Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ọtụtụ Di na Nwunye Ji Etisa?

Gịnị Mere Ọtụtụ Di na Nwunye Ji Etisa?

Gịnị Mere Ọtụtụ Di na Nwunye Ji Etisa?

“Ndị Farisii wee bịakwute [Jizọs], buru n’uche ka ha nwaa ya ọnwụnwa, sị: ‘Iwu ọ̀ kwadoro ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ụdị ihe ọ bụla?’”—Matiu 19:3.

ỤFỌDỤ ndị dịrị ndụ n’oge Jizọs jụrụ ajụjụ ma di na nwunye hà nwere ike ibigide n’agbaghị alụkwaghịm ma ọ bụkwanụ ma hà kwesịrị ime otú ahụ. Jizọs zara ha, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị wee sị, ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’? Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” * (Matiu 19:4-6) O doro anya na Chineke bu n’obi ka alụmdi na nwunye ghara itisa.

N’ọtụtụ mba taa, ịgba alụkwaghịm ‘na-atọsa’ ihe dị ka alụmdi na nwunye anọ n’ime iri ọ bụla. Ndụmọdụ ndị Baịbụl nyere banyere alụmdi na nwunye hà emeela nnọọ ochie nke na ha abakwaghị uru? Ọ̀ ga-abụ na alụmdi na nwunye na-etisa n’ihi na e nwere ihe dị njọ na ya?

Tụlee ihe atụ a: Ezinụlọ abụọ zụrụ otu ụdị ụgbọala. Otu na-elekọta ụgbọala nke ha nke ọma ma na-eji nwayọọ akwọ ya. Ụgbọala ha emebighị. Ezinụlọ nke ọzọ anaghị etinye ego ọ bụla ma ọ bụ oge ha n’ilekọta ụgbọala ha, na-akwọkwa ya ọnwụ ọnwụ. Ụgbọala ha mebiri, ha ahapụkwa ya. Olee ihe mere ụgbọala nke abụọ ahụ ji mebie—ọ̀ bụ ụgbọala ahụ kpatara ya ka ọ̀ bụ ndị nwe ya? O doro anya na ọ bụ ndị nwe ya kpatara ya.

N’otu aka ahụ, na ọtụtụ alụmdi na nwunye na-etisa apụtaghị na alụmdi na nwunye adịghị mma. Ọtụtụ nde alụmdi na nwunye bụ́ ndị na-aga nke ọma gosiri na nke a bụ eziokwu. Alụmdi na nwunye ndị ahụ na-ewetara ndị mmadụ, ezinụlọ dị iche iche, na obodo dị iche iche obi ụtọ na ahụ́ iru ala. Ma, dị ka ụgbọala, ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ka alụmdi na nwunye ya ghara itisa, o kwesịrị ka ọ na-elekọta ya anya mgbe niile.

Ma alụmdi na nwunye unu ọ̀ ka malitere ọhụrụ ma ọ̀ nọọla ọdụ, ndụmọdụ Baịbụl nyere banyere otú e si elekọta ya ma na-eme ka o sikwuo ike ga-enyere nnọọ unu aka. Lee ihe atụ ụfọdụ na peeji ndị na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Baịbụl kwuru na di na nwunye nwere ike ịgba alụkwaghịm ma ọ bụrụ na otu n’ime ha akwaa iko.—Matiu 19:9.