Zere Mkpakọrịta Ọjọọ!
Maka Ndị Na-eto eto
Zere Mkpakọrịta Ọjọọ!
Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere, werekwa ya na ị na-ahụ ka ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.
Ndị a kọrọ akụkọ ha: Daịna, Shikem, Jekọb, Simiọn, na Livaị
Ihe a kọrọ: Shikem dinara Daịna, ụmụnne ya ndị nwoke ejiri iwe gaa megwara.
1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JENESIS 34:1-31.
Olee ihe ndị i chere Daịna na ndị enyi ya ọ na-aga ahụ na Kenan na-eme?
․․․․․
Olee ụdị okwu ‘na-eru n’obi’ i chere Shekem nọ “na-agwa” Daịna?
․․․․․
Olee otú i chere obi dị Jekọb mgbe ọ na-abara Simiọn na Livaị mba n’amaokwu nke 30?
․․․․․
2 LEBAKWUO YA ANYA.
Gịnị ka i chere mere Daịna ji agakarị na nke ụmụ agbọghọ Kenan ahụ? (Dị ka ihe atụ, olee ihe i chere jikọrọ ya na ha? Gịnị ka i chere ọ hụrụ na nke ndị Kenan ọ na-ahụghị n’ụlọ ha?)
․․․․․
Olee àgwà ọma ndị ọ ga-abụ na Daịna hụrụ n’ahụ́ Shikem? (Gụgharịa amaokwu nke 3, nke 12, na nke 19.)
․․․․․
Olee otú Baịbụl si gosi na Daịna achọghị ka ya na Shikem dinaa? (Gụgharịa․․․․․
Ì chere na ọ dị mma na Simiọn na Livaị gara gbuo ndị bi na Shikem n’ihi ihe e mere nwanne ha nwaanyị? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?
․․․․․
3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .
Ihe mere ị ga-eji kpachara anya mgbe ị na-ahọrọ ndị gị na ha na-akpa.
․․․․․
Ihe mere ị ga-eji jide onwe gị, ya bụrụgodị na o nwere ezigbo ihe mere ị ga-eji wee iwe
․․․․․
ỤZỌ NDỊ ỌZỌ Ị GA-ESI MEE IHE Ị MỤTARA.
Gịnị ka i nwere ike ime ka ndị na-ejighị iwu Chineke kpọrọ ihe ghara ịrata gị ka gị na ha nwee mmekọahụ?
․․․․․
4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤKWA MAKA GỊNỊ?
․․․․․
Ọ bụrụ na i nweghị Baịbụl, gwa Ndịàmà Jehova ka ha nye gị otu, ma ọ bụ gị agụọ ya n’asụsụ bekee na www.watchtower.org na www.jw.org