịlaịja anya na o kwesịghị ichewe na ọrụ ya bụ n’efu. Olee otú o si mee nke a? Chineke gwara Ịlaịja ọtụtụ ihe ya ka ga-eme iji wepụ ofufe Bel n’Izrel. O doro anya na ọrụ Ịlaịja rụrụ abụghị n’efu n’ihi na ihe Jehova bu n’obi ime ga-emezurịrị. Ihe ọzọkwa bụ na Jehova ka chọrọ ka Ịlaịja soro mezuo ihe ahụ Jehova bu n’obi ime, ọ bụ ya mere o ji nye ya ọrụ ọ ga-arụkwu, gwakwa ya otú ọ ga-esi rụọ ya.—1 Ndị Eze 19:12-17.
Ịlaịja chere na ọ bụ naanị ya fọdụrụ ná ndị na-efe Chineke. Gịnị ka Jehova mere iji nyere ya aka? Jehova mere ụzọ ihe abụọ. Nke mbụ bụ na ọ gwara Ịlaịja ka ọ gaa tee Ịlaịsha mmanụ ka ọ ghọọ onye amụma nke ga-anọchi ya ma ọ nwụọ. Ịlaịsha, bụ́ onye ka bụ nwa okorobịa, na Ịlaịja ga-arụkọ ọrụ, ọ ga-enyekwara Ịlaịja aka ruo ọtụtụ afọ. O nweghị agbamume karịrị nke a! Nke abụọ bụ na Jehova ziri ya ozi a dị ụtọ: “Emewokwa m ka puku mmadụ asaa fọdụ n’Izrel, bụ́ ikpere niile na-egbubereghị Bel n’ala, na ọnụ ọ bụla nke na-esusubeghị ya.” (1 Ndị Eze 19:18) N’eziokwu, ọ bụghị naanị Ịlaịja fọrọ. Ọ ga-atọgbu ya atọgbu ịnụ na e nwere puku mmadụ asaa jụrụ ife Bel ma jiri obi ha niile na-efe Jehova. Ịlaịja ga-abara ha ezigbo uru. Ọ ga-enyere ha aka ịnọsi ike na-efe Jehova n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị na-enupụrụ Jehova isi n’oge ahụ. Ọ ga-abụrịrị na okwu ahụ Jehova si n’ọnụ mmụọ ozi ya, bụ́ “olu dị ala, nke dịkwa nwayọọ” gwa Ịlaịja ruru Ịlaịja n’obi.
Ike dị egwu ihe e kere eke na-akpa nwere ike ime ka akpata oyi wụọ anyị n’ahụ́, dị ka o mere Ịlaịja. Ma, o kwesịrị ịdị otú ahụ n’ihi na ihe e kere eke na-egosi na Onye kere ihe niile nwere ike dị ukwuu. (Ndị Rom 1:20) Ọ ka na-amasị Jehova iji ike ya na-enweghị atụ na-enyere ndị ji obi ha niile na-efe ya aka. (2 Ihe E Mere 16:9) Ma, ihe Chineke kacha eji agwa anyị okwu bụ Okwu ya, bụ́ Baịbụl. (Aịzaya 30:21) E nwere ike ikwu na Baịbụl bụ “olu dị ala, nke dịkwa nwayọọ,” nke Jehova ji na-eduzi anyị, na-agbazi anyị, na-agba anyị ume, ma na-egosi anyị taa na ọ hụrụ anyị n’anya.
Ịlaịja ọ̀ nabatara ume ahụ Jehova gbara ya n’Ugwu Horeb? A na-ajụkwa ajụ! N’oge na-adịghị anya, ọ maliteghachiri ọrụ ya. Ọ bịara nwee obi ike otú ọ na-enwebu, o kweghịkwa ka ndị na-efe arụsị ṅụọ mmiri tọgbọ iko. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile nabata okwu Chineke, nke bụ́ “nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ,” anyị ga-eṅomi okwukwe Ịlaịja.—Ndị Rom 15:4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Gụọ isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha—Ọ Kwadoro Ofufe Dị Ọcha” nke gbara n’Ụlọ Nche January 1, 2008, nakwa isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha—Ọ Nọrọ na Nche ma Chere” nke gbara n’Ụlọ Nche April 1, 2008.
^ par. 29 O nwere ike ịbụ na ‘olu ahụ dị ala, nke dịkwa nwayọọ’ bụ mmụọ ozi ahụ nke “okwu Jehova” si n’ọnụ ya ruo Ịlaịja ntị, dị ka e kwuru ná 1 Ndị Eze 19:9. N’amaokwu nke 15, a kpọrọ mmụọ ahụ “Jehova.” Nke a nwere ike ime ka anyị cheta mmụọ ozi Jehova ji duo ndị Izrel mgbe ha nọ n’ala ịkpa. Chineke kwuru banyere mmụọ ozi ahụ, sị: “Aha m dị n’ime ya.” (Ọpụpụ 23:21) Anyị agaghị asị na ọ ga-abụrịrị Jizọs nwe olu ahụ, ma ọ dị mma icheta na tupu Jizọs abịa n’ụwa, o jere ozi dị ka “Okwu ahụ,” ya bụ, Ọnụ Na-ekwuchitere Chineke, bụ́ onye Jehova si n’aka ya zie ndị na-efe ya ozi.—Jọn 1:1.
[Foto dị na peeji nke 19]
Jehova gọziri Ịlaịja nke ukwuu, ma n’oge ihe dị mma ma n’oge ọ dị njọ
[Foto dị na peeji nke 20]
Mgbe Ịlaịja nọ n’oké nsogbu, ọ kọọrọ Jehova otú obi dị ya
[Foto dị na peeji nke 21]
Jehova ji ike ya na-enweghị atụ kasie Ịlaịja obi ma gbaa ya ume